< Levitikọs 27 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Yehova anawuza Mose kuti,
2 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Ọ bụrụ na mmadụ e kwee nkwa pụrụ iche iji mmadụ nye Onyenwe anyị onyinye, ihe ndị a ka ọ ga-eji gbara onye ahụ:
“Yankhula ndi Aisraeli ndipo uwawuze kuti, ‘Ngati munthu anachita lumbiro lapadera loti adzapereka munthu mnzake kwa Yehova ndipo akufuna kuti amuwombole,
3 nʼisi nwoke ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii, ọ ga-akwụ iri ọlaọcha shekel ise, dịka ihe ọtụtụ ebe nsọ si dị.
mtengo wake ukhale masekeli a siliva makumi asanu, molingana ndi kawerengedwe ka ku Nyumba ya Mulungu, ngati munthuyo ndi wamwamuna wa zaka zapakati pa 20 ndi 60.
4 Nʼisi nwanyị ọbụla gbara iri afọ abụọ ruo iri afọ isii ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel atọ.
Ndipo ngati ndi wamkazi, mtengo wake ukhale masekeli makumi atatu.
5 Nʼisi nwoke gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye iri ọlaọcha shekel abụọ. Nʼisi nwanyị gbara afọ ise ruo iri afọ abụọ, ọ ga-enye ọlaọcha shekel iri.
Mtengo wa munthu wamwamuna wa zaka zapakati pa zisanu ndi makumi awiri ukhale masekeli makumi awiri ndipo munthu wamkazi ukhale masekeli khumi.
6 A ga-akwụrụ nwantakịrị nwoke gbara site otu ọnwa ruo afọ ise, ọlaọcha shekel ise, kwụọra nwantakịrị nwanyị gbara otu ọnwa ruo afọ ise ọlaọcha shekel atọ.
Ngati ndi munthu wamwamuna wa pakati pa mwezi umodzi ndi zaka zisanu, mtengo wa munthu wamwamuna ukhale masekeli asanu a siliva ndipo ngati ndi wamkazi, ukhale masekeli atatu a siliva.
7 Nʼisi nwoke gafere iri afọ isi, a ga-enye ọlaọcha shekel iri na ise. Nʼisi nwanyị gafere iri afọ isi a ga-enye ọlaọcha shekel iri.
Ngati ndi munthu wa zaka makumi asanu ndi limodzi kapena kuposerapo, mtengo wa wamwamuna ukhale masekeli khumi ndi asanu, ndipo wamkazi ukhale masekeli khumi.
8 Ọ bụrụ na e nwee onye ogbenye na-enweghị ego ọ ga-eji kwụọ ụgwọ ndị a, a ga-akpọtara ya onye nchụaja, onye ga-ekwubi ihe onye ahụ kwere nkwa ga-akwụ dịka ego o nwere ruru.
Ngati munthu amene anachita lumbiro ndi wosauka kwambiri kuti sangathe kulipira ndalama zimenezo, abwere ndi munthu woperekedwa uja kwa wansembe, ndipo wansembeyo ayike mtengo woti munthu wolumbirayo angathe kulipira.
9 “‘Ọ bụrụ anụ ụlọ dị mma inye Onyenwe anyị dịka onyinye ka e kwere nkwa inye, anụ ụlọ e nyere Onyenwe anyị ga-aghọ ihe dị nsọ.
“‘Ngati chimene anachitira lumbiro kuti apereke ndi nyama imene amapereka kukhala nsembe kwa Yehova, zonse zimene amapereka kwa Yehova nʼzopatulika.
10 Onye kwere nkwa inye ya enweghị ike iji anụ ụlọ nke ahụ ya na-ezughị oke gbanwere anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ. O nwekwaghị ike iji anụ ụlọ ahụ na-enweghị ntụpọ gbanwere nke anụ ahụ ya na-ezughị oke. Ọ bụrụ na o mee otu a, anụ ụlọ nke mbụ, na nke abụọ, ga-abụ ihe dị nsọ.
Munthu asasinthanitse ndi ina kapena kupereka ina yabwino mʼmalo mwa yoyipa, kapena yoyipa mʼmalo mwa yabwino. Ngati asinthitsa nyama ina mʼmalo mwa ina, nyamayo pamodzi ndi inzake wasinthitsayo zikhala zopatulika.
11 Ọ bụrụ na anụ ụlọ o ji kwee nkwa bụ anụ ụlọ rụrụ arụ, ụdị anụ ụlọ ahụ a jụrụ ịnabata dịka onyinye maka iji ya chụọ aja nye Onyenwe anyị, a ga-akpụtara onye nchụaja anụ ụlọ ahụ.
Ngati chimene anachitira lumbiro ndi nyama yodetsedwa, nyama imene siloledwa kuyipereka kukhala nsembe kwa Yehova, nyamayo abwere nayo kwa wansembe,
12 Ọ bụ ya ka ọ dịrị ikpebi ma anụ ụlọ ahụ ọ dị mma, ma ọ jọrọ njọ. Ọnụ ego ọbụla onye nchụaja kpebiri, ka onye wetara anụ ụlọ ahụ ga-akwụ.
ndipo wansembeyo atchule mtengo wake poona ngati ndi yabwino kapena ndi yoyipa. Mtengo umene wansembe atchule ndiwo udzakhale mtengo wake.
13 Ọ bụrụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ụgwọ anụ ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa anụ ụlọ ahụ.
Ngati mwini wakeyo akufuna kuwombola nyamayo, awonjezere pa mtengo wake wa nyamayo chimodzi mwa zigawo zisanu zamtengowo.
14 “‘Ọ bụrụ na mmadụ enye ụlọ ya, dịka ihe ga-adị nsọ nye Onyenwe anyị, onye nchụaja ga-ekpebi maọbụ ụlọ dị mma, ma ọ bụkwanụ ụlọ jọrọ njọ. Ọ ga-ekwukwa ihe bụ ọnụahịa ụlọ ahụ.
“‘Ngati munthu apereka nyumba yake kuti ikhale yopatulika kwa Yehova, wansembe atchule mtengo wake poona ngati ndi yabwino kapena ndi yoyipa. Mtengo umene wansembe atchule ndiwo udzakhale mtengo wake.
15 Ọ bụrụ na onye ahụ nke na-edo ụlọ ya nsọ achọọ ịgbara ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ụlọ ahụ, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ụlọ ahụ. Emesịa, ụlọ ahụ ga-abụkwa nke ya.
Ngati munthu amene wapereka nyumbayo afuna kuyiwombola nyumbayo, awonjezere pamtengo wake wa nyumbayo, limodzi mwa magawo asanu amtengowo. Ndipo nyumbayo idzakhalanso yake.
16 “‘Ọ bụrụ na mmadụ ewere mpaghara ala ubi ezinaụlọ ya nye Onyenwe anyị ka ihe ido nsọ, ihe a ga-eji mata ọnụahịa ala ahụ ga-abụ ụdị ihe ubi e nwere ike ịkụ nʼime ya. Ọnụahịa ala ubi e nwere ike ịkụnye ọka balị ruru otu ihe ọtụtụ homa, ga-abụ iri mkpụrụ ego ọlaọcha shekel ise.
“‘Ngati munthu apereka kwa Yehova mbali ina ya malo a makolo ake, mtengo umene awuyike ukhale wolingana ndi mtengo wa mbewu zimene zimadzabzalidwamo. Zikhale mbewu za barele za makilogalamu makumi awiri ndipo mtengo wake ukhale masekeli makumi asanu.
17 Ọ bụrụ nʼime afọ inwere onwe ka o doro ala ahụ nsọ, agaghị agbanwe ọnụahịa ya.
Ngati munthu apereka munda wake kuyambira chaka chokondwerera zaka makumi asanu, mtengo wake ukhale umene unakhazikitsidwa.
18 Ma ọ bụrụ na o doro ala ahụ nsọ mgbe afọ inwe onwe ahụ gafere, onye nchụaja ga-agụkọrọ ya ọnụahịa ya dịka afọ ole ọ fọdụrụ mgbe mmemme afọ inwere onwe ọzọ ga-adị. A ga-ewebilatakwa ihe ọnụahịa ya ruru.
Koma ngati apereka mundawo chaka chokondwerera zaka makumi asanu chitapita, wansembe adzatchula mtengo molingana ndi zaka zomwe zatsala kuti chifike chaka china chokondwerera zaka makumi asanu, ndipo mtengo wake udzakhala wotsikirapo.
19 Ọ bụrụ na onye doro ala ahụ nsọ achọọ ịgbara ala ya, ọ ga-akwụ ọnụahịa ahụ onye nchụaja kpebiri, tụkwasị ya ego ruru otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ala ahụ. Mgbe ahụ ala ahụ ga-abụkwa nke ya.
Ngati munthu amene wapereka munda afuna kuwuwombola, ayenera kuwonjezera pa mtengo wake wa mundawo, limodzi mwa magawo asanu a mtengowo. Ndipo mundawo udzakhalanso wake.
20 Ọ bụrụ na ọ gbapụtaghị ala ahụ, maọbụ na o resila ya onye ọzọ, a gaghị agbapụtakwa ala ahụ ọzọ.
Koma ngati sawuwombola mundawo, kapena ngati waugulitsa kwa munthu wina, mundawo sudzawomboledwanso.
21 Mgbe mmemme afọ inwere onwe ruru, ala ahụ ga-aghọ ala dị nsọ, ala e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ndị nchụaja ga-ewere ya ka ọ bụrụ nke ha.
Mwini mundawo akawusiya mʼchaka chokondwerera zaka makumi asanu ndiye kuti mundawo udzakhala wopatulika monga woperekedwa kwa Yehova: udzakhala munda wa ansembe.
22 “‘Ọ bụrụ na mmadụ e doro Onyenwe anyị ala ubi ọ zụrụ azụ nsọ, nke na-abụghị ala ezinaụlọ ha,
“‘Ngati munthu apereka kwa Yehova munda umene anagula, umene si malo a makolo ake,
23 onye nchụaja ga-agụ afọ ole ọ fọdụrụ ruo mmemme afọ inwere onwe. Ọ ga-agwa onye ahụ ego ole ọ ga-akwụ nʼihi ya. Ego ọbụla ọ kwụrụ nʼụbọchị ahụ ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
wansembe atchule mtengo wake kufikira pa chaka chokondwerera zaka makumi asanu, ndipo munthuyo apereke ndalama zokwanira mtengo wake pa tsikulo monga ndalama zopatulika kwa Yehova.
24 Mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru, onye nwe ala ahụ, ya bụ onye ahụ e si nʼaka ya zụọ ya, ga-ewerekwa ala ya.
Pa chaka chokondwerera zaka makumi asanu, mundawo udzabwezedwa kwa munthu amene anawugulitsayo, amene malowo anali ake.
25 Ọnụahịa ọbụla a ga-ekpebi ga-abụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. Iri gera abụọ ga-abụ otu shekel.
Potchula mtengo uliwonse wansembe awerengere molingana ndi mtengo wa sekeli wa ku Nyumba ya Mulungu: magera makumi awiri pa sekeli imodzi.
26 “‘A gaghị edo nwa mbụ anụmanụ mụtara nsọ maọbụ ehi maọbụ atụrụ nʼihi na ha bụ nke Onyenwe anyị.
“‘Koma pasapezeke munthu wopereka mwana woyamba kubadwa wa nyama, popeza mwana woyamba kubadwa ali kale wa Yehova, kaya ndi ngʼombe kapena nkhosa, zimenezi ndi za Yehova.
