< Levitikọs 19 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
The LORD spoke to Moses, saying,
2 “Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, dị nsọ.
"Speak to all the congregation of the children of Israel, and tell them, 'You shall be holy; for I the LORD your God am holy.
3 “‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
"'Each one of you shall respect his mother and his father. You shall keep my Sabbaths. I am the LORD your God.
4 “‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
"'Do not turn to idols, nor make molten gods for yourselves. I am the LORD your God.
5 “‘Mgbe unu ga-achụrụ Onyenwe anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya.
"'When you offer a sacrifice of peace offerings to the LORD, you shall offer it so that you may be accepted.
6 Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ.
It shall be eaten the same day you offer it, and on the next day: and if anything remains until the third day, it shall be burned with fire.
7 Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ.
If it is eaten at all on the third day, it is an abomination. It will not be accepted;
8 Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ Onyenwe anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya.
but everyone who eats it shall bear his iniquity, because he has profaned the holy thing of the LORD, and that soul shall be cut off from his people.
9 “‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala.
"'When you reap the harvest of your land, you shall not wholly reap the corners of your field, neither shall you gather the gleanings of your harvest.
10 A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
You shall not glean your vineyard, neither shall you gather the fallen grapes of your vineyard; you shall leave them for the poor and for the foreigner. I am the LORD your God.
11 “‘Unu ezula ohi. “‘Unu aghala ụgha. “‘Unu aghọgbula ibe unu.
"'You shall not steal; neither shall you deal falsely, nor lie to one another.
12 “‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha Onyenwe anyị Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
"'You shall not swear by my name falsely, and profane the name of your God. I am the LORD.
13 “‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya.
"'You shall not oppress your neighbor, nor rob him. The wages of a hired servant shall not remain with you all night until the morning.
14 “‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu Chineke. Abụ m Onyenwe anyị.
"'You shall not curse the deaf, nor put a stumbling block before the blind; but you shall fear your God. I am the LORD.
15 “‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ.
"'You shall do no injustice in judgment: you shall not be partial to the poor, nor show favoritism to the great; but you shall judge your neighbor in righteousness.
16 “‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị.
"'You shall not go up and down as a slanderer among your people; neither shall you stand against the life of your neighbor. I am the LORD.
17 “‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
"'You shall not hate your brother in your heart. You shall surely rebuke your neighbor, and not bear sin because of him.
18 “‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu.
"'You shall not take vengeance, nor bear any grudge against the children of your people; but you shall love your neighbor as yourself. I am the LORD.
19 “‘Unu ga-edebe iwu m niile. “‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.
"'You shall keep my statutes. "'You shall not crossbreed different kinds of animals. "'you shall not sow your field with two kinds of seed; "'neither shall there come upon you a garment made of two kinds of material.
20 “‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya.
"'If a man lies carnally with a woman who is a slave girl, pledged to be married to another man, and not ransomed, or given her freedom; they shall be punished. They shall not be put to death, because she was not free.
21 Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ.
He shall bring his trespass offering to the LORD, to the door of the Tent of Meeting, even a ram for a trespass offering.
22 Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya.
The priest shall make atonement for him with the ram of the trespass offering before the LORD for his sin which he has committed: and the sin which he has committed shall be forgiven him.
23 “‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha.
"'When you come into the land, and have planted all kinds of trees for food, then you shall count their fruit as forbidden. Three years shall they be forbidden to you. It shall not be eaten.
24 Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye Onyenwe anyị onyinye otuto.
But in the fourth year all its fruit shall be holy, for giving praise to the LORD.
25 Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
In the fifth year you shall eat its fruit, that it may yield its increase to you. I am the LORD your God.
26 “‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase.
"'You shall not eat any meat with the blood still in it; neither shall you practice divination, nor practice sorcery.
27 “‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu.
"'You shall not cut the hair on the sides of your heads, neither shall you clip off the edge of your beard.
28 “‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m Onyenwe anyị.
"'You shall not make any cuttings in your flesh for the dead, nor tattoo any marks on you. I am the LORD.
29 “‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche.
"'Do not profane your daughter, to make her a prostitute; lest the land fall to prostitution, and the land become full of wickedness.
30 “‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m Onyenwe anyị.
"'You shall keep my Sabbaths, and reverence my sanctuary; I am the LORD.
31 “‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
"'Do not turn to spirits of the dead, and do not inquire of familiar spirits, to be defiled by them. I am the LORD your God.
32 “‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu Chineke unu. Abụ m Onyenwe anyị.
"'You shall rise up before the gray head, and honor the face of an old man, and you shall fear your God. I am the LORD.
33 “‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya.
"'If a stranger lives as a foreigner with you in your land, you shall not do him wrong.
34 Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala Ijipt. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
The stranger who lives as a foreigner with you shall be to you as the native-born among you, and you shall love him as yourself; for you lived as foreigners in the land of Egypt. I am the LORD your God.
35 “‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu,
"'You shall do no unrighteousness in judgment, in measures of length, of weight, or of quantity.
36 Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.
You shall have just balances, just weights, a just ephah, and a just hin. I am the LORD your God, who brought you out of the land of Egypt.
37 “‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m Onyenwe anyị.’”
You shall observe all my statutes, and all my ordinances, and do them. I am the LORD.'"

< Levitikọs 19 >