< Levitikọs 24 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
And YHWH speaks to Moses, saying,
2 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
“Command the sons of Israel, and they bring pure oil of beaten olive to you for the lamp, to cause a light to go up continually;
3 Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu.
Aaron arranges it at the outside of the veil of the Testimony, in the Tent of Meeting, from evening until morning before YHWH continually—a continuous statute throughout your generations;
4 Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu Onyenwe anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile.
he arranges the lights on the pure lampstand before YHWH continually.
5 “Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla.
And you have taken flour, and have baked twelve cakes with it, two-tenth parts are in one cake,
6 Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị.
and you have set them [in] two rows (six in the row) on the pure table before YHWH,
7 Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
and you have put pure frankincense on the row, and it has been with the bread for a memorial, a fire-offering to YHWH.
8 A ga-edo achịcha ndị a nʼihu Onyenwe anyị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ Izrel, dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi.
On each Sabbath day he arranges it before YHWH continually, from the sons of Israel—a perpetual covenant;
9 Ọ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị ga-eri ya nʼime nʼebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ, site nʼoke ha mgbe niile, nke sitere nʼonyinye nsure ọkụ e chere nye Onyenwe anyị.”
and it has been for Aaron and for his sons, and they have eaten it in the holy place, for it [is] most holy to him, from the fire-offerings of YHWH—a continuous statute.”
10 Otu nwokorobịa, nke nna ya bụ onye Ijipt ma nne ya bụ onye Izrel, sitere nʼetiti ụmụ Izrel pụta. O ruo na nwoke a nne ya bụ onye Izrel na otu nʼime ndị ikom Izrel malitere ịlụ ọgụ.
And a son of an Israeli woman goes out (and he [is] son of an Egyptian man) in the midst of the sons of Israel, and the son of the Israeli woman and a man of Israel strive in the camp,
11 Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel kwuluru Aha ahụ kọchaa ya. Nʼihi ya, a kpọrọ ya ikpe nʼihu Mosis. (Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibri, onye ebo Dan.)
and the son of the Israeli woman execrates the Name and reviles; and they bring him to Moses; and his mother’s name [is] Shelomith daughter of Dibri, of the tribe of Dan;
12 Ha tinyere nwoke ahụ nʼụlọ mkpọrọ na-eche ka ha nụ okwu Onyenwe anyị, ịmata ihe ha ga-eme ya.
and he causes him to rest in confinement —to explain to them by the mouth of YHWH.
13 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
And YHWH speaks to Moses, saying,
14 “Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya.
“Bring out the reviler to the outside of the camp; and all those hearing have laid their hands on his head, and all the congregation has stoned him.
15 Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya.
And you speak to the sons of Israel, saying, When any man reviles his God—then he has borne his sin;
16 Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu.
and he who is execrating the Name of YHWH is certainly put to death; all the congregation certainly casts stones at him; as a sojourner so a native, in his execrating the Name, he is put to death.
17 “‘Onye ọbụla gburu mmadụ ka a ga-egbu.
And when a man strikes any soul of man, he is certainly put to death.
18 Onye gburu anụ ụlọ na-abụghị nke ya, ga-akwụghachi ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ.
And he who strikes a beast repays it, body for body.
19 Onye ọbụla merụrụ mmadụ ibe ya ahụ, a ga-emerụkwa onye ahụ ahụ nʼebe o merụrụ ibe ya ahụ.
And when a man puts a blemish in his fellow, as he has done so it is done to him;
20 Onye tijiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-etiji ọkpụkpụ nke ya. Anya ga-alara anya, eze ga-alakwara eze. Otu e si merụọ mmadụ ahụ, ka a ga-esi merụọkwa onye merụrụ ya ahụ.
breach for breach, eye for eye, tooth for tooth; as he puts a blemish in a man so it is done in him.
21 Onye ọbụla gburu anụ ụlọ onye ọzọ, ga-akwụ ụgwọ ya. Ma a ga-egbu onye ọbụla gburu mmadụ.
And he who strikes a beast repays it, and he who strikes [the life of] man is put to death.
22 Unu ga-enwe otu iwu nke ga-adị nye ndị amụrụ nʼala, dịkwara ndị ọbịa niile. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
One judgment is for you; as a sojourner so is a native; for I [am] your God YHWH.”
23 Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị Izrel okwu, nʼihi ya ha dọkpụụrụ onye nkwulu ahụ pụọ nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya nʼebe ahụ, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.
And Moses speaks to the sons of Israel, and they bring out the reviler to the outside of the camp, and stone him [with] stone; and the sons of Israel have done as YHWH has commanded Moses.

< Levitikọs 24 >