< Abụ Akwa 5 >
1 Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị; leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
Khumbula, Nkosi, ukuthi kwenzakaleni kithi; khangela, ubone ihlazo lethu.
2 E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
Ilifa lethu seliphendulelwe kwabezizwe, izindlu zethu kwabemzini.
3 Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.
Siyizintandane, kungelababa; omama banjengabafelokazi.
4 Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.
Amanzi ethu siwanathile ngemali; inkuni zethu ziza ngentengo.
5 Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ, ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.
Sizingelwa ezintanyeni zethu, sidiniwe, kasilakuphumula.
6 Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.
Sinike isandla sethu kwabeGibhithe, labeAsiriya, ukuze sisuthiswe ngesinkwa.
7 Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.
Obaba bona, kabasekho, njalo thina sithwele iziphambeko zabo.
8 Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.
Izigqili ziyasibusa, kakho ongasihluthuna esandleni sazo.
9 Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.
Sizuza isinkwa sethu ngengozi yempilo yethu, ngenxa yenkemba yenkangala.
10 Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ, na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.
Ijwabu lethu limnyama njengeziko ngenxa yokutshisa okukhulu kwendlala.
11 Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.
Badlova abesifazana eZiyoni, izintombi ezimsulwa emizini yakoJuda.
12 Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu; a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.
Iziphathamandla zaphanyekwa ngesandla sazo; ubuso babadala kabuhlonitshwanga.
13 Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
Amajaha athwala amatshe okuchola, labafana bakhubeka ngaphansi kwenkuni.
14 Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.
Abadala baphelile esangweni, amajaha ekuhlabeleleni.
15 Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
Intokozo yenhliziyo yethu iphelile, ukugida kwethu kwaphenduka ukulila.
16 Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
Umqhele wekhanda lethu uwile; hawu, maye kithi, ngoba sonile!
17 Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.
Ngenxa yalokhu inhliziyo yethu iphela amandla; ngenxa yalezizinto amehlo ethu afiphele.
18 Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu, nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.
Ngenxa yentaba yeZiyoni elunxiwa, amakhanka ahamba phezu kwayo.
19 Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
Wena, Nkosi, uhlezi kuze kube nininini, isihlalo sakho sobukhosi sisuka esizukulwaneni sisiya esizukulwaneni.
20 Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam? Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
Usikhohlweleni njalonjalo, usidela okobude bezinsuku?
21 Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa; gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,
Siphendulele kuwe, Nkosi, sizaphenduka; yenza insuku zethu zibe zintsha njengasendulo.
22 ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam na-eweso anyị iwe nke ukwu.
Kodwa ususilahlile isibili; usithukuthelele kakhulukazi.