< Abụ Akwa 3 >

1 Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
Mimi ni mwanaume nilyeona maangaiko chini ya gongo la hasira ya Yahweh.
2 O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
Amenifukuza na kunisababisha kutembea kwenye giza kuliko kwenye nuru.
3 Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
Hakika amenigeuzia mkono wake dhidi yangu tena na tena, siku yote.
4 O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
Amefanya mwili wangu na ngozi yangu kufifia; amevunja mifupa yangu.
5 O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
Amejenga vifusi vya udogo dhidi yangu, na kunizingira na uchungu na ugumu.
6 O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
Amefanya ni ishi sehemu za giza, kama hao walio kufa zamani.
7 Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
Amejenga ukuta kunizunguka na siwezi kutoroka. Amefanya minyororo yangu mizito
8 Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
na japo nina ita na kulilia msaada, anazima maombi yangu.
9 O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
Ameziba njia yangu kwa ukuta wa mawe ya kuchonga; amefanya njia yangu mbaya.
10 Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
Yeye ni kama dubu anasubiri kunishambulia, simba katika maficho;
11 o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
amegeuza pembeni njia zangu, amenifanya ukiwa.
12 Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
Amepindisha upinde wake na kunifanya mimi kama lengo la mshale wake.
13 O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
Ametoboa maini yangu kwa mishale ya mfuko wake.
14 Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
Nilikuwa kichekesho kwa watu wangu wote, kielelezo cha dhihaka yao siku nzima.
15 O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
Amenijaza kwa uchungu na kunilazimisha kunywa maji machungu.
16 O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
Alivunja meno yangu na kokoto; amenisukuma chini kwenye fumbi.
17 Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
Nafsi yangu imenyimwa amani; nimesahau furaha ni nini.
18 Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
Hivyo na sema, “Ustahimilivu wangu umeangamia na pia tumaini langu kwa Yahweh.”
19 Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
Kumbuka mateso yangu na kuangaika kwangu, maji machungu na uchungu.
20 Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
Ninaendelea kukumbuka na nimeinama ndani yangu.
21 Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
Lakini ni vuta hili akilini mwangu na hivyo nina matumaini:
22 Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
Upendo dhabiti wa Yahweh haukomi na huruma zake haziishi,
23 Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
ni mpya kila asubui; uaminifu wako ni mkubwa.
24 Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
“Yahweh ni urithi wangu,” Nilisema, hivyo nitamtumainia.
25 Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
Yahweh ni mwema kwao wanao msubiri, kwa anaye mtafuta.
26 Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
Ni vizuri kusubiri taratibu kwa uwokovu wa Yahweh.
27 Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
Ni vizuri kwa mtu kubeba nira katika ujana.
28 Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
Acha aketi peke yake katika utulivu, inapo kuwa imewekwa juu yake.
29 Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
Acha aeke mdomo wake kwenye vumbi - kunaweza bado kuwa na matumaini.
30 Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
Acha atoa shavu lake kwa yeye anaye mpiga, na ajazwe tele kwa aibu.
31 Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
Kwa kuwa Bwana hatatukataa milele,
32 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
lakini japo anatia uzuni, ata kuwa na huruma kwa kadiri ya mwingi wa upendo wake dhabiti.
33 Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
Kwa kuwa haadhibu kutoka moyoni mwake au kutesa watoto wa mwanadamu.
34 Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
Kukanyaga chini ya mguu wafungwa wote wa dunia,
35 ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
kumnyima haki mtu mbele ya uwepo wa Aliye Juu,
36 ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
mkunyima haki mtu - Bwana hataidhinisha vitu kama hivyo!
37 Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
Ni nani aliye zungumza na ikatimia, kama sio Bwana kutamka?
38 Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
Sio kutoka mdomoni mwa Aliye Juu majanga na mazuri yanakuja?
39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
Mtu aliye hai anawezaje kulalamika? Mtu anawezaje kulalamika kwa adhabu ya dhambi zake?
40 Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
Natujichunguze njia zetu na kuzijaribu, na tumrudie Yahweh.
41 Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
Na tunyanyue mioyo yetu na mikono yetu kwa Yahweh mbinguni:
42 “Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
“Tumekosea na kuasi, na haujasamehe.
43 “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
Umejifunika na hasira na kutukimbiza, umeua na haujanusuru.
44 I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
Umejifunika na wingu ili kwamba kusiwe na ombi linaloweza kupita.
45 I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.
Umetufanya kama uchafu na taka miongoni mwa mataifa.
46 “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.
Maadui wetu wote wametulaani,
47 Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
wasiwasi na shimo limetujia, maafa na uharibifu.
48 Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
Macho yangu yanatiririka na miferiji ya machozi kwasababu ya watu wangu.
49 Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
Macho yangu yatatoa machozi pasipo kikomo; pasipo hauweni,
50 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
mpaka atakapo tazama chini na Yahweh ataona kutoka mbinguni.
51 Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
Macho yangu yana ni sababishia uzuni kwasababu ya mabinti wa mji wangu.
52 Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
Nimewindwa kama ndