< Levitikọs 11 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn, sị,
Jehovha akati kuna Mozisi naAroni,
2 “Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri.
“Taurai kuvaIsraeri muti, ‘Pamhuka dzose dzinofamba panyika, idzi ndidzo dzamunogona kudya:
3 Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ.
Munogona kudya mhuka ipi zvayo ina mahwanda, akapararana zvachose, uye inozeya zvokudya.
4 “‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
“‘Asi kune dzimwe dzinongozeya kudya chete, kana kuti dzimwe dzine mahwanda akaparadzana chete, idzi hamufaniri kudzidya. Ngamera, kunyange ichizeya zvokudya, haina mahwanda akapatsanuka; haina kuchena kwamuri.
5 Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
Mbira kunyange ichizeya zvokudya, haina mahwanda akapatsanuka, haina kuchena kwamuri.
6 Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
Tsuro kunyange ichizeya zvokudya, haina mahwanda akapatsanuka, haina kuchena kwamuri.
7 Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
Nguruve kunyange ine mahwanda akanyatsopatsanuka, haizeyi zvokudya, haina kuchena kwamuri.
8 Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
Hamufaniri kudya nyama yazvo kana kubata zvitunha zvazvo; hazvina kuchena kwamuri.
9 “‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.
“‘Pazvisikwa zvose zvinogara mumvura yamakungwa nenzizi, munogona kudya dzose dzine zvimbi namakwati.
10 Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.
Asi zvipuka zvose zvomugungwa kana munzizi zvisina zvimbi namakwati, kunyange pakati pezvinouya samatutu kana pakati pezvose zvisikwa zvinorarama mumvura, zvinonyangadza kwamuri.
11 Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.
Uye sezvo zvichinyangadza kwamuri hamufaniri kudya nyama yazvo uye munofanira kusema zvitunha zvazvo.
12 Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ.
Chose chinhu chinorarama mumvura chisina zvimbi namakwati chinonyangadza kwamuri.
13 “‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,
“‘Idzi ndidzo shiri dzamunofanira kusema, uye musadzidya nokuti dzinonyangadza kwamuri: gondo, gora, chapungu,
14 ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche,
njerere, marudzi ose oruvangu rutema,
15 ugolọma ọbụla dị iche iche,
marudzi ose amakunguo,
16 enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche,
marudzi ose amazizi, shiri yegungwa namarudzi ose oruvangu,
17 okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu,
nezizi duku, nekanyururahove, nezizi guru,
18 okwukwu nwere mpi, okwolo na udele,
nejichidza, nekondo, negora,
19 ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ.
neshuramurove, namarudzi ose ekondo, nemhupupu nechiremwaremwa.
20 “‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya.
“‘Zvose zvipukanana zvinobhururuka, zvinofamba namakumbo mana zvinonyangadza kwamuri.
21 Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
Kunyange zvakadaro, kunewo zvimwe zvipuka zvine mapapiro zvinofamba namakumbo mana zvamunogona kudya, izvo zvine makumbo akabatanidzwa okukwakuka nawo.
22 ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.
Pakati pezvizvi munogona kudya marudzi ose emhashu, namarudzi ose amakurwe namarudzi ebambamukota.
23 Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
Asi zvimwe zvose zvipukanana zvine mapapiro zvine makumbo mana munofanira kuzvisema.
24 “‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ.
“‘Musazvisvibisa nezvizvi; ani naani anobata zvitunha zvazvo achava akasviba kusvikira manheru.
25 Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
Ani naani achanhonga chimwe chezvitunha zvazvo anofanira kusuka nguo dzake uye achava akasviba kusvikira manheru.
26 “‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
“‘Mhuka yose yose ina mahwanda akapararana asi asina kunyatsopararana, isingazeyi kudya, haina kuchena kwamuri; ani naani anobata chitunha chayo achava asina kuchena.
27 Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Pamhuka dzose dzinofamba namakumbo mana, idzo dzine tsoka dzakafara hadzina kuchena kwamuri; ani naani anobata chitunha chadzo achava akasviba kusvikira manheru.
28 Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
Ani naani achanhonga zvitunha zvadzo anofanira kusuka nguo dzake uye achava akasviba kusvikira manheru. Hadzina kuchena kwamuri.
29 “‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
“‘Pamhuka dzinokambaira panyika, idzi hadzina kuchena kwamuri: chidembo, gonzo, namarudzi ose egwavava,
30 na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
chifurira, namarudzi ose amadzvinyu, dhambakura nerwaivhi.
31 Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
Pane zvose zvinokambaira panyika, izvi hazvina kuchena kwamuri. Asi ani naani anozvibata kana zvafa achava akasviba kusvikira manheru.
32 Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
Kana chimwe chazvo chikafa, chikawira pamusoro pechimwe chinhu, chinhu ichocho hazvinei kuti chinoshandiswei, chinova chisina kuchena kunyange chakagadzirwa nomuti, mucheka, dehwe, kana saga. Chiisei mumvura; chichava chisina kuchena kusvikira manheru, uye ipapo chichava chakachena.
33 Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.
Kana chimwe chazvo chikawira muhari yevhu, zvose zviri mairi zvichava zvisina kuchena, uye munofanira kuputsa hari yacho.
34 Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ.
Chokudya chipi zvacho chinogona kudyiwa, asi chine mvura pachiri, yabva muhari iyoyo chichava chisina kuchena uye kana chipi zvacho chinganwiwa kubva imomo hachina kuchena.
35 Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
Chose chinhu chinowirwa nechitunha chazvo chinova chisina kuchena; choto kana hari yokubikira zvinofanira kuputswa. Hazvina kuchena uye munofanira kuzvibata sezvisina kuchena.
36 Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
Asi chitubu, kana tsime rokuchera mvura zvinoramba zvakachena, asi ani naani anobata chimwe chezvitunha izvi achava asina kuchena.
37 Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha.
Kana chitunha chikawira pambeu ipi zvayo inofanira kudyarwa, inoramba yakachena.
38 Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
Asi kana mvura yaiswa pambeu, uye chitunha chikawira pairi, inova isina kuchena kwamuri.
39 “‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
“‘Kana mhuka yamunobvumirwa kudya ikafa yoga, munhu wose achabata mutumbi wayo achava asina kuchena kusvikira manheru.
40 Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri.
Munhu wose achadya imwe nyama yacho anofanira kusuka nguo dzake agova asina kuchena kusvikira manheru.
41 “‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.
“‘Chisikwa chose chinokambaira panyika chinonyangadza, hachifaniri kudyiwa.
42 Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.
Hamufaniri kudya chisikwa chipi zvacho chinokambaira panyika, chingava chinofamba nedumbu kana chinofamba namakumbo mana kana namakumbo akawanda, chinonyangadza.
43 Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha.
Musazvisvibisa nechimwe chezvisikwa izvi. Musazvisvibisa nazvo kana nokuda kwazvo.
44 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
Ndini Jehovha Mwari wenyu, zvitsaurei mugova vatsvene, nokuti ndiri mutsvene. Musazvisvibisa nechipuka chipi zvacho chinofamba-famba pasi.
45 Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.
Ndini Jehovha akakubudisai muIjipiti kuti ndive Mwari wenyu; saka ivai vatsvene nokuti ndiri mutsvene.
46 “‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala.
“‘Ndiyo mitemo iri maererano nemhuka, shiri, zvipenyu zvose zvinofamba mumvura nezvipuka zvose zvinofamba panyika.
47 Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’”
Munofanira kuisa mutsauko pakati pezvisina kuchena nezvakachena, pakati pezvisikwa zvipenyu zvinogona kudyiwa nezvisingagoni kudyiwa.’”