< Levitikọs 3 >

1 “‘Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ inye onyinye aja udo, o nwere ike jiri anụ ụlọ si nʼigwe ehi, oke ehi maọbụ nwunye ehi. Ma anụ ahụ ọ ga-ewebata nʼihu Onyenwe anyị aghaghị ịbụ ehi na-enweghị nkwarụ.
ואם זבח שלמים קרבנו--אם מן הבקר הוא מקריב אם זכר אם נקבה תמים יקריבנו לפני יהוה
2 Onye ahụ wetara ya, ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Mgbe ahụ ụmụ Erọn ndị ikom, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
וסמך ידו על ראש קרבנו ושחטו פתח אהל מועד וזרקו בני אהרן הכהנים את הדם על המזבח--סביב
3 Site nʼonyinye aja udo, ị ga-eweta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na abụba niile nke metụtara ha,
והקריב מזבח השלמים אשה ליהוה--את החלב המכסה את הקרב ואת כל החלב אשר על הקרב
4 akụrụ ya abụọ na abụba nke dị nʼelu ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya na abụba kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
ואת שתי הכלית ואת החלב אשר עלהן אשר על הכסלים ואת היתרת על הכבד על הכליות יסירנה
5 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ga-esunye ha ọkụ nʼelu aja nsure ọkụ a tụkwasịrị nʼosisi e sunyere ọkụ, ọ bụ onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye Onyenwe anyị.
והקטירו אתו בני אהרן המזבחה על העלה אשר על העצים אשר על האש--אשה ריח ניחח ליהוה
6 “‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ Onyenwe anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ.
ואם מן הצאן קרבנו לזבח שלמים ליהוה--זכר או נקבה תמים יקריבנו
7 Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu Onyenwe anyị.
אם כשב הוא מקריב את קרבנו--והקריב אתו לפני יהוה
8 Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi atụrụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ndị nchụaja, ụmụ Erọn, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
וסמך את ידו על ראש קרבנו ושחט אתו לפני אהל מועד וזרקו בני אהרן את דמו על המזבח--סביב
9 Ị ga-esite nʼonyinye aja udo a, weta onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba ya, na abụba niile dị nʼọdụdụ ya nke a ga-esite nʼakụkụ ọkpụkpụ azụ ya bepụta, na abụba kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya; na abụba niile nke metụtara ha,
והקריב מזבח השלמים אשה ליהוה--חלבו האליה תמימה לעמת העצה יסירנה ואת החלב המכסה את הקרב ואת כל החלב אשר על הקרב
10 na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
ואת שתי הכלית ואת החלב אשר עלהן אשר על הכסלים ואת היתרת על הכבד על הכלית יסירנה
11 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
והקטירו הכהן המזבחה--לחם אשה ליהוה
12 “‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
ואם עז קרבנו--והקריבו לפני יהוה
13 ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja.
וסמך את ידו על ראשו ושחט אתו לפני אהל מועד וזרקו בני אהרן את דמו על המזבח--סביב
14 Ọ bụ site nʼonyinye nke i wetara ka ị ga-esi chee onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na abụba niile metụtara ha,
והקריב ממנו קרבנו אשה ליהוה--את החלב המכסה את הקרב ואת כל החלב אשר על הקרב
15 na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya.
ואת שתי הכלית ואת החלב אשר עלהן אשר על הכסלים ואת היתרת על הכבד על הכלית יסירנה
16 Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. Abụba niile bụ nke Onyenwe anyị.
והקטירם הכהן המזבחה--לחם אשה לריח ניחח כל חלב ליהוה
17 “‘Iwu ndị a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Unu ga-edebezu ya nʼebe ọbụla unu bi. Unu agaghị eri abụba maọbụ ọbara ọbụla.’”
חקת עולם לדרתיכם בכל מושבתיכם--כל חלב וכל דם לא תאכלו

< Levitikọs 3 >