< Levitikọs 25 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu nʼugwu Saịnaị sị ya,
Olúwa sọ fún Mose ní orí òkè Sinai pé,
2 “Gwa ụmụ Izrel sị ha, ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ m ga-enye unu, unu ga-eme ka ala ahụ nwee afọ izuike nke ya nye Onyenwe anyị.
“Sọ fún àwọn ọmọ Israẹli, kí o sì wí fún wọn pé, ‘Nígbà tí ẹ bá dé ilẹ̀ náà tí èmi ó fi fún yín, ilẹ̀ náà gbọdọ̀ sinmi fún Olúwa.
3 Afọ isii ka unu ga-akụ ihe nʼubi, afọ isii ka unu ga-ewe ihe ubi, kwachaakwa alaka osisi vaịnị unu.
Ọdún mẹ́fà ni ìwọ ó fi gbin oko rẹ, ọdún mẹ́fà ni ìwọ ó fi tọ́jú ọgbà àjàrà rẹ, tí ìwọ ó sì fi kó èso wọn jọ.
4 Ma mgbe o ruru afọ nke asaa, unu ga-ahapụ ala ubi unu ka o zuo ike, afọ izuike nye Onyenwe anyị. Unu akụla ihe ọbụla nʼubi unu maọbụ kwachaa osisi vaịnị unu.
Ṣùgbọ́n ní ọdún keje kí ilẹ̀ náà ní ìsinmi: ìsinmi fún Olúwa. Bẹ́ẹ̀ ni ìwọ kò gbọdọ̀ tọ́jú ọgbà àjàrà rẹ.
5 Unu agaghị ewe ihe ubi ọbụla ga-epupụtara onwe ha nʼoge a, maọbụ tụtụọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị ga-ada ada. Nʼihi na afọ ahụ bụ afọ ozuzu ike dịrị ala ubi niile.
Ẹ má ṣe kórè ohun tí ó tìkára rẹ̀ hù, ẹ má ṣe kórè èso àjàrà ọgbà tí ẹ ò tọ́jú. Ilẹ̀ náà gbọdọ̀ ní ìsinmi fún ọdún kan.
6 Ihe ubi puputara nʼala ahụ niile nʼafọ izuike ahụ bụ nri dịrị unu onwe unu, na ndị odibo nwoke na nwanyị unu niile, na onye i goro ọrụ, na onye ọbịa bi nʼetiti unu.
Ohunkóhun tí ilẹ̀ náà bá mú jáde ní ọdún ìsinmi ni yóò jẹ́ oúnjẹ fún yín àní fún ẹ̀yin tìkára yín, àwọn ìránṣẹ́kùnrin àti ìránṣẹ́bìnrin yín, àwọn alágbàṣe àti àwọn tí ń gbé pẹ̀lú yín fún ìgbà díẹ̀.
7 Ihe ubi ahụ dịkwara anụ ụlọ gị, na anụ ọhịa bi nʼala gị. Ihe ọbụla puputara nʼala bụ ihe unu ga-eri.
Fún àwọn ohun ọ̀sìn yín, àti àwọn ẹranko búburú ní ilẹ̀ yín. Ohunkóhun tí ilẹ̀ náà bá mú jáde ní ẹ lè jẹ.
8 “‘Gụpụta afọ izuike asaa, afọ asaa, ụzọ asaa. Ngụkọ afọ izuike ndị a niile ga-enye iri afọ anọ na itoolu.
“‘Ọdún ìsinmi méje èyí tí í ṣe ọdún mọ́kàndínláàádọ́ta ni kí ẹ kà.
9 Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa, zipụ onye ga-egbu opi ike, ya bụ, nʼụbọchị mkpuchi mmehie, a ga-egbu opi ike nʼala Izrel niile.
Lẹ́yìn náà, kí ẹ fọn fèrè ní gbogbo ibikíbi ní ọjọ́ kẹwàá oṣù keje ní ọjọ́ ìwẹ̀nùmọ́. Ní ọjọ́ ètùtù yìí, ẹ fọn fèrè yíká gbogbo ilẹ̀ yín.
10 Doonụ afọ nke iri ise ahụ nsọ, kwusaakwa inwere onwe nye mmadụ niile nʼala ahụ niile. Afọ ahụ ga-abụ afọ inwere onwe nye unu. Onye ọbụla nʼime unu ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ezinaụlọ ya, onye ọbụla kwa ga-alaghachi nʼagbụrụ ya.
