< Levitikọs 17 >

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
Yawe alobaki na Moyize:
2 “Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
« Yebisa Aron, bana na ye ya mibali mpe bana nyonso ya Isalaele, mpe loba na bango: ‹ Tala maloba oyo Yawe alobi:
3 Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi, maọbụ nʼazụ ebe obibi,
‘Moto nyonso kati na bana ya Isalaele, oyo akokata kingo ya ngombe, ya meme to ya ntaba, ezala kati na molako to na libanda ya molako;
4 ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya.
mpe amemi yango te na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani mpo na kobonza yango lokola likabo epai na Yawe liboso ya Mongombo ya Yawe, makila na yango ekotangama na moto ya moto yango. Lokola asopi makila, bakolongola ye kati na bato na ye.
5 Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara Onyenwe anyị aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya Onyenwe anyị site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo.
Boye, na esika ete bana ya Isalaele bamemaka bambeka na bango na bilanga, bakomema yango mpo na Yawe epai ya Nganga-Nzambe, na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani lokola mbeka ya boyokani epai na Yawe.
6 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
Nganga-Nzambe akobwaka makila na etumbelo ya Yawe, na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani mpe akotumba mafuta na yango lokola mbeka oyo solo kitoko na yango ekosepelisa Yawe.
7 O kwesikwaghị ka ndị Izrel chụọ aja ha ọzọ na mbara ezi nye arụsị ewu ndị ha na-akpọ isiala nye. Iwu a ga-adịgide nye ha na ụmụ ha niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.’
Bana ya Isalaele bakobonza lisusu te bambeka na bango epai banzambe ya bikeko ya bantaba ya mibali, oyo basambelaka. Oyo ekozala malako ya libela mpo na bango mpe mpo na milongo oyo ekoya.’ ›
8 “Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ,
Loba na bango: ‹ Moto nyonso ya Isalaele to mopaya nyonso oyo azali kati na bango, oyo akobonza mbeka ya kotumba to mbeka mosusu,
9 ma o webataghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebe a ga-achụrụ ya Onyenwe anyị, ka a ga-ewezuga site nʼetiti ndị ya.
na kozanga komema yango na ekotelo ya Ndako ya kapo ya Bokutani mpo na kobonza yango epai ya Yawe, bakolongola ye kati na bato ya Isalaele.
10 “‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m.
Nakobalukela mpe nakolongola kati na bato na ye, moto nyonso oyo akolia makila, azala moto ya Isalaele to mopaya nyonso oyo avandi kati na bango;
11 Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.
pamba te bomoi ya ekelamu nyonso ezali kati na makila. Napesi bino yango mpo ete bosala na yango mosala ya bolimbisi masumu mpo na bomoi na bino, na etumbelo. Lokola bomoi ya moto ezali kati na makila, yango wana makila esalaka mosala ya bolimbisi masumu.
12 Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.”
Boye, nalobaki na bana ya Isalaele: ‘Moto moko te mpe mopaya moko te kati na bino akoki kolia makila.’
13 “‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya.
Moto nyonso kati na bana ya Isalaele to mopaya oyo avandi kati na bango, oyo akokende bokila mpe akokanga nyama ya zamba to ndeke oyo baliaka, asengeli kosopa makila na yango mpe kozipa yango na mabele, pamba te bomoi ya ekelamu nyonso ezali kati na makila na yango.
14 Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m.
Yango wana, nalobaki na bana ya Isalaele: ‘Bokoki kolia makila ya ekelamu ata moko te, pamba te bomoi ya ekelamu nyonso ezali kati na makila na yango. Moto oyo akolia yango, bakolongola ye kati na bato.’
15 “‘Mmadụ ọbụla, maọbụ nwa afọ ma ọ bụkwanụ onye ọbịa, nke riri anụ nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, ga-eji mmiri saa uwe ya na ahụ ya, ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi tupu ọ dị ọcha ọzọ.
Moto nyonso, azala mwana mboka to mopaya, oyo akolia mosuni ya nyama oyo ekufi yango moko to oyo babomi na nyama ya zamba, akosukola bilamba na ye mpe nzoto na ye na mayi. Akozala mbindo kino na pokwa, sima na yango akokoma peto.
16 Ma ọ bụrụ na ọ saghị uwe ya na ahụ ya, ikpe ọmụma dị ya nʼisi.’”
Kasi soki asukoli bilamba mpe nzoto na ye te, akomema ngambo. › »

< Levitikọs 17 >