< Levitikọs 17 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
Господ говори още на Моисея, казвайки:
2 “Gwa Erọn, na ụmụ ya ndị ikom, na ụmụ Izrel niile okwu sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
Говори на Аарона и на синовете му и на всичките израилтяни, като им кажеш: Ето какво заповяда Господ, като рече:
3 Onye ọbụla bụ onye ụlọ Izrel gbuo ehi, maọbụ nwa atụrụ, maọbụ ewu nʼogige ebe obibi, maọbụ nʼazụ ebe obibi,
Всеки човек от Израилевия дом, който заколи говедо, агне, или коза в стана, или който заколи вън от стана,
4 ma o wetaghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute iche ya dịka onyinye nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị, a ga-agụ onye ahụ dịka onye ikpe iwufu ọbara mara. Ọ wụfuola ọbara, nʼihi ya, a ga-esite nʼetiti ndị ya kewapụ ya.
без да го е привел до входа на шатъра за срещане, за да го принесе Господу пред Господната скиния, той ще се счете виновен за кръв; кръв е пролял; тоя човек ще се изтреби изсред людете си;
5 Ihe e ji nye iwu a bụ ka ụmụ Izrel wetara Onyenwe anyị aja niile ha na-achụ ugbu a na mbara ezi ọbụla. Ha kwesiri iwetara ya Onyenwe anyị site nʼaka onye nchụaja nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka o jiri ya chụọrọ ha aja udo.
с цел израилтяните да довеждат жертвите, които колят на полето и да ги принасят Господу до входа на шатъра за срещане, при свещеника, та да ги колят за примирителни жертви Господу.
6 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-efesa ọbara ahụ nʼebe ịchụ aja dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, kpọọkwa abụba ya ọkụ, ka ọ bụrụ aja nsure ọkụ nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
И свещеникът да поръси с кръвта Господния олтар при входа на шатъра за срещане и да изгори тлъстината за благоухание Господу.
7 O kwesikwaghị ka ndị Izrel chụọ aja ha ọzọ na mbara ezi nye arụsị ewu ndị ha na-akpọ isiala nye. Iwu a ga-adịgide nye ha na ụmụ ha niile, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.’
Да не принасят вече жертвите си на бесовете, след като те блудствуват; това да им бъде вечен закон във всичките им поколения.
8 “Gwa ha, ‘Onye Izrel ọbụla, maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu, nke ga-achụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ọzọ,
Кожи им още: Който човек от Израилевия дом, или от заселените между тях пришелци, принесе всеизгаряне или жертва,
9 ma o webataghị ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, ebe a ga-achụrụ ya Onyenwe anyị, ka a ga-ewezuga site nʼetiti ndị ya.
без да я приведе до входа на шатъра за срещане, за да я принесе Господу, тоя човек ще се изтреби измежду людете си.
10 “‘Onye Izrel ọbụla maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti ha, nke riri ọbara ọbụla ka m ga-eche ihu m megide. A ga-ewezuga ya site nʼetiti ndị m.
Ако някой от Израилевия дом, или от заселените между тях пришелци, яде каква да е кръв, ще насоча лицето Си против оня човек, който яде кръвта, и ще го изтребя изсред людете му.
11 Nʼihi na ndụ ihe nwere ndụ dị nʼọbara ya, ọ bụ nʼihi nke a ka m ji nye iwu na a ga-awụsa ọbara niile nʼelu ebe ịchụ aja, maka iji ya kpuchie mmehie unu. Ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie maka ndụ mmadụ.
Защото живота на тялото е в кръвта, която Аз ви дадох да правите умилостивение на олтара за душите си; защото кръвта е, която, по силата на живота, който е в нея, прави умилостивение.
12 Nʼihi nke a, a sịrị ndị Izrel, “Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu, maọbụ onye ọbịa ọbụla nke bi nʼetiti unu ga-eri ọbara.”
За това казах на израилтяните: Ни един човек от вас да не яде кръв, и пришелецът, който е заселен между вас, да не яде кръв.
13 “‘Onye Izrel ọbụla, na onye ọbịa ọbụla binyere unu nke gara ịchụ nta, gbuo anụ maọbụ nnụnụ ọbụla a na-eri eri, ga-awụfu ọbara ya were aja kpuchie ya.
И ако някой от израилтяните, или от заселените между тях пришелци, отиде на лов и улови животно или птица, що бива да се яде, нека излее кръвта й, па да я покрие с пръст.
14 Nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara. Ọ bụ ya mere m ji nye ụmụ Izrel iwu si unu erila ọbara anụmanụ ọbụla, nʼihi na ndụ ihe niile nwere ndụ dị nʼọbara ya. Nʼihi ya onye ọbụla riri ọbara, a ga-ekewapụ ya site nʼetiti ndị m.
Защото, колкото за живота на всяка твар, кръвта й - тя е животът й; за това казах на израилтяните: Да не ядете кръвта на никаква твар, защото животът на всяка твар е кръвта й; всеки, който я яде, ще се изтреби.
15 “‘Mmadụ ọbụla, maọbụ nwa afọ ma ọ bụkwanụ onye ọbịa, nke riri anụ nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, ga-eji mmiri saa uwe ya na ahụ ya, ọ ga-abụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi tupu ọ dị ọcha ọzọ.
И всеки човек, който яде мърша или разкъсано от звяр, бил той туземец или пришелец, нека изпере дрехите си и да се окъпе във вода, и ще бъде нечист до вечерта: а след това да бъде чист.
16 Ma ọ bụrụ na ọ saghị uwe ya na ahụ ya, ikpe ọmụma dị ya nʼisi.’”
И ако не ги изпере и не окъпе тялото си, тогава ще носи беззаконието си.