< Levitikọs 5 >

1 “‘Ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie nʼihi na ọ jụrụ ikwupụta mgbe ọ nụrụ ọkwa amaara nʼọha maka ịgba ama banyere ihe ọ hụrụ maọbụ ihe ọ maara, ọ bụ onye ikpe mara.
And if a soul sin, and hear the voice of swearing, and is a witness, whether he has seen or known of it; if he do not utter it, then he shall bear his iniquity.
2 “‘Onye na-amaghị ama metụ ihe rụrụ arụ aka, dịka ozu anụ ọbụla iwu megidere, maọbụ anụ ụlọ, maọbụ anụ ọhịa, maọbụ anụ ọbụla na-akpụ akpụ nʼala. Ọ ghọọla onye rụrụ arụ, na onye ikpe mara.
Or if a soul touch any unclean thing, whether it be a carcass of an unclean beast, or a carcass of unclean cattle, or the carcass of unclean creeping things, and if it be hidden from him; he also shall be unclean, and guilty.
3 Ma ọ bụrụ na ha emetụ ihe ọbụla rụrụ arụ si nʼahụ mmadụ pụta aka, ihe ọbụla ga-eme ya ka ọ hapụ ịdị ọcha, ọ bụ ezie na ha amaghị na ọ bụ ihe rụrụ arụ, mgbe ọ matara ya, ọ ga-abụ onye ikpe mara.
Or if he touch the uncleanness of man, whatever uncleanness it be that a man shall be defiled with, and it be hid from him; when he knows of it, then he shall be guilty.
4 Ọ bụrụ na mmadụ a ṅụọ iyi nzuzu, nke ga-akwagide ya ime ihe ọbụla maọbụ ihe dị mma, maọbụ ihe dị njọ, mgbe onye ahụ ghọtara na ọ bụ iyi nzuzu ka ọ ṅụrụ, ọ bụrụla onye ikpe mara.
Or if a soul swear, pronouncing with his lips to do evil, or to do good, whatever it be that a man shall pronounce with an oath, and it be hid from him; when he knows of it, then he shall be guilty in one of these.
5 Onye ọbụla sitere nʼụzọ dị otu a bụrụ onye ikpe mara, ga-ekwupụta mmehie ya, dịka o si dị.
And it shall be, when he shall be guilty in one of these things, that he shall confess that he has sinned in that thing:
6 Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nne atụrụ, maọbụ nne ewu site nʼigwe ewu na atụrụ, dịka aja ikpe ọmụma maka mmehie ha mere. Onye nchụaja ga-achụrụ ha aja mkpuchi mmehie maka mmehie ha.
And he shall bring his trespass offering to the LORD for his sin which he has sinned, a female from the flock, a lamb or a kid of the goats, for a sin offering; and the priest shall make an atonement for him concerning his sin.
7 “‘Ọ bụrụ na o nweghị ike iweta atụrụ, ọ ga-ewetara Onyenwe anyị nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, dịka ihe ikpe ọmụma mmehie ha. Otu nʼime nnụnụ ndị a ga-abụ maka aja mmehie, nke ọzọ ga-abụ maka aja nsure ọkụ.
And if he be not able to bring a lamb, then he shall bring for his trespass, which he has committed, two turtledoves, or two young pigeons, to the LORD; one for a sin offering, and the other for a burnt offering.
8 Ọ ga-eweta ha nye onye nchụaja. Onye ga-ewere nnụnụ nke mbụ chụọ aja mmehie. Ọ ga-atụbipụ olu ya, kama ọ gaghị ekewapụcha isi nnụnụ ahụ site nʼahụ ya.
And he shall bring them to the priest, who shall offer that which is for the sin offering first, and wring off his head from his neck, but shall not divide it asunder:
9 Ọ ga-efesa ụfọdụ ọbara aja mmehie ahụ nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ma ọbara fọdụrụ ka ọ ga-awụsa nʼụkwụ ala ala ebe ịchụ aja. Nke a ga-abụ aja mmehie.
And he shall sprinkle of the blood of the sin offering on the side of the altar; and the rest of the blood shall be wrung out at the bottom of the altar: it is a sin offering.
10 Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.
And he shall offer the second for a burnt offering, according to the manner: and the priest shall make an atonement for him for his sin which he has sinned, and it shall be forgiven him.
11 “‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie.
But if he be not able to bring two turtledoves, or two young pigeons, then he that sinned shall bring for his offering the tenth part of an ephah of fine flour for a sin offering; he shall put no oil on it, neither shall he put any frankincense thereon: for it is a sin offering.
12 Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya.
Then shall he bring it to the priest, and the priest shall take his handful of it, even a memorial thereof, and burn it on the altar, according to the offerings made by fire to the LORD: it is a sin offering.
13 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’”
And the priest shall make an atonement for him as touching his sin that he has sinned in one of these, and it shall be forgiven him: and the remnant shall be the priest’s, as a meat offering.
14 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
And the LORD spoke to Moses, saying,
15 “Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.
If a soul commit a trespass, and sin through ignorance, in the holy things of the LORD; then he shall bring for his trespass to the LORD a ram without blemish out of the flocks, with your estimation by shekels of silver, after the shekel of the sanctuary, for a trespass offering.
16 Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.
And he shall make amends for the harm that he has done in the holy thing, and shall add the fifth part thereto, and give it to the priest: and the priest shall make an atonement for him with the ram of the trespass offering, and it shall be forgiven him.
17 “Ma ọ bụrụ na mmadụ ọbụla emehie, mee ihe ọbụla megidere iwu ọbụla Onyenwe anyị nyere, ọ bụ ezie na e mere mmehie a na-amaghị ama, ma ikpe mara ha, ọ ga-atakwa ahụhụ soo ya.
And if a soul sin, and commit any of these things which are forbidden to be done by the commandments of the LORD; though he knew it not, yet is he guilty, and shall bear his iniquity.
18 Ọ ga-ewetara onye nchụaja ihe aja ikpe ọmụma nke bụ otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, nke ọnụahịa ga-abụ ihe o ruru. Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja mkpuchi mmehie nʼihi ihe ọjọọ o mere na-amaghị ama. A ga-agbaghara ya mmehie ya.
And he shall bring a ram without blemish out of the flock, with your estimation, for a trespass offering, to the priest: and the priest shall make an atonement for him concerning his ignorance wherein he erred and knew it not, and it shall be forgiven him.
19 Ọ bụ aja ikpe ọmụma, nʼihi na onye mehiere megide Onyenwe anyị ka ọ bụ.”
It is a trespass offering: he has certainly trespassed against the LORD.

< Levitikọs 5 >