< Abụ Akwa 5 >

1 Onyenwe anyị, biko, cheta ihe niile dakwasịrị anyị; leekwa anya ka ị hụrụ ọnọdụ ihere anyị.
Remember, O YHWH, what has befallen us, Look attentively, and see our reproach.
2 E werela ihe nketa anyị nyefee ndị ọbịa nʼaka, werekwa ebe obibi anyị nyefee nʼaka ndị mba ọzọ.
Our inheritance has been turned to strangers, Our houses to foreigners.
3 Anyị aghọọla ụmụ mgbei, na ndị na-enweghị nna. Nne anyị ha dị ka ndị inyom di ha nwụrụ.
Orphans we have been—without a father, our mothers [are] as widows.
4 Anyị na-akwụ ụgwọ nʼihi mmiri anyị na-aṅụ. Ọ bụkwa ego ka anyị ji azụ nkụ.
We have drunk our water for money, Our wood comes for a price.
5 Agbanyeghị na anyị nya yoku nʼolu, anyị bụ ndị a na-adọgbu nʼọrụ, ike agwụla anyị, enyeghị anyị izuike.
For our neck we have been pursued, We have labored—there has been no rest for us.
6 Anyị weere onwe anyị nyefee ndị Ijipt na ndị Asịrịa nʼaka nʼihi inweta nri ga-ezuru anyị.
[To] Egypt we have given a hand, [To] Asshur, to be satisfied with bread.
7 Nna anyị ha mehiere, ma ha anwụọla. Ma ọ bụ anyị na-anata ntaramahụhụ kwesiri ịbụ nke ha.
Our fathers have sinned—they are not, We have borne their iniquities.
8 Ndị bụ ohu na-achị anyị. Ọ dịghị onye anyị nwere nke ga-anapụta anyị site nʼaka ha.
Servants have ruled over us, There is no deliverer from their hand.
9 Anyị ji ndụ anyị nʼaka mgbe anyị na-achọ inweta ihe anyị ga-eri, nʼihi mma agha nke dị nʼọzara.
With our lives we bring in our bread, Because of the sword of the wilderness.
10 Anụ ahụ anyị dị ọkụ dịka ite ọkụ, na-amakwa jijiji nʼihi agụụ.
Our skin as an oven has been burning, Because of the raging of the famine.
11 Emerụọla ndị inyom dị na Zayọn, ha na ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke niile dị nʼobodo dị iche iche nke Juda.
Wives in Zion they have humbled, Virgins—in cities of Judah.
12 Akwụgbuola ụmụ eze site nʼikegide aka ha nʼelu; a dịghị enyekwa ndị okenye nsọpụrụ.
Princes have been hanged by their hand, Elderly faces have not been honored.
13 Ụmụ okorobịa na-adọgbu onwe ha nʼọrụ na nkume ịkwọ nri, ụmụntakịrị ndị nwoke na-asụkwa ngọngọ nʼokpuru ọtụtụ nkụ.
They have taken young men to grind, And youths have stumbled with wood.
14 Ndị okenye adịghịkwa anọ nʼọnụ ụzọ ama, ụmụ okorobịa akwụsịkwala ịkpọ ụbọ akwara ha.
Elderly have ceased from the gate, Young men from their song.
15 Ọṅụ adịghịkwa nʼobi anyị; ite egwu anyị aghọọlara anyị ịnọ ọnọdụ iru ụjụ.
The joy of our heart has ceased, Our dancing has been turned to mourning.
16 Okpueze esitela nʼisi anyị dapụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na anyị emehiela.
The crown has fallen [from] our head, Woe [is] now to us, for we have sinned.
17 Nʼihi nke a, obi anyị na-ada mba, nʼihi ihe ndị a ka anya anyị na-agba ọchịchịrị.
Our heart has been sick for this, Our eyes have been dim for these.
18 Nʼihi ugwu Zayọn nke tọgbọrọ nʼefu, nke ghọrọ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị.
For the Mount of Zion—that is desolate, Foxes have gone up on it.
19 Gị, Onyenwe anyị, na-abụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
You, O YHWH, remain for all time, Your throne to generation and generation.
20 Gịnị mere i ji na-echezọ anyị kpamkpam? Gịnị mere i ji gbakụta anyị azụ ogologo ụbọchị ndị a niile?
Why do You forget us forever? You forsake us for [the] length of [our] days!
21 Mee ka anyị lọghachikwute gị, Onyenwe anyị, ka anyị si otu a lọtakwa; gbanwee ụbọchị anyị ka ọ dị ọhụrụ dịka na mgbe ochie,
Turn us back, O YHWH, to You, And we turn back, renew our days as of old.
22 ma ọ bụghị na ị jụla anyị kpamkpam na-eweso anyị iwe nke ukwu.
For have You utterly rejected us? You have been angry against us—exceedingly?

< Abụ Akwa 5 >