< Levitikọs 19 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
OLELO mai la hoi o Iehova ia Mose, i mai la,
2 “Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ.
E olelo aku oe i ke anaina a pau o na mamo a Iseraela, a e i aku ia lakou, I hemolele oukou; no ka mea, he hemolele no wau o Iehova ko oukou Akua.
3 “‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
E weliweli oukou kela kanaka keia kanaka i kona makuwahine a i kona makuakane, a e malama hoi i kuu mau Sabati: owau no Iehova ko oukou Akua.
4 “‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
Mai huli oukou ma na kii, aole hoi e hana i na akua i hooheheeia no oukou: owau no Iehova ko oukou Akua.
5 “‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.
A ina e kaumaha aku oukou i ka alana o na mohai hoomalu, ia Iehova, e kaumaha oukou ia na ko oukou makemake iho.
6 Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
E aiia ia i ka la i kaumaha ai oukou ia mea, a ia la aku hoi; a ina e koe kauwahi i ke kolu o ka la, e hoopauia ia i ke ahi.
7 Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.
A ina e ai iki ia ia i ke kolu o ka la, e hoowahawahaia ia, aole e maliuia.
8 Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
Nolaila, o ka mea e ai ia, e kau no kona hewa maluna ona, no kana hoino ana i ka mea hoano no Iehova: a e okiia'ku kela kanaka maiwaena aku o kona poe kanaka.
9 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.
Aia oki oukou i ka ai o ko oukou aina, mai oki loa i na kihi o kau mahinaai aole hoi oe e hoiliili i na haulena o kau ai.
10 A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
Mai ohi loa i ko kau malawaina, aole hoi oe e hoiliili i na huawaina a pau loa o kau malawaina; e waiho no oe ia mau mea na ka mea ilihune, a me ka malihini: owau no Iehova ko oukou Akua.
11 “‘Unu ezula ohi. “‘Unu aghala ụgha. “‘Unu aghọgbula ibe unu.
Mai aihue oukou, aole hoi e hookamani, aole hoi e hoopunipuni kekahi i kekahi.
12 “‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
Mai hoohiki oukou ma ko'u inoa me ka wahahee, aole hoi oe e hoino i ka inoa o kou Akua; owau no Iehova.
13 “‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.
Mai alunu oe i kou hoalauna, aole hoi oe e kaili wale: o ka uku o ka mea i hoolimalimaia, mai waiho pu me oe i ka po okoa a kakahiaka ae.
14 “‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.
Mai kuamuamu aku oe i ke kuli, aole hoi oe e waiho i ka mea e hina ai mamua o ka makapo, aka e makau oe i kou Akua; owau no Iehova.
15 “‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.
Mai hana ino oukou ma ka hoopai ana; mai manao oe i ke kino o ka mea ilihune, aole hoi e mahalo i ke kino o ka mea ikaika: aka ma ka pololei e hooponopono ai oe i kou hoalauna.
16 “‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị.
Mai hele oe io ia nei me he holoholo olelo la iwaena o kou poe kanaka; aole hoi oe e ku e i ke koko o kou hoalauna: owau no Iehova.
17 “‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
Mai inaina aku oe i kou hoahanau iloko o kou naau; e ao io aku no oe i kou hoalauna, aole hoi e waiho i ka hewa maluna ona.
18 “‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
Mai hoomaau, mai hoomauhala i na keiki o kou poe kanaka; aka e aloha oe i kou hoalauna e like me oe iho: owau no Iehova.
19 “‘Unu ga-edebe iwu m niile. “‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
E malama oukou i ko'u mau kanawai Mai kuu aku oe e hoohanau kau holoholona me ka holoholona ano okoa; aole hoi oe e lulu i kou mahinaai, me na hua ano elua; aole hoi e kau i ke kapa olona me ka hulu hipa i huiia, maluna ou.
20 “‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya.
O ka mea moe aku i ka wahine, he kauwawahine, i hoopalauia na ke kane, aole i ukupanaiia, aole i haawiia ia ia ke ku i ka wa; e uhauia'na; aole e hoomakeia laua, no ka mea, aole i kaawale ia wahine.
21 Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ.
A e lawe mai ua kanaka la i ka mohaihala ia Iehova, i ka puka o ka halelewa o ke anaina, he hipakane, i mohaihala.
22 Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya.
A e hana ke kahuna i kalahala nona me ka hipakane mohaihala, ma ke alo o Iehova, no kona hewa ana i hana'i; a e kalaia kona hewa ana i hana'i.
23 “‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.
A komo oukou i ka aina, a kanu i kela laau i keia laau i mea ai, alaila e kapa ae oukou i kona hua he okipoepoe ole ia; ekolu makahiki he okipoepoe ole ia ia ia oukou; aole e aiia.
24 Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto.
Aka i ka ha o ka makahiki, e hoano ko na hua a pau, i mea e hoolea ai ia Iehova.
25 Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
A i ka lima o ka makahiki, e ai oukou i kona hua, e haawi ai oia i kona hua ia oukou: owau no Iehova ko oukou Akua.
26 “‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
Mai ai oukou me ke koko: aole hoi e kuka-moo, aole hoi e nana-ao.
27 “‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
Mai hoopoepoe i na kihi o ko oukou mau poo, aole hoi oe e hoino i na kihi o kou umiumi.
28 “‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
Mai okioki i ko oukou io no ka mea make, aole hoi e kakau kaha ma ko oukou kino: owau no Iehova.
29 “‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.
Mai hoonoa i kau kaikamahine e hoolilo ia ia i hookamakama; o lilo ka aina i ka moe kolohe, a piha ae la ka aina i ka hewa.
30 “‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
E malama oukou i ko'u mau Sabati, a e mahalo i ko'u keenakapu: owau no Iehova.
31 “‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
Mai manao oukou i na mea ninau-uhane, aole hoi e imi aku i na kupua, e haumia ai oukou ia lakou: owau no Iehova ko oukou Akua.
32 “‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
Ma ke alo o ke poohina, e ku ae ai oe iluna, a e mahalo aku i ke alo o ka elemakule, a e weliweli i kou Akua: owau no Iehova.
33 “‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.
A ina e noho ka malihini me oe ma ko oukou aina, mai hooluhihewa ia ia.
34 Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
Aka o ka malihini e noho ana me oukou, e like auanei ia ia oukou me he kupa la i hanau iwaena o oukou, a e aloha oe ia ia e like me oe iho; no ka mea, he mau malihini no oukou ma ka aina o Aigupita: owau no Iehova ko oukou Akua.
35 “‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu,
Mai hana kekee oukou i ka hooponopono ana, ma ke ana ana, ma ka paona, a ma ke ana.
36 Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
E malama no oukou i paona pololei, i poka pono, i epa pono, i hina pono; owau no Iehova ko oukou Akua nana oukou i lawe mai, mailoko mai o ka aina o Aigupita.
37 “‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m Onyenwe anyị.’”
Nolaila, e malama oukou i ka'u mau kauoha a pau, a me ko'u mau kanawai a pau, a e hana ma ia mau mea; owau no Iehova.