27 Ọ bụrụ otu nʼime anụ ndị ahụ rụrụ arụ, a ga-agbara ya nʼọnụ ego nke akara bụ ọṅụ ahịa ya, tụkwasịkwa nʼelu ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya. Ọ bụrụkwanụ na onye nwe anụ ụlọ ahụ achọghị ịgbarakwa ya, a ga-ere ya nʼọnụ ahịa dịka o ruru.
Ngati ili nyama yodetsedwa, ayiwombole pa mtengo umene wansembe wawuyika, ndi kuwonjezeranso pa mtengo wake wa nyamayo, limodzi mwa magawo asanu amtengowo. Ngati sayiwombola, igulitsidwe pa mtengo umene wansembe awuyike.
28 “‘A gaghị ere, maọbụ gbara ihe ọbụla mmadụ nwere, nke o doro nsọ nye Onyenwe anyị, maọbụ mmadụ, maọbụ ala ezinaụlọ, maọbụ anụ ụlọ, nʼihi na ihe ọbụla nke e wezugara iche bụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye Onyenwe anyị.
“‘Koma chinthu chilichonse choperekedwa kwa Yehova, kaya ndi munthu, nyama, kaya ndi malo a makolo, chimenechi chisagulitsidwe kapena kuwomboledwa. Choperekedwa kwa Yehova motere nʼchopatulika kwambiri.
29 “‘Mgbapụta ọbụla adịghị nye onye ọbụla e doro nsọ nye mbibi. A ghaghị ime ka ọ nwụọ.
“‘Munthu amene waperekedwa kotheratu sangawomboledwe. Munthuyo ayenera kuphedwa.
30 “‘Otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile si nʼala, maọbụ mkpụrụ ọghịgha nke ubi, maọbụ mkpụrụ nke osisi mịrị, bụ nke Onyenwe anyị. Ha bụ ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
“‘Chakhumi chilichonse chochokera mʼdziko, kaya ndi tirigu wochokera mʼnthaka kapena chipatso cha mʼmitengo ndi za Yehova. Chimenecho ndi chopatulika kwa Yehova.
31 Onye ọbụla chọrọ ịgbara otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe ubi ya aghaghị ịkwụ ọnụahịa ya, tụkwasị ya otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa e kwesiri ire ya.
Ngati munthu afuna kuwombola chakhumi chilichonse, awonjezere pamtengo wake chimodzi mwa zigawo zisanu za mtengowo.
32 Otu ụzọ nʼụzọ iri nke igwe ehi na atụrụ niile, anụ nke iri ọbụla nke na-agabiga nʼokpuru mkpanaka onye ọzụzụ atụrụ mgbe a na-agụ ha ọnụ, ga-abụ ihe dị nsọ nye Onyenwe anyị.
Chakhumi cha ngʼombe ndi nkhosa, kapena kuti nyama iliyonse ya khumi imene mʼbusa wayiwerenga idzakhala yopatulikira kwa Yehova.
33 A gaghị ahọ anụ ụlọ a na-enye Onyenwe anyị ahọ, ile ma ha dị mma, maọbụ na ha dị njọ. A gaghị agbanwekwa ha. Ọ bụrụ na a gbanwee ha, ndị e ji gbanwee ha na ndị a na-achọ ịgbanwe ga-aghọ ihe dị nsọ, a gaghị agbarakwa ha.’”
Palibe amene adzaloledwa kusankha nyama yomwe ili yabwino kapena kusinthitsa. Ngati asinthitsa, nyamayo pamodzi ndi inzakeyo zidzakhala zopatulika ndipo sangaziwombole.’”
34 Ndị a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis nʼugwu Saịnaị ka ọ nye ụmụ Izrel.
Amenewa ndi malamulo amene Yehova anamupatsa Mose pa Phiri la Sinai kuti awuze Aisraeli.

< Levitikọs 27 >