Ẹ ya àádọ́ta ọdún náà sọ́tọ̀ kí ẹ sì kéde òmìnira fún gbogbo ẹni tí ń gbé ilẹ̀ náà. Yóò jẹ́ ọdún ìdásílẹ̀ fún yín. Kí olúkúlùkù padà sí ilẹ̀ ìní rẹ̀ àti sí ọ̀dọ̀ àwọn ẹbí rẹ̀.
11 Afọ nke iri ise bụ afọ inwere onwe nye unu. A gaghị akụ ihe ọbụla nʼubi, a gakwaghị ewe ihe ubi ọbụla puputara nʼonwe ya, maọbụ mkpụrụ osisi vaịnị mịrị nʼonwe ya.
Àádọ́ta ọdún ni yóò jẹ́ ọdún ìdásílẹ̀ fún yín. Ẹ má ṣe gbin ohunkóhun, ẹ kò sì gbọdọ̀ kórè ohun tí ó hù fúnra rẹ̀ tàbí kí ẹ kórè ọgbà àjàrà tí ẹ kò dá.
12 Ọ bụ afọ inwere onwe, bụrụkwa afọ dị nsọ nye unu, nke onye ọbụla ga-eri naanị ihe e wetara nʼubi.
Torí pé ọdún ìdásílẹ̀ ni ó sì gbọdọ̀ jẹ́ mímọ́ fún yín. Ẹ jẹ ohun tí ẹ mú jáde nínú oko náà.
13 “‘Onye ọbụla ga-alaghachi nʼihe onwunwe nke ya, nʼafọ inwere onwe a.
“‘Ní ọdún ìdásílẹ̀ yìí, kí olúkúlùkù gbà ohun ìní rẹ̀ padà.
14 “‘Ọ bụrụ na i resiri onye agbataobi gị ala, maọbụ na o nwere nke ọ zụrụ site nʼaka gị, unu aghọgbula ibe unu.
“‘Bí ẹ bá ta ilẹ̀ fún ọ̀kan nínú àwọn ènìyàn yín tàbí bí ẹ bá ra èyíkéyìí láti ọ̀dọ̀ rẹ̀, ẹ má ṣe rẹ́ ara yín jẹ.
15 Ị ga-azụrụ ala site nʼaka onye agbataobi dịka ọnụọgụgụ afọ si dị site nʼafọ inwere onwe. Ha ga-eresi gị ya dịka ọnụọgụgụ afọ ole fọdụrụ maka ịkọ ihe nʼala ahụ.
Kí ẹ ra ilẹ̀ lọ́wọ́ àwọn ènìyàn yín ní gẹ́gẹ́ bí iye owó tí ó kù kí ọdún ìdásílẹ̀ pé, kí òun náà sì ta ilẹ̀ fún yín gẹ́gẹ́ bí iye ọdún rẹ̀ tókù láti kórè.
16 Ọ bụrụ na a zụrụ ala ahụ nso nso mmemme iri afọ ise a, ọnụahịa ala ahụ ga-adị ala, ọ bụrụkwanụ na ọ dị anya site na mmemme ahụ, ọnụahịa ya ga-adị elu, nʼihi na ụgwọ onye ahụ na-akwụ bụ ụgwọ ugboro ole ọ ga-akụ ihe nʼala ahụ.
Bí iye ọdún rẹ̀ bá gùn, kí iye owó rẹ̀ pọ̀, bí iye ọdún rẹ̀ bá kúrú, kí iye owó rẹ̀ kéré, torí pé ohun tí ó tà gan an ní iye èso rẹ̀.
17 Unu emegbula ibe unu kama tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
Ẹ má ṣe rẹ́ ara yín jẹ, ṣùgbọ́n ẹ bẹ̀rù Ọlọ́run. Èmi ni Olúwa Ọlọ́run yín.
18 “‘Gbasoonụ ụkpụrụ m, ma lezie anya imezu ihe m nyere nʼiwu, ka unu nwee ike ibi obi udo nʼala ahụ.
“‘Ẹ tẹ̀lé àwọn ìlànà mi, kí ẹ sì kíyèsi láti pa òfin mi mọ́, kí ẹ ba à le máa gbé láìléwu ní ilẹ̀ náà.
19 Mgbe ahụ, ala ga-amị mkpụrụ ya, unu ga-eriju afọ, birikwa nʼala ahụ nʼudo.
Nígbà yìí ni ilẹ̀ náà yóò so èso rẹ̀, ẹ ó sì jẹ àjẹyó, ẹ ó sì máa gbé láìléwu.
