< Levitikọs 11 >
1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn, sị,
Jahve reče Mojsiju i Aronu:
2 “Gwanụ ụmụ Izrel, sị, ‘Nʼime anụmanụ niile dị nʼụwa, ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri.
“Ovako kažite Izraelcima: 'Ovo su životinje koje između svih četveronožaca na zemlji možete jesti:
3 Unu nwere ike iri anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa. nke na-atagharị ọnụ.
svaku koja ima papke, ali papke razdvojene, i koja preživa možete jesti.
4 “‘Ma ọ dị ụfọdụ ndị na-atagharị nri maọbụ ndị nwere naanị ụkwụ wara njakpa, unu agaghị eri anụ ha. Ha bụ ịnyịnya kamel, ọ bụ ezie na ọ na-atagharị nri, ma ụkwụ ya awaghị njakpa. Unu agaghị eri ha nʼihi na ọ bụ anụ na-adịghị ọcha.
Ali ove, iako preživaju ili papke imaju, ne smijete jesti: devu, jer iako preživa, razdvojena papka nema - za vas je nečista;
5 Ewi: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
svisca, jer iako preživa, razdvojena papka nema - za vas je nečist;
6 Ewi nkume: Ọ na-atagharị nri ya, ma o nweghị ụkwụ wara njakpa. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
arnebeta, iako preživa, razdvojena papka nema - za vas je nečist.
7 Ezi: Ọ bụ nʼezie na ụkwụ ya wara njakpa ma ọ dịghị atagharị nri ya. Ọ bụ anụ na-adịghị ọcha nye unu.
A svinja, iako ima papak, i to papak razdvojen, ne preživa - za vas je nečista.
8 Unu emetụkwala ozu ha aka maọbụ rie anụ ha, nʼihi na ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
Njihova mesa nemojte jesti niti se njihove strvine doticati - za vas su one nečiste.'”
9 “‘Nʼime ihe niile e kere eke dị ndụ biri na mmiri, maọbụ nʼiyi nta na nʼoke osimiri, unu nwere ike iri ụdị ọbụla nwere ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha.
Od svih vodenih životinja ove možete jesti: sve što živi u vodi, bilo u morima, bilo u rijekama, a ima peraje i ljuske možete jesti.
10 Ma unu ekwesighị iri ihe ọbụla nke na-enweghị ntu maọbụ akpịrịkpa, ma ha bụ anụ na-enupụta enupụta, maọbụ na ha so nʼanụ ndị ọzọ dị ndụ bi na mmiri, unu kwesiri ịsọ ha asọ.
A što u morima i rijekama nema peraja i ljusaka - sve životinjice u vodi, sva živa vodena bića - neka su vam odvratna
11 Ebe ha bụ ihe na-asọ oyi nye unu, unu ekwesighị iri ha, unu ga-agụkwa ozu ha ka ihe na-adịghị ọcha.
i odvratna neka vam ostanu! Mesa od njih nemojte jesti, a njihove strvine držite za odvratnost.
12 Ihe ọbụla bi nʼime mmiri nke na-enweghị ntu na akpịrịkpa nʼahụ ha, bụ nke unu ga-asọ asọ.
Sve, dakle, što je u vodi a nema peraja i ljusaka neka je za vas odvratno.”
13 “‘Ndị a bụ nnụnụ ndị unu ga-asọ asọ, nke unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha bụ ihe arụ a na-asọ oyi: ugo, udele na udele ojii,
“Od ptica neka su vam ove odvratne i neka se ne jedu - odvratnost su: orao, orao strvinar i jastreb,
14 ndagbụ na ọgankwọ dị iche iche,
tetrijeb i sokol bilo koje vrste;
15 ugolọma ọbụla dị iche iche,
gavran svih vrsta;
16 enyi nnụnụ, egbe abalị, nnụnụ oke osimiri na egbe dị iche iche,
noj, kobac i galeb; lastavica svake vrste;
17 okwukwu nta, komorant na okwukwu ukwu,
sova, gnjurac, ušara,
18 okwukwu nwere mpi, okwolo na udele,
labud, pelikan, droplja;
19 ụgbala, utù dị iche iche, nnụnụ ọdụ nta na ụsụ.
roda, čaplja svake vrste; pupavac i šišmiš.”
20 “‘Ụmụ ahụhụ niile na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ bụ ihe rụrụ arụ nye unu, unu agaghị eri ya.
“Svi krilati kukci što hodaju četveronoške neka su vam odvratni!
21 Ma e nwere ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-efe efe nke na-aga ije nʼụkwụ anọ ndị unu nwere ike iri: ndị a bụ ndị nwere ogwe ụkwụ nke ha ji na-awụ awụ nʼala,
Od svih tih krilatih kukaca što hodaju četveronoške možete jesti samo one koji imaju na svojim nožicama listove za skakutanje po zemlji.
22 ndị a ka unu ga-eri nʼetiti ha, igurube dị iche iche, na akpankwụ dị iche iche, na abụzụ dị iche iche, na ụkpana dị iche iche.
Od njih možete jesti: svaku vrstu skakavaca, cvrčaka i zrikavaca.
23 Ahụhụ ndị ọzọ niile na-efe efe, ndị nwere ụkwụ anọ, bụ ihe rụrụ arụ. Unu ekwesighị iri ha.
A svi drugi krilati kukci na četiri nožice neka su vam odvratni!
24 “‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ.
I od njih ćete se onečistiti: tko se god dotakne njihove crkotine, neka je nečist do večeri;
25 Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi.
tko god ponese crkotinu bilo koje od njih, neka opere svoju odjeću i nečistim se smatra do večeri;
26 “‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
i životinje s nerazdvojenim papkom što ne preživaju za vas su nečiste, i tko ih se dotakne neka je nečist!
27 Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Onda, četveronožne životinje koje hodaju na četiri šape za vas su nečiste. Tko se dotakne njihova strva, neka je nečist do večeri.
28 Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
A onaj koji ponese njihov strv, neka opere svoju odjeću i bude nečist do večeri. Za vas su one nečiste.”
29 “‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị,
“Od životinja što po zemlji gmižu neka su za vas ove nečiste: krtica, miš i svaka vrsta guštera;
30 na ọba mmiri, na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
zidni macaklin, kameleon, daždevnjak, zelembać i tinšamet.
31 Nʼime ihe niile na-enupụta enupụta nʼala ndị a rụrụ arụ nʼebe unu nọ. Onye metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ tutu ruo uhuruchi ụbọchị ahụ.
Te su životinje od svih što gmižu za vas nečiste. Tko ih se mrtvih dotakne neka je nečist do večeri.
32 Ihe ọbụla nke ozu ha dakwasịrị ga-abụ ihe rụrụ arụ, maọbụ osisi, maọbụ akwa, maọbụ akpụkpọ a na-akwa nʼala, maọbụ akpa, ihe ọbụla nke eji ya eme. A ga-etinye ya na mmiri, ọ ga-adịgide nʼime mmiri tutu ruo uhuruchi, mgbe ahụ ka ọ ga-adị ọcha.
A na što koja od njih mrtva padne, neka je onečišćeno: bio to kakav drveni predmet ili odjeća, koža ili vreća. Svaki takav predmet koji se upotrebljava neka se zamoči u vodu i ostane nečist do večeri. Onda će postati čist.
33 Ọ bụrụ na otu nʼime ihe ndị a adanye nʼite aja, a ga-etiwa ite ahụ. Ihe niile dị nʼite ahụ abụrụla ihe rụrụ arụ.
Upadne li što od njih u kakvu zemljanu posudu, razbijte je; sve je u njoj onečišćeno.
34 Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ.
A bilo kakva hrana što se jede, ako na nju kapne voda iz te posude, bit će onečišćena. Svaka tekućina što se pije u svakoj takvoj posudi neka se smatra nečistom.
35 Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ.
A sve na što padne bilo što od njihove crkotine neka je nečisto; bude li to peć ili ognjište, neka se sruše: onečišćeni su za vas i neka nečisti budu.
36 Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
A vrelo ili čatrnja koja drži vodu neka se smatraju čistima. Ali tko dirne strvinu životinje neka je nečist.
37 Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha.
Ako što od njihova strva padne na žitno sjemenje što će se sijati, ono ostaje čisto;
38 Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
ali ako se sjemenje nakvasi vodom, a onda na nj padne što od njihove crkotine, neka je za vas nečisto.
39 “‘Ọ bụrụ na anụmanụ unu kwesiri iri eri anwụọ, onye ahụ metụrụ ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi.
Ako ugine koja životinja što vam služi za hranu, onaj koji dotakne njezinu strvinu neka je nečist do večeri;
40 Onye ọbụla riri ozu anụ ahụ, maọbụ bufuo ozu ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. Ọ ga-asa uwe ya mmiri.
a koji pojede od njezine strvine neka opere svoju odjeću i bude nečist do večeri; koji ponese njezinu strvinu neka opere svoju odjeću i bude nečist do večeri.
41 “‘Anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala bụ ihe rụrụ arụ nye unu. Unu erikwala ha.
Svaka životinja što po tlu gmiže odvratna je. Neka se ne jede!
42 Unu agaghị eri anụmanụ ọbụla na-akpụgharị nʼala, ma ha na-akpụgharị nʼafọ ha, ma ha na-agagharị nʼụkwụ anọ, ma ha nwere ụkwụ dị ọtụtụ. Ha bụ ihe rụrụ arụ.
Ništa što puže na trbuhu, ništa što god ide na četiri noge ili na više nogu - nikakve puzavce što po tlu gmižu nemojte jesti jer su odvratni!
43 Unu emerụla onwe unu site nʼiri anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala. Unu abụla ndị na-emerụ onwe unu site nʼanụmanụ ndị a, maọbụ mee ka unu bụrụ ndị e merụrụ site na ha.
Nemojte sami sebe poganiti svim tim puzavcima što gmižu; ne prljajte se njima, da i vi zbog njih ne postanete nečisti.
44 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu. Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na adị m nsọ. Unu emerụla onwe unu site nʼimetụ anụmanụ ndị a na-akpụgharị nʼala aka.
Ta ja - Jahve - Bog sam vaš! Posvećujte se, dakle, da sveti budete, jer svet sam ja! Nijednim se puzavcem što po tlu gmiže ne prljajte!
45 Abụ m Onyenwe anyị, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu, ka m bụrụ Chineke unu. Unu aghaghị ịdị nsọ, nʼihi na adị m nsọ.
Jest, ja sam Jahve; izveo sam vas iz zemlje egipatske da vam budem Bog. Budite, dakle, sveti jer sam svet ja!”
46 “‘Ndị a bụ usoro iwu metụtara ụmụ anụmanụ, na anụ ufe, na anụ bi na mmiri, na anụ ndị na-arịgharị arịgharị nʼala.
To je odredba koja se odnosi na ptice i sva živa bića što se u vodi kreću i na sve stvorove koji po zemlji gmižu.
47 Ka unu si otu a kpaa oke nʼetiti ndị rụrụ arụ na ndị dị ọcha, nʼetiti ihe e kere eke dị ndụ ndị unu nwere ike iri nʼihi na ha dị ọcha, na ndị unu na-ekwesighị iri nʼihi na ha rụrụ arụ.’”
Svrha joj je da se razlikuje nečisto od čistoga; životinja koja se može jesti od životinje koja se ne smije jesti.