< Levitikọs 18 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
And Jehovah speaketh unto Moses, saying,
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu ndị a sị ha, ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.
'Speak unto the sons of Israel, and thou hast said unto them, I [am] Jehovah your God;
3 Ya mere, ọ bụ ezie na unu ebiela nʼetiti ndị Ijipt, ma unu ekwesighị ibi ndụ unu dịka ha si ebi. Unu ekwesịkwaghị ibi ndụ dịka ndị Kenan ebe m na-akpọbata unu. Unu agbasola omenaala ha.
according to the work of the land of Egypt in which ye have dwelt ye do not, and according to the work of the land of Canaan whither I am bringing you in, ye do not, and in their statutes ye walk not.
4 Unu ga-edebe iwu m niile, gbasookwa ụkpụrụ m niile nʼihi na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.
'My judgments ye do, and My statutes ye keep, to walk in them; I [am] Jehovah your God;
5 Debenụ iwu m na ụkpụrụ m, nʼihi na onye na-edebe ha ga-adị ndụ site na ha. Abụ m Onyenwe anyị.
and ye have kept My statutes and My judgments which man doth and liveth in them; I [am] Jehovah.
6 “‘Onye ọbụla ya na mmadụ bụ nwanne e jekwurukwala ya ka ha nwe mmekọ edina, i ji kpughee ọtọ ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
'None of you unto any relation of his flesh doth draw near to uncover nakedness; I [am] Jehovah.
7 “‘Ị gaghị eleda nna gị anya site na i jekwuru nne gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nne gị ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe ụdị mmekọ dị otu a.
'The nakedness of thy father and the nakedness of thy mother thou dost not uncover, she [is] thy mother; thou dost not uncover her nakedness.
8 “‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nke a bụ ileda nna gị anya.
'The nakedness of the wife of thy father thou dost not uncover; it [is] the nakedness of thy father.
9 “‘Ị gaghị e jekwuru nwanne gị nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, maọbụ nwa nwanyị nke a mụụrụ nna gị, maọbụ nwa nwanyị nke nne gị mụrụ, ma a mụrụ ya nʼụlọ ma a mụrụ nʼama.
'The nakedness of thy sister, daughter of thy father, or daughter of thy mother, born at home or born without; thou dost not uncover their nakedness.
10 “‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nke nwa gị nwoke mụrụ, maọbụ nwa nwanyị nke nwa gị nwanyị mụrụ i nwe mmekọ edina; nʼihi na nke a ga-eweta nleda anya nye gị.
'The nakedness of thy son's daughter, or of thy daughter's daughter: thou dost not uncover their nakedness; for theirs [is] thy nakedness.
11 “‘Ị gaghị e jekwuru nwa nwanyị nwunye nna gị mụrụ, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọ bụ nwa nna gị mụrụ; nwanne gị nwanyị ka ọ bụ.
'The nakedness of a daughter of thy father's wife, begotten of thy father, she [is] thy sister; thou dost not uncover her nakedness.
12 “‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nwanyị nna gị ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nna gị, ha bụ otu ahụ.
'The nakedness of a sister of thy father thou dost not uncover; she [is] a relation of thy father.
13 “‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ.
'The nakedness of thy mother's sister thou dost not uncover; for she [is] thy mother's relation.
14 “‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ.
'The nakedness of thy father's brother thou dost not uncover; unto his wife thou dost not draw near; she [is] thine aunt.
15 “‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya.
'The nakedness of thy daughter-in-law thou dost not uncover; she [is] thy son's wife; thou dost not uncover her nakedness.
16 “‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke.
'The nakedness of thy brother's wife thou dost not uncover; it [is] thy brother's nakedness.
17 “‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ.
'The nakedness of a woman and her daughter thou dost not uncover; her son's daughter, and her daughter's daughter thou dost not take to uncover her nakedness; they [are] her relations; it [is] wickedness.
18 “‘Ị gaghị alụ nwanne nwanyị nwunye gị, dịka nwunye ọzọ gị, nʼihi ịkpagbu ya, gị na ya a na-enwe mmekọrịta edina, ị na-ekpughe ọtọ nwunye gị mgbe ọ ka dị ndụ.
'And a woman unto another thou dost not take, to be an adversary, to uncover her nakedness beside her, in her life.
19 “‘E jekwurukwala nwanyị ka gị na ya nwe mmekọ edina, mgbe ọ nọ nʼọnọdụ adịghị ọcha nke (ịsọ ụba) nsọ nwanyị ya nʼoge a kara aka.
'And unto a woman in the separation of her uncleanness thou dost not draw near to uncover her nakedness.
20 “‘A kpọrọkwala nwunye onye agbataobi gị idina ya, si otu a merụọ onwe gị nʼihi mmekọ dị otu a.
'And unto the wife of thy fellow thou dost not give thy seed of copulation, for uncleanness with her.
21 “‘Ị gaghị enye nwa gị ka e jiri ya chụọrọ Molek aja. Nʼihi na i kwesighị imerụ aha Chineke gị. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.
'And of thy seed thou dost not give to pass over to the Molech; nor dost thou pollute the name of thy God; I [am] Jehovah.
22 “‘Gị na nwoke edinala, dịka nwanyị na nwoke si edina. Ihe akpọrọ asị ka ọ bụ.
'And with a male thou dost not lie as one lieth with a woman; abomination it [is].
23 “‘Gị na anụmanụ ọbụla edinakwala, site otu a merụọ onwe gị. Nwanyị agakwaghị ewere onwe ya nye ka ya na oke anụmanụ nwee mmekọrịta, arụ a na-adịghị eme eme ka ọ bụ.
'And with any beast thou dost not give thy copulation, for uncleanness with it; and a woman doth not stand before a beast to lie down with it; confusion it [is].
24 “‘Unu emerụkwala onwe unu site na-ime ihe ndị a, nʼihi na ihe ndị a bụ ihe mba ndị ahụ na-eme. Ọ bụkwa nʼihi ya ka m ga-eji chụpụ ha site nʼala ahụ m ga-enye unu.
'Ye are not defiled with all these, for with all these have the nations been defiled which I am sending away from before you;
25 Ọ bụladị ala ahụ niile ghọrọ ihe rụrụ arụ site nʼomume ndị a. Ọ bụ nke a mere m ji ata ndị bi nʼime ya ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ala ahụ meghere ọnụ ya gbọpụta ndị bi nʼime ya.
and the land is defiled, and I charge its iniquity upon it, and the land vomiteth out its inhabitants:
26 Unu ga-edebe iwu m na ụkpụrụ m ndị a niile. Unu emekwala ihe arụ ndị a, ma ndị amụrụ nʼala ma ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu.
and ye — ye have kept My statutes and My judgments, and do not [any] of all these abominations, the native and the sojourner who is sojourning in your midst,
27 Ala m na-aga inye unu rụrụ arụ nʼihi na ndị bi nʼime ya na-eme omume ndị a rụrụ arụ.
(for all these abominations have the men of the land done who [are] before you, and the land is defiled),
28 Unu emekwala ihe arụ ndị a, nʼihi na ọ bụrụ na unu emee ha, ọ ga-emeghe ọnụ ya gbọpụta unu, dịka o si mee mba niile bụ ndị buru unu ụzọ biri nʼime ya.
and the land doth not vomit you out in your defiling it, as it hath vomited out the nation which [is] before you;
29 “‘Onye ọbụla nʼetiti unu mere ihe arụ ndị a, ka a ga-ekewapụ site nʼetiti ndị ya.
for any one who doth [any] of all these abominations — even the persons who are doing [so], have been cut off from the midst of their people;
30 Nʼihi ya, lezienụ anya ka unu debe iwu m, ka unu ghara ime ihe arụ ndị a, nke ndị buru unu ụzọ biri nʼala ahụ mere. Ka unu gharakwa imerụ onwe unu site nʼomume arụ ndị a. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’”
and ye have kept My charge, so as not to do [any] of the abominable statutes which have been done before you, and ye do not defile yourselves with them; I [am] Jehovah your God.'

< Levitikọs 18 >