20 Unu nwere ike jụọ ajụjụ sị, “Gịnị ka anyị ga-eri nʼafọ nke asaa ahụ ebe ọ bụ na anyị agaghị akụ ihe ọbụla, maọbụ wee ihe ubi ọbụla nʼafọ ahụ?”
Ẹ le béèrè pé, “Kí ni àwa ó jẹ ní ọdún keje, bí a kò bá gbin èso tí a kò sì kórè?”
21 Aga m ezitere unu ngọzị dị ukwuu nʼafọ nke isii, nke ga-eme ka ala mee ihe omume nke ga-ezuru unu afọ atọ.
Èmi ó pèsè ìbùkún sórí yín tó bẹ́ẹ̀ tí ilẹ̀ yín yóò so èso tó tó fún ọdún mẹ́ta lẹ́yìn rẹ̀.
22 Mgbe unu ga-akụ ihe ubi nʼafọ nke asatọ unu ga na-eri site nʼowuwe ihe ubi ochie unu tutu ruo nʼafọ nke itoolu mgbe unu ga-ewebata ihe ubi ọhụrụ.
Bí ẹ bá gbin èso yín ní ọdún kẹjọ, àwọn èso ti tẹ́lẹ̀ ní ẹ ó máa jẹ, títí tí ìkórè ti ọdún kẹsànán yóò fi dé.
23 “‘Chetanụ na ala bụ nke m, nʼihi nke a, o kwesighị ka unu ree ala ọbụla kpamkpam. Unu bụ naanị ndị ọbịa na ndị nlekọta nye m.
“‘Ẹ má ṣe ta ilẹ̀ yín ní àtàpa torí pé ẹ̀yin kọ́ lẹ ni ín, ti Ọlọ́run ni, ẹ̀yin jẹ́ àjèjì àti ayálégbé.
24 Nʼala obibi unu niile, unu ga-enye ohere maka mgbapụta ala erere ere.
Ní gbogbo orílẹ̀-èdè ìní yín, ẹ fi ààyè sílẹ̀ fún ìràpadà ilẹ̀ náà.
25 “‘Ọ bụrụ na otu onye nʼime unu aghọọ onye ogbenye si otu a ree ala ya, nwanna ya dị ya nso ga-abịa gbapụta ala ahụ.
“‘Bí ọ̀kan nínú àwọn ènìyàn yín bá tálákà, dé bi pé ó ta ara àwọn ẹrù rẹ̀, kí ará ilé rẹ̀ tí ó súnmọ́ ọ ra ohun tí ó tà padà.
26 Ọ bụrụ na-enweghị onye ga-agbapụta ala ahụ nye ha, ma ha mesịa ghọọ ndị bara ụba nwekwa ihe ga-ezu ịgbapụta ala ahụ nʼonwe ha.
Ẹni tí kò ní ẹni tó lè rà á padà fún un, tí òun fúnra rẹ̀ sì ti lọ́rọ̀, tí ó sì ní ànító láti rà á.
27 A ga-agụ afọ ole gara site na mgbe o rere ala ahụ, nyeghachi ya ego ole o kwesiri inweta. Onye rere ala ga-alaghachikwa nʼala ya.
Kí ó mọ iye owó tí ó jẹ fún iye ọdún tí ó tà á, kí ó dá iye tí ó kù padà fún ẹni tí ó tà á fún, lẹ́yìn náà, ó lè padà sí ilẹ̀ ìní rẹ̀.
28 Ọ bụrụ na onyenwe ya enweghị ike ịchọta ego ọ ga-eji gbara ya, ala ahụ ga-adị nʼaka onye ahụ zụrụ ya tutu ruo nʼafọ inwere onwe. Mgbe ahụ ọ ga-ewerekwa ala ahụ nyeghachi ya onye resiri ya.
Ṣùgbọ́n bí kò bá rí ọ̀nà àti san án padà fún un. Ohun tí ó tà wà ní ìkáwọ́ ẹni tí ó rà á títí di ọdún ìdásílẹ̀. Kí ó dá a padà fún ẹni tí ó ni i ní ọdún ìdásílẹ̀, ẹni tí ó ni í tẹ́lẹ̀ lè tún padà gbà ohun ìní rẹ̀.
29 “‘Onye ọbụla rere ụlọ obibi dị nʼobodo e ji mgbidi gbaa gburugburu nwere ikike mgbapụta ya naanị mgbe otu afọ zuru site na mgbe e rere ya. Nʼoge ahụ ka onye rere ya nwere ike ịgbaghachi ya.
“‘Bí arákùnrin kan bá ta ilé gbígbé kan ní ìlú olódi, kí ó rà á padà ní ìwọ̀n ọdún kan sí àkókò tí ó tà á, ní ìwọ̀n ọdún kan ni kí ó rà á padà.
30 Ọ bụrụ na a gbapụtaghị ya tupu otu afọ agafee, ụlọ ahụ dị nʼime obodo nwere mgbidi ga-abụ nke onye ahụ zụrụ ya mgbe niile, bụrụkwa nke ụmụ ụmụ ya. A gaghị enyeghachikwa ya mgbe afọ inwere onwe ruru.
Ṣùgbọ́n bí kò bá rà á padà láàrín ọdún náà ilé náà tí ó wà láàrín ìlú ni kí ó yọ̀ǹda pátápátá fún ẹni tí ó rà á, àti àwọn ìdílé rẹ̀. Kí wọ́n má da padà ní ọdún ìdásílẹ̀.
31 Ma ụlọ ndị dị nʼobodo nta na-enweghị mgbidi a ga-agụ ha dịka ihe dị nʼọhịa. E nwere ike ịgbapụta ha, ha bụkwa nke a ga-eweghachite mgbe afọ inwere onwe ruru.
Ṣùgbọ́n àwọn ilé tí ó wà ní abúlé láìní odi ni kí a kà gẹ́gẹ́ bí ilẹ̀ oko, a lè rà wọ́n padà, kí wọ́n sì da padà ní ọdún ìdásílẹ̀.
32 “‘Ma banyere obodo niile nke ndị Livayị dị iche iche. Ha nwere ikike ịgbapụta ụlọ ha dị nʼime nketa ha mgbe ọbụla.
“‘Àwọn ọmọ Lefi ní ẹ̀tọ́, nígbàkígbà láti ra ilẹ̀ wọn, tí ó jẹ́ ohun ìní wọn ní àwọn ìlú tí ó jẹ́ ti ọmọ Lefi.
33 Ihe onwunwe ndị Livayị bụ nke e nwere ike ịgbapụta, bụ ndị a, ụlọ niile e rere nke dị nʼobodo ha nwere. Ọ ga-abụ nʼafọ inwere onwe ka aga enwetaghachi ha, nʼihi na ụlọ ndị ahụ dị nʼobodo ndị Livayị bụ naanị oke ha nwere nʼetiti ụmụ Izrel.
Torí náà ohun ìní àwọn ọmọ Lefi ni wọ́n rà padà, fún àpẹẹrẹ, èyí ni pé ilẹ̀ tí a bá tà ní ìlúkílùú tí ó jẹ́ tiwọn, ó sì gbọdọ̀ di dídápadà ní ọdún ìdásílẹ̀, torí pé àwọn ilẹ̀ tí ó wà ní ìlú àwọn Lefi ni ìní wọn láàrín àwọn ará Israẹli.
34 Ma a gaghị ere ala ebe ịta nri nke anụ ụlọ gbara obodo ha gburugburu ere, nʼihi ọ bụ ihe ha nwee nʼọha ruo ebighị ebi.
Ṣùgbọ́n ilẹ̀ tí wọ́n ti ń da ẹran tí ó jẹ́ ti ìlú wọn, wọn kò gbọdọ̀ tà wọ́n, ilẹ̀ ìní wọn láéláé ni.
35 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye ruo na o nweghị ike inyere onwe ya aka, ọ dị gị nʼaka inyere ya aka, kpọbata ya ka ọ bịa biri nʼụlọ gị dịka ị ga-esi kpọbata onye ọbịa. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-anọgide biri nʼetiti unu.
“‘Bí arákùnrin yín kan bá tálákà tí kò sì le è pèsè fún àìní ara rẹ̀, ẹ pèsè fún un bí ẹ ti ń ṣe fún àwọn àlejò tàbí àwọn tí ẹ gbà sílé: kí ó ba à le è máa gbé láàrín yín.
36 Tụọ egwu Chineke, kwerekwa ka nwanna gị soro gị biri nʼala ahụ. A nakwala ụma maọbụ ọmụrụnwa ọbụla.
Ẹ kò gbọdọ̀ gba èlé kankan lọ́wọ́ rẹ̀, ẹ bẹ̀rù Olúwa kí arákùnrin yín le è máa gbé láàrín yín.
37 Ị gaghị ana ọmụrụnwa nʼego i gbazinyere ha, maọbụ rie uru site na nri i resiri ha.
Ẹ má ṣe gba èlé lórí owó tí ẹ yá a bẹ́ẹ̀ ni ẹ kò gbọdọ̀ jẹ èrè lórí oúnjẹ tí ẹ tà fún un.
38 Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt, inye unu ala Kenan, na ị bụ Chineke unu.
Èmi ni Olúwa Ọlọ́run yín tí ó mú yín jáde láti ilẹ̀ Ejibiti láti fún yín ní ilẹ̀ Kenaani àti láti jẹ́ Ọlọ́run yín.
39 “‘Ọ bụrụ na onye Izrel ọbụla adaa ogbenye, resi gị onwe ya, emela ka o jere gị ozi dịka onye ohu.
“‘Bí arákùnrin yín kan bá tálákà dé bi pé ó ta ara rẹ̀ fún ọ bí ẹrú. Má ṣe lò ó bí ẹrú.
40 Kama ị ga-emeso ya mmeso dịka ị ga-esi meso onye ọrụ e goro ego, maọbụ dịka onye ọbịa nọ nʼetiti unu. Ọ ga-ejere gị ozi tutu ruo afọ inwere onwe.
Jẹ́ kí ó wà lọ́dọ̀ rẹ bí alágbàṣe tàbí àlejò láàrín yín, kí ó máa ṣiṣẹ́ sìn ọ́ títí di ọdún ìdásílẹ̀.
41 Nʼafọ ahụ, ị ga-ahapụ ha na ụmụ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha, si otu a nwetaghachi ala ubi dị nʼezinaụlọ ha.
Nígbà náà ni kí ó yọ̀ǹda òun àti àwọn ọmọ rẹ̀, kí wọ́n padà sí ìdílé wọn àti sí ilẹ̀ ìní baba wọn.
42 Nʼihi na a kpọpụtara m ndị Izrel site nʼala Ijipt ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi. Ya mere, a gaghị ere ha mgbe ọbụla dịka ohu.
Torí pé ìránṣẹ́ mi ni àwọn ará Israẹli jẹ́. Ẹni tí mo mú jáde láti ilẹ̀ Ejibiti wá, torí èyí ẹ kò gbọdọ̀ tà wọ́n lẹ́rú.
43 A gakwaghị emegbu ha nʼụzọ dị njọ. Tụọnụ egwu Chineke unu.
Ẹ má ṣe rorò mọ́ wọn: ṣùgbọ́n ẹ bẹ̀rù Ọlọ́run yín.
44 “‘Ma unu nwere ike gbara ndị ohu nwoke maọbụ nwanyị site nʼetiti ndị mba ọzọ niile bi nʼakụkụ unu. Unu nwere ike site nʼebe ahụ zụta ndị ohu.
“‘Àwọn ẹrúkùnrin àti ẹrúbìnrin yín lè jẹ́ láti orílẹ̀-èdè tí ó yí yín ká, ẹ lè ra àwọn ẹrú wọ̀nyí lọ́wọ́ wọn.
45 Unu nwere ike ịzụ ndị ohu site nʼetiti ndị mbịarambịa bi nʼetiti unu, maọbụ site nʼetiti ndị agbụrụ ha a mụrụ nʼala Izrel. Ndị dị otu a ga-abụkwa ihe onwunwe unu.
Bákan náà, ẹ sì le è ra àwọn àlejò tí ń gbé láàrín yín, àti àwọn ìdílé wọn tí a bí sáàrín yín. Wọn yóò sì di ohun ìní yín.
46 Unu nwere ike kenye ha ụmụ unu dịka ihe nketa, ma mee ha ndị ohu unu ụbọchị ndụ ha niile. Ma unu agaghị eji aka ike chịa onye Izrel ibe unu.
Ẹ lè fi wọ́n sílẹ̀ bí ogún fún àwọn ọmọ yín, wọ́n sì lè sọ wọ́n di ẹrú títí láé. Ṣùgbọ́n ẹ kò gbọdọ̀ rorò mọ́ ọmọ Israẹli kankan.
47 “‘Ọ bụrụ na onye ọbịa bi nʼetiti unu aghọọ ọgaranya, ma otu nʼime ụmụnna unu adaa ogbenye were onwe ya resi onye ọbịa ahụ bi nʼetiti unu, maọbụ were onwe ya resi nwanna ndị ikwu onye ọbịa ahụ,
“‘Bí àlejò kan láàrín yín tàbí ẹni tí ń gbé àárín yín fún ìgbà díẹ̀ bá lọ́rọ̀ tí ọmọ Israẹli sì tálákà dé bi pé ó ta ara rẹ̀ lẹ́rú fún àlejò tàbí ìdílé àlejò náà.
48 ha nwere ikike ịgbapụta ya mgbe ha resiri onwe ha. Otu nʼime ụmụnna ya nwere ike gbapụta ha.
Ó lẹ́tọ̀ọ́ si ki a rà á padà lẹ́yìn ìgbà tí ó ti ta ara rẹ̀. Ọ̀kan nínú ìbátan rẹ̀ le è rà á padà.
49 Nwanne nne ya, maọbụ nwanne nna ya, maọbụ nwanna nʼikwu ha ọbụla nwere ike ịgbapụta ya. Ọ nwekwara ike ịgbapụta onwe ya ma ọ bụrụ na ọ kpata ego.
Àbúrò baba rẹ̀ ọkùnrin tàbí àbúrò rẹ̀ obìnrin tàbí ẹnikẹ́ni tí ó bá tan nínú ìdílé rẹ̀ le è rà wọ̀n padà. Bí ó bá sì ti lọ́rọ̀, ó lè ra ara rẹ̀ padà.
50 Ya na onye ahụ o resiri onwe ya ga-agụ afọ ole ọ bụ site na mgbe o rere onwe ya ruo nʼafọ inwere onwe. Ego a ga-akwụ nʼihi ịgbapụta ya ga-abụ ego ọ ga-efu ịkwụ ohu ọzọ ụgwọ ịrụ ọrụ ọnụọgụgụ afọ ndị ahụ niile.
Kí òun àti olówó rẹ̀ ka iye ọdún tí ó ta ara rẹ̀ títí dé ọdún ìdásílẹ̀ kí iye owó ìdásílẹ̀ rẹ̀ jẹ́ iye tí wọ́n ń san lórí alágbàṣe fún iye ọdún náà.
51 Ọ bụrụ nʼọtụtụ afọ fọdụrụ, ọ ga-esite nʼọnụ ego e rere ha kwụọ nke dị ukwu dịka ego mgbapụta ha. Naanị ihe ntakịrị ga-apụ nʼime ego ahụ.
Bí iye ọdún rẹ̀ tí ó ṣẹ́kù bá pọ̀, kí iye owó fún ìràpadà rẹ̀ pọ̀.
52 Ọ bụrụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ inwere onwe eruo, ọ ga-agụkọ ihe ego ahụ pụtara, kwụọ ya maka ịgbara onwe ya dịka o kwesiri.
Bí ó bá sì ṣe pé kìkì ọdún díẹ̀ ni ó kù títí di ọdún jubili, kí ó ṣe ìṣirò rẹ̀, kí ó sì san owó náà bí iye ìṣirò rẹ̀ padà.
53 A ga-emeso ha dịka ndị ọrụ e goro ego kwa afọ, ma ị ga-ahụ na onye ha nọ nʼokpuru ya agaghị eji aka ike chịa ha.
Bí ẹ ti ń ṣe sí i lọ́dọọdún, ẹ rí i dájú pé olówó rẹ̀ kò korò mọ́ ọ.
54 “‘Ma ọ bụrụ na e nweghị ike gbapụta ya site nʼụzọ ndị a niile, ya na ụmụ ya ga-enwere onwe ha mgbe afọ inwere onwe ahụ zuru.
“‘Bí a kò bá rà á padà nínú gbogbo ọ̀nà wọ̀nyí, kí ẹ tú òun àti àwọn ọmọ rẹ̀ sílẹ̀ ní ọdún ìdásílẹ̀.
55 Nʼihi na mụ ka ụmụ Izrel bụ ndị ohu nye. Ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara site nʼala Ijipt. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
Nítorí pé ìránṣẹ́ ni àwọn ọmọ Israẹli jẹ́ fún mi. Ìránṣẹ́ mi ni wọ́n, tí mo mú jáde láti Ejibiti wá. Èmi ni Olúwa Ọlọ́run yín.

< Levitikọs 25 >