< Levitikọs 22 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
And the Lord said to Moses,
2 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom ka ha jiri nsọpụrụ nabata onyinye dị nsọ nke ụmụ Izrel na-edo nsọ nye m, ka ha ghara imerụ aha nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
Give orders to Aaron and to his sons to keep themselves separate from the holy things of the children of Israel which they give to me, and not to make my holy name common: I am the Lord,
3 “Gwa ha sị, ‘Nʼọgbọ unu niile na-abịa, ọ bụrụ na enwee onye ọbụla nʼagbụrụ unu nke bịara nso nʼihe ndị ahụ dị nsọ ụmụ Izrel na-edo nsọ nye Onyenwe anyị, mgbe onye ahụ nọ ọnọdụ dịka onye rụrụ arụ, a ga-esi nʼihu m wezuga onye ahụ. Abụ m Onyenwe anyị.
Say to them, If any man of all your seed through all your generations, being unclean, comes near the holy things which the children of Israel make holy to the Lord, he will be cut off from before me: I am the Lord.
4 “‘Onye ọbụla bụ nwa nwa Erọn nke ọrịa ekpenta na-arịa, maọbụ nke ihe si nʼahụ ya na-asọpụta agaghị eri aja dị nsọ tutu ruo mgbe e mere ka ọ dịrị ọcha. Ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ma ọ bụrụ na o metụ ozu aka, maọbụ onye mkpụrụ nwa na-esite nʼahụ awụsị,
No man of the seed of Aaron who is a leper, or who has a flow from his body, may take of the holy food till he is clean. And any man touching anything which is unclean because of the dead, or any man whose seed goes from him;
5 maọbụ na o metụrụ anụ na-akpụgharị akpụgharị nʼala aka, nke na-emerụ ya, maọbụ na ọ metụrụ mmadụ aka nke mere ka ọ bụrụ onye rụrụ arụ nʼagbanyeghị ihe ọ bụ na-emerụ ya.
Or anyone touching any unclean thing which goes flat on the earth, or someone by whom he may be made unclean in any way whatever;
6 Onye ahụ metụrụ ihe ndị a aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ gaghị eri ihe nsọ ọbụla tutu ruo mgbe ọ sachara ahụ.
Any person touching any such unclean thing will be unclean till evening, and may not take of the holy food till his flesh has been bathed in water;
7 Mgbe anyanwụ dara ka ọ ga-adị ọcha, nweekwa ike iri ihe dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nri ya.
And when the sun has gone down he will be clean; and after that he may take part in the holy food, because it is his bread.
8 Ọ gaghị eri anụ nwụrụ anwụ, maọbụ nke anụ ọzọ dọgburu, nʼihi na ihe ndị a ga-emerụ ya. Abụ m Onyenwe anyị.
That which comes to a natural death, or is attacked by beasts, he may not take as food, for it will make him unclean: I am the Lord.
9 “‘Ndị nchụaja kwesiri idebe ụkpụrụ m, ka ha ghara ịbụ ndị ikpe mara si otu a nwụọ nʼihi na ha lelịrị ha anya. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.
So then, let them keep what I have put into their care, for fear that sin may come on them because of it, so causing their death because they have made it common: I am the Lord, who make them holy.
10 “‘O nweghị onye ọbụla na-esiteghị nʼezinaụlọ ndị nchụaja ga-eri aja nsọ ahụ. Onye bụ ọbịa na onye e goro ọrụ nọ nʼụlọ onye nchụaja agaghị eri ya.
No outside person may take of the holy food, or one living as a guest in the priest's house, or a servant working for payment.
11 Otu ọ dị, ọ bụrụ na onye nchụaja weere ego nke aka ya gbata ohu, maọbụ na a mụrụ ohu ahụ nʼụlọ ya, ohu ahụ nwere ike iri aja nsọ ahụ.
But any person for whom the priest has given money, to make him his, may take of it with him; and those who come to birth in his house may take of his bread.
12 Ọ bụrụ na nwa nwanyị onye nchụaja alụọ onye na-abụghị onye nchụaja, ọ gaghị eri ihe ọbụla site nʼime aja nsọ a.
And if the daughter of a priest is married to an outside person she may not take of the holy things which are lifted up as offerings.
13 Ma nwa nwanyị onye nchụaja nke di ya nwụrụ, maọbụ na ya na di ya ebikwaghị, ọ bụrụkwa na ọ mụtaghị nwa ọbụla, ọ lọghachi bịa biri nʼụlọ nna ya dịka o mere mgbe ọ bụ agbọghọ, o nwere ike iri nri dị nʼụlọ nna ya. Ọ dịkwaghị onye na-ekwesighị iri ya, nke ga-eri ya.
But if a priest's daughter is a widow, or parted from her husband, and has no child, and has come back to her father's house as when she was a girl, she may take of her father's bread; but no outside person may do so.
14 “‘Ọ bụrụ na onye ọbụla erie onyinye nsọ ahụ na-amaghị ama, ọ ga-eweghachiri onye nchụaja ihe niile o riri tụkwasịkwa ya otu ụzọ nʼụzọ ise ọzọ.
And if a man takes the holy food in error, he will have to give the holy thing back to the priest, with the addition of a fifth part.
15 Ndị nchụaja ekwesighị imerụ onyinye nsọ ụmụ Izrel na-eche nʼihu Onyenwe anyị,
And they may not make common the holy things which the children of Israel give to the Lord,
16 site nʼikwenye ka ndị mmadụ efu rie onyinye nsọ ahụ, si otu a wetara ndị riri ya ikpe ọmụma nke ya na nkwụghachi so. Abụ m Onyenwe anyị onye na-edo ha nsọ.’”
So causing sin to come on them when they take their holy things for food: I am the Lord who make them holy.
17 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
And the Lord said to Moses,
18 “Gwa Erọn na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla, onye Izrel maọbụ onye ọbịa nʼIzrel, eweta aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị imezu nkwa o kwere, maọbụ dịka onyinye afọ ofufu,
Say to Aaron and to his sons and to all the children of Israel, If any man of the children of Israel, or of another nation living in Israel, makes an offering, given because of an oath or freely given to the Lord for a burned offering;
19 ọ ga-eweta otu oke nke na-enweghị nkwarụ nke si nʼigwe ehi, maọbụ atụrụ, maọbụ ewu, ka a nabata ya nʼaha.
So that it may be pleasing to the Lord, let him give a male, without any mark, from among the oxen or the sheep or the goats.
20 Ewebatala ihe ọbụla nke nwere nkwarụ, nʼihi na agaghị m anabata ya nʼaha gị.
But anything which has a mark you may not give; it will not make you pleasing to the Lord.
21 Mgbe onye ọbụla wetara ehi maọbụ atụrụ maọbụ ewu site nʼigwe anụ, dịka onyinye aja udo ọ na-enye Onyenwe anyị maka imezu nkwa, maọbụ onyinye afọ ofufu, ọ ga-abụ nke na-enweghị ọrụsị maọbụ ntụpọ ọbụla tupu a nabata ya.
And whoever makes a peace-offering to the Lord, in payment of an oath or as a free offering, from the herd or the flock, if it is to be pleasing to the Lord, let it be free from any mark or damage.
22 Anụmanụ ọbụla kpuru ìsì, maọbụ nke merụrụ ahụ, maọbụ nke ụkwụ maọbụ aka gbajiri, maọbụ nke akpụkpa dị nʼahụ ya, maọbụ ihe nwere ure, maọbụ nke ọnya dị nʼahụ, agaghị abụ ihe onyinye nye Onyenwe anyị. Unu atụkwasịkwala ha nʼebe ịchụ aja dịka onyinye nye Onyenwe anyị.
Anything blind or broken or damaged or having any disease or any mark on it may not be offered to the Lord; you may not make an offering of it by fire on the altar to the Lord.
23 Unu nwere ike jiri ehi maọbụ atụrụ nke akụkụ ahụ ya tara ata, maọbụ nke otu akụkụ ya buru ibu karịa ibe ya chụọ aja onyinye si nʼobi, ma a gaghị e ji ya chụọ aja imezu nkwa.
An ox or a lamb which has more or less than its natural parts, may be given as a free offering; but it will not be taken in payment of an oath.
24 Unu agaghị enye anụmanụ ọbụla nke mkpụrụ amụ ya chipịara echipịa, maọbụ nke pịara apịa, maọbụ nke a dọwapụrụ adọwapụ maọbụ nke a chakapụrụ achakapụ, dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị. Unu enyekwala ụdị onyinye a nʼala unu.
An animal which has its sex parts damaged or crushed or broken or cut, may not be offered to the Lord; such a thing may not be done anywhere in your land.
25 Unu esitekwala nʼaka onye ọbịa nata ụdị onyinye a, ma webata ya dịka nri a na-enye Chineke unu. A gaghị anabata ha nʼọnọdụ unu, nʼihi na ha nwere nkwarụ, nwekwa ntụpọ.’”
And from one who is not an Israelite you may not take any of these for an offering to the Lord; for they are unclean, there is a mark on them, and the Lord will not be pleased with them.
26 Onyenwe anyị sịrị Mosis,
And the Lord said to Moses,
27 “Mgbe a mụrụ nwa ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu ọhụrụ, a ga-ahapụ ya na nne ya ụbọchị asaa. Site nʼụbọchị nke asatọ gaa nʼihu a ga-anabata ya dịka onyinye ihe oriri i ji chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
When an ox or a sheep or a goat is given birth, let it be with its mother for seven days; and after the eighth day it may be taken as an offering made by fire to the Lord.
28 Egbula nne anụ na nwa ya nʼotu ụbọchị, maọbụ ehi maọbụ atụrụ.
A cow or a sheep may not be put to death with its young on the same day.
29 “Mgbe unu na-achụrụ Onyenwe anyị aja ekele, chụọnụ ya nʼụzọ ahụ a ga-anabata ya.
And when you make an offering of praise to the Lord, make it in a way which is pleasing to him.
30 Riekwanụ anụ aja ahụ nʼotu ụbọchị ahụ, ka ọ hapụ ịfọdụ ruo echi ya. Abụ m Onyenwe anyị.
Let it be used for food on the same day; do not keep any part of it till the morning: I am the Lord.
31 “Unu ga-edebe iwu m ndị a niile, mee ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị.
So then, keep my orders and do them: I am the Lord.
32 Unu emekwala ka aha m ghara ịdị nsọ. A ga-edo aha m nsọ nʼetiti ụmụ Izrel, nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
And do not make my holy name common; so that it may be kept holy by the children of Israel: I am the Lord who make you holy,
33 Ọ bụ m kpọpụtara unu site nʼala Ijipt ka m bụrụ Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.”
Who took you out of the land of Egypt that I might be your God: I am the Lord.