< Levitikọs 20 >

1 Onyenwe anyị sịrị Mosis,
UThixo wathi kuMosi,
2 “Gwa ụmụ Izrel, ‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa ọbụla bi nʼetiti unu, nke weere nwa ya nye maka ịchụrụ Molek aja, aghaghị ime ka ọ nwụọ. Ndị mmadụ ga-ewere nkume tugbuo ya.
“Tshela abako-Israyeli uthi: ‘Loba ngubani kwabako-Israyeli kumbe owezizweni ohlala kini onikela abantwana bakhe kunkulunkulu uMoleki, kumele abulawe. Izakhamizi kazimkhande ngamatshe.
3 Mụ onwe m ga-emegide onye ahụ, bipụ ya site nʼetiti ndị ya, nʼihi na o merụọla ebe nsọ m, mee ka aha m gharakwa ịdị nsọ, site nʼiji ụmụ ya chụọrọ Molek aja.
Mina ngizamdela lowomuntu, ngimkhuphe ebantwini bakibo; ngoba nxa enikele ngabantwabakhe kuMoleki, usengcolise indlu yami engcwele, wahlambaza lebizo lami elingcwele.
4 Ọ bụrụ na ndị obodo elezie anya mee omume dịka a ga-asị na ha amaghị ihe onye ahụ mere, hapụkwa igbu ya, mgbe o were otu nʼime ụmụ ya nye Molek,
Nxa izakhamizi zendawo zingangamnanzi lowomuntu enikela umntanakhe kuMoleki zingambulali,
5 mụ onwe m ga-emegide onye ahụ na ezinaụlọ ya bipụ ha site nʼetiti ndị ya. Otu a kwa ka m ga-eme ya na ndị niile so ya merụọ onwe ha site nʼife arụsị Molek.
mina ngizamhlamukela lowomuntu labomuzi wakhe, ngibakhuphe ebantwini bakibo, yena kanye labo bonke abahlanganyela laye njengeziphingi kuMoleki.
6 “‘Aga m edo ihu m megide onye ọbụla gara jụọ ase site nʼaka mmụọ ọjọọ, maọbụ onye gara na dibịa afa gbaa afa, site nʼiso ha kwaa iko. Aga m ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
Ngizamhlamukela lowo oya ezangomeni lezanuseni njengesiphingi sazo, ngokulandelana lazo. Ngizamkhupha kwabakibo.
7 “‘Doonụ onwe unu nsọ, ma dịkwanụ nsọ nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
Zingcweliseni libengcwele ngoba mina nginguThixo uNkulunkulu wenu.
8 Debenụ ụkpụrụ m niile, ma gbasoonụ ha nʼihi na abụ m Onyenwe anyị onye na-edo unu nsọ.
Gcinani izimiso zami lizilandele. Mina nginguThixo olenza libengcwele.
9 “‘Onye ọbụla kọchara nne ya maọbụ nna ya ka a ga-egbu nʼihi na ọ kọchara nne na nna ya. Ọbara onye dị otu a ga-adịkwa ya nʼisi.
Lowo othuka uyise loba unina kabulawe. Usethuke uyise loba unina ngakho usefanele ukufa.
10 “‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwoke ọzọ, ya bụ nwunye onye agbataobi ya, nwoke ahụ na nwanyị kwara iko ka a ga-egbu.
Nxa indoda ifeba lomfazi womunye, umfazi kamakhelwane, kababulawe bobabili isiphingi lesiphingikazi leso.
11 “‘Nwoke ọbụla ya na nwunye nna ya dinakọrọ nwe mmekọ, emerụọla nna ya. A ga-egbu nwoke ahụ na nwanyị ahụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
Nxa indoda ilala lomfazi kayise, isiyembule ubunqunu bukayise. Leyondoda lonina lowo kababulawe. Bafanele ukufa.
12 “‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla edinakwuru nwunye nwa ya, wetara onwe ha ikpe ọmụma, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ọ bụ arụ ka ha mere.
Nxa indoda ilala lomalokazana wayo, kababulawe bobabili. Lokho asebekwenzile kulihlazo. Bafanele ukufa.
13 “‘Ọ bụrụ nwoke na nwoke ibe ya edinakọọ nwee ụdị mmekọ edina nwoke na nwanyị, a ga-egbu ha abụọ nʼihi na ihe ha mere bụ ihe rụrụ arụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
Nxa indoda ilala lenye indoda ingathi ilala lomfazi, bobabili benze amanyala. Kababulawe. Bafanele ukufa.
14 “‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwanyị na nne mụrụ ya, ajọ ihe ka ọ bụ. Nwoke ahụ na ndị inyom ndị ahụ ka a ga-akpọ ọkụ, ka ihe ọjọọ dị otu a hapụ ịdị nʼetiti unu.
Nxa indoda ithatha umfazi, ithathe lonina, kubi lokho. Yona indoda labesifazane labo kabatshiswe ngomlilo ukuze kungabi lokuxhwala phakathi kwenu.
15 “‘Ọ bụrụ na nwoke na anụmanụ enwee mmekọrịta, a ga-egbu nwoke ahụ gbukwaa anụmanụ ahụ.
Nxa indoda iphinga lesifuyo, kayibulawe, lesifuyo leso sibulawe.
16 “‘Ọ bụrụ na nwanyị ọbụla abịaruo anụmanụ ọbụla nso dinakwuru ya inwe mmekọ, a ga-egbu nwanyị ahụ na anụmanụ ahụ, nʼihi na ha kwesiri ọnwụ. Ọbara ha ga-adị ha nʼisi.
Nxa owesifazane ehahabela isifuyo aphinge laso, mbulaleni owesifazane lowo kanye lesifuyo leso sibulawe. Kumele kubulawe kokubili ngoba konke kulomlandu.
17 “‘Nwoke ọbụla ya na nwanne ya nwanyị nwere mmekọ edina, maọbụ nwa afọ nne ya maọbụ nwa nwunye nna ya, a ga-ekpochapụ ha site nʼihu ọha mmadụ nʼihi na ọ bụ ihe ihere dị ukwuu ka ha mere. Ọ merụọla nwanne ya, nʼihi ya ikpe ọmụma dị ya nʼisi.
Nxa indoda ithatha udadewabo, indodakazi kayise loba ekanina balale bonke, kulihlazo. Kabaxotshwe kwabakibo. Isinqunule udadewabo ngakho isibelomlandu.
18 “‘Nwoke ọbụla nke ya na nwanyị nọ na nsọ nwanyị ya dinakọrọ nwee mmekọ ekpugheela adịghị ọcha nwanyị ahụ. Nwanyị ahụ nʼonwe ya ekpugheekwala adịghị ọcha nke ya. A ga-ebipụ ha abụọ site nʼetiti ndị ha.
Nxa indoda ilala lowesifazane esemfuleni, isinqunule umthombo walowomfula, lowesifazane lowo usewembulile. Bobabili kabaxotshwe ebantwini bakibo.
19 “‘Ị gaghị enwe mmekọ edina nʼetiti gị na nwanne nwanyị nne gị maọbụ nwanne nwanyị nna gị, nʼihi na nke a bụ ihe nleda anya nye onye ọbara jịkọrọ gị na ya. Ikpe ọmụma ga-adịrị unu abụọ.
Ungalali lodadewabo kanyoko loba okayihlo, ngoba kuyikunqunula isihlobo segazi. Lobabili lizakuba lomlandu.
20 “‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla na nwunye nwanne nna ya edinaa, ọ bụ omume ileda anya nye nwanne nna ya. Ha ga-ebu mmehie ha. Ha ga-anwụ na-amụtaghị nwa.
Nxa umuntu elala lomkamfowabo kayise, usenqunule umfowabo kayise. Balomlandu. Bazakufa bengelamntwana.
21 “‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwunye nwanne ya, ọ bụ omume rụrụ arụ, nʼihi na ọ bụ ihe nleda anya nye nwanne ya. Ha ga-agba aka nwa.
Nxa indoda ithatha umfazi womfowabo, lokho kuyisenzo sokungcola; usembule ubunqunu bomfowabo. Bazakufa bengelamntwana.
22 “‘Debenụ iwu ndị a na ụkpụrụ ndị a, ma gbasoonụ ha ka ala ahụ m na-eduba unu nʼime ya hapụ imeghe ọnụ ya gbụpụ unu.
Gcinani zonke izimiso zami lemithetho yami, liyilandele ukuze lelolizwe engililethe ukuba lihlale khona lingalikhafuli.
23 Unu agbasola omenaala ndị mba niile a m na-achụpụ site nʼala m na-enye unu, nʼihi na ha na-eme ihe ndị a niile m nyere unu nʼiwu emela. Ọ bụ nke a mere ihe banyere ha ji sọọ m oyi.
Lingabolandela amasiko ezizwe engizazixotsha phambi kwenu. Ngoba bazenza zonke lezizinto ngabenyanya.
24 Ma agwala m unu sị, “Unu ga-eketa ala ha. Aga m enye ya unu ka ọ bụrụ ihe nketa unu. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.” Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu onye kewapụtara unu doo unu iche site na mba ndị ọzọ niile.
Kodwa ngathi kini, “Lizalithumba ilizwe labo; ngizalipha lona libe yilifa lenu, ilizwe eligeleza uchago loluju.” Mina yimi uThixo uNkulunkulu wenu olenze lehluka kwabezizwe.
25 “‘Unu aghaghị ịkpa oke nʼetiti anụmanụ ndị dị ọcha iri eri, na anụmanụ ndị na-adịghị ọcha, na nʼetiti anụ ufe dị ọcha iri eri na ndị rụrụ arụ. Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ maọbụ anụ ufe, maọbụ ihe ọzọ na-akpụgharị nʼala, ndị ahụ m kewapụrụ iche dịka ihe rụrụ arụ.
Ngakho-ke kumele lazi umahluko phakathi kwezinyamazana ezihlanzekileyo lezingahlanzekanga; kanjalo lezinyoni. Lingazingcolisi ngezinyamazana loba ngezinyoni loba ngani ehuquzela phansi, lezo engiziphawule ngathi zingcolile kini.
26 Unu ga-adị nsọ nye m, nʼihi na mụ, bụ Onyenwe anyị, dị nsọ. Ekewapụtala m unu, doo unu iche, site nʼetiti ndị mba ọzọ niile, ka unu bụrụ nke m.
Kumele libengcwele kimi ngoba mina Thixo ngingcwele njalo ngilahlukanisile kwabezizwe ukuthi libe ngabami.
27 “‘A ga-eji nkume tugbuo nwoke maọbụ nwanyị ọbụla nke na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa nọ nʼetiti unu ka ọ nwụọ. Ọbara ha ga-adịkwa ha nʼisi.’”
Indoda loba umfazi ovumisayo loba oyisanuse phakathi kwenu, kabulawe. Bakhandeni ngamatshe. Yindaba yabo.’”

< Levitikọs 20 >