< Abụ Akwa 4 >

1 Lee ka ọlaedo si chuo echu. Lee ka ọlaedo makarịsịrị mma si gbanwee ghọọ ihe na-amakwaghị mma. Nkume niile dị oke ọnụahịa nke ebe nsọ bụ ndị a ghasara nʼisi okporoụzọ niile.
Báwo ni wúrà ṣe sọ ògo dídán rẹ̀ nù, wúrà dídára di àìdán! Òkúta ibi mímọ́ wá túká sí oríta gbogbo òpópó.
2 Lee ka ụmụ ndị ikom Zayọn dị oke ọnụahịa, ndị dị oke ọnụahịa na mbụ dịka ọlaedo a nụchara anụcha, si dịrị ugbu a dịka ite aja nke ọkpụ ite kpụrụ.
Báwo ni àwọn ọ̀dọ́mọkùnrin Sioni tí ó ṣe iyebíye, tí wọ́n fi wúrà dídára ṣe wá dàbí ìkòkò amọ̀ lásán iṣẹ́ ọwọ́ amọ̀kòkò!
3 Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha azụ ụmụ ha, ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere; ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara.
Àwọn ajáko pèsè ọmú wọn fún ìtọ́jú àwọn ọmọ wọn, ṣùgbọ́n àwọn ènìyàn mi wá láì lọ́kàn bí ògòǹgò ní aginjù.
4 Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri, ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ.
Nítorí òǹgbẹ, ahọ́n àwọn ọmọ ọwọ́ lẹ̀ mọ́ òkè ẹnu wọn; àwọn ọmọdé bẹ̀bẹ̀ fún oúnjẹ, ṣùgbọ́n kò sí ẹni tí ó fi fún wọn.
5 Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
Àwọn tí ó ń jẹ ohun dáradára di òtòṣì ní òpópó. Àwọn tí a fi aṣọ dáradára wọ̀ ni wọ́n sùn ní orí òkìtì eérú.
6 Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.
Ìjìyà àwọn ènìyàn mi tóbi ju ti Sodomu lọ, tí a sí ní ipò ní òjijì láìsí ọwọ́ láti ràn án lọ́wọ́.
7 Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
Ọmọ ọba ọkùnrin wọn mọ́ ju òjò-dídì, wọ́n sì funfun ju wàrà lọ wọ́n ni ìtọ́jú bí iyùn pupa, ìrísí wọn dàbí safire.
8 Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.
Ṣùgbọ́n nísinsin yìí wọ́n dúdú ju èédú; wọn kò sì dá wọn mọ̀ ní òpópó. Ara wọn hun mọ́ egungun; ó sì gbẹ bí igi gbígbẹ.
9 Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.
Àwọn tí ó kù nípasẹ̀ idà sàn ju àwọn tí ìyàn pa; tí ó wọ àkísà ebi, tí ó ń ṣòfò fún àìní oúnjẹ láti inú pápá.
10 Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
Pẹ̀lú ọwọ́ àwọn obìnrin aláàánú ni wọ́n ṣe ọmọ wọn jẹ tí ó di oúnjẹ fún wọn nígbà tí a pa àwọn ènìyàn mi run.
11 Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile.
Olúwa ti fi ihò kíkún fún ìbínú rẹ̀; ó sì tú ìbínú gbígbóná rẹ̀ jáde. Ó da iná ní Sioni tí ó jó ìpìlẹ̀ rẹ̀ run.
12 Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.
Àwọn ọba ayé kò gbàgbọ́, tàbí àwọn ènìyàn ayé, wí pé àwọn ọ̀tá àti aninilára le wọ odi ìlú Jerusalẹmu.
13 Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya.
Èyí ṣẹlẹ̀ nítorí ẹ̀ṣẹ̀ àwọn wòlíì àti àìṣedéédéé àwọn olórí àlùfáà, tí ó ta ẹ̀jẹ̀ àwọn olódodo sílẹ̀ láàrín rẹ̀.
14 Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.
Nísinsin yìí wọ́n ń rìn kiri ní òpópó bí ọkùnrin tí ó fọ́jú. Ẹ̀jẹ̀ ara wọn sọ wọ́n di àbàwọ́n tí kò sẹ́ni tó láyà láti fọwọ́ kan aṣọ wọn.
15 Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, “O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”
“Lọ kúrò! Ẹ̀yin di aláìmọ́!” ni àwọn ènìyàn ń kígbe sí wọn. “Ẹ lọ! Ẹ lọ! Ẹ má ṣe fọwọ́ kàn wá!” Àwọn ènìyàn láàrín orílẹ̀-èdè wí pé, “Wọn kì yóò tẹ̀dó síbí mọ́.”
16 Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.
Olúwa ti tú wọn ká fúnra rẹ̀; kò sí bojútó wọn mọ́. Kò sí ọ̀wọ̀ fún olórí àlùfáà mọ́, àti àánú fún àwọn àgbàgbà.
17 Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.
Síwájú sí i, ojú wa kùnà fún wíwo ìrànlọ́wọ́ asán; láti orí ìṣọ́ wa ni à ń wò fún orílẹ̀-èdè tí kò le gbà wá là.
18 Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere, nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị. Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị, tupu ọgwụgwụ anyị eruo.
Wọ́n ń ṣọ́ wa kiri, àwa kò sì le rìn ní òpópó wa mọ́. Òpin wa ti súnmọ́, ọjọ́ wa sì níye nítorí òpin wa ti dé.
19 Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.
Àwọn tí ń lé wa yára ju idì ojú ọ̀run lọ; wọ́n lé wa ní gbogbo orí òkè wọ́n sì gẹ̀gùn dè wá ní aginjù.
20 Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ, ka ha jidere nʼọnya ha. Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya, nʼetiti mba dị iche iche.
Ẹni àmì òróró Olúwa, èémí ìyè wa, ni wọ́n fi tàkúté wọn mú. Àwa rò pé lábẹ́ òjìji rẹ̀ ni àwa yóò máa gbé láàrín orílẹ̀-èdè gbogbo.
21 Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, onye nke bi nʼala Uz. Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.
Ẹ yọ̀ kí inú yín sì dùn, ẹ̀yin ọmọbìnrin Edomu, ẹ̀yin tó ń gbé ní ilẹ̀ Usi. Ṣùgbọ́n, a ó gbé ago náà kọjá sọ́dọ̀ rẹ pẹ̀lú; ìwọ yóò yó bí ọ̀mùtí, ìwọ yóò sì rìn ní ìhòhò.
22 Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala; Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ. Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm, kpugheekwa ajọ omume gị niile.
Ìwọ ọmọbìnrin Sioni, ìjìyà rẹ yóò dópin; kò ní mú ìgbèkùn rẹ pẹ́ mọ́. Ṣùgbọ́n, ìwọ ọmọbìnrin Edomu, yóò jẹ ẹ̀ṣẹ̀ rẹ ní yà yóò sì fi àìṣedéédéé rẹ hàn kedere.

< Abụ Akwa 4 >