< Levitikọs 1 >

1 Onyenwe anyị sitere nʼụlọ nzute ahụ kpọ Mosis oku, gwa ya sị,
ויקרא אל משה וידבר יהוה אליו מאהל מועד לאמר
2 “Gwa ụmụ Izrel sị, ‘Mgbe onye ọbụla nʼime unu wetaara Onyenwe anyị onyinye, ka onyinye ọ ga-eweta bụrụ anụ ụlọ si nʼetiti igwe ehi maọbụ igwe ewu na atụrụ.
דבר אל בני ישראל ואמרת אלהם אדם כי יקריב מכם קרבן ליהוה--מן הבהמה מן הבקר ומן הצאן תקריבו את קרבנכם
3 “‘Ọ bụrụ na ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ e wetara site nʼigwe ehi, ọ bụ oke ehi nke na-enweghị ntụpọ ka ọ ga-eweta. Nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ka ọ ga-eweta ya, ka ọ bụrụ ihe Onyenwe anyị ga-anabata.
אם עלה קרבנו מן הבקר זכר תמים יקריבנו אל פתח אהל מועד יקריב אתו לרצנו לפני יהוה
4 Onye ahụ wetara ya ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ aja nsure ọkụ ahụ, a ga-anabata ya maka iji kpuchie mmehie ya.
וסמך ידו על ראש העלה ונרצה לו לכפר עליו
5 Nwoke ahụ ga-egbu nwa oke ehi ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja ga-ewere ọbara ya fesa ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja, nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ nzute ahụ.
ושחט את בן הבקר לפני יהוה והקריבו בני אהרן הכהנים את הדם וזרקו את הדם על המזבח סביב אשר פתח אהל מועד
6 Ị ga-agba ehi aja nsure ọkụ ahụ akpụkpọ, bọkasịa ya ntakịrị ntakịrị.
והפשיט את העלה ונתח אתה לנתחיה
7 Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya.
ונתנו בני אהרן הכהן אש--על המזבח וערכו עצים על האש
8 Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ.
וערכו בני אהרן הכהנים את הנתחים את הראש ואת הפדר--על העצים אשר על האש אשר על המזבח
9 Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
וקרבו וכרעיו ירחץ במים והקטיר הכהן את הכל המזבחה עלה אשה ריח ניחוח ליהוה
10 “‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ.
ואם מן הצאן קרבנו מן הכשבים או מן העזים לעלה--זכר תמים יקריבנו
11 Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.
ושחט אתו על ירך המזבח צפנה--לפני יהוה וזרקו בני אהרן הכהנים את דמו על המזבח--סביב
12 Mgbe nke a gasịrị, onye ahụ wetara ya, ga-abọ ya. Onye nchụaja ga-ewere akụkụ ya niile, na isi ya, na abụba ya tụkwasị ha nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ dị nʼebe ịchụ aja.
ונתח אתו לנתחיו ואת ראשו ואת פדרו וערך הכהן אתם על העצים אשר על האש אשר על המזבח
13 Ma ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya, ka onye ahụ ga-asa mmiri, tupu onye nchụaja eweta ha niile kpọọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.
והקרב והכרעים ירחץ במים והקריב הכהן את הכל והקטיר המזבחה--עלה הוא אשה ריח ניחח ליהוה
14 “‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu.
ואם מן העוף עלה קרבנו ליהוה והקריב מן התרים או מן בני היונה--את קרבנו
15 Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja.
והקריבו הכהן אל המזבח ומלק את ראשו והקטיר המזבחה ונמצה דמו על קיר המזבח
16 Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.
והסיר את מראתו בנצתה והשליך אתה אצל המזבח קדמה--אל מקום הדשן
17 Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ.
ושסע אתו בכנפיו לא יבדיל והקטיר אתו הכהן המזבחה על העצים אשר על האש עלה הוא אשה ריח ניחח--ליהוה

< Levitikọs 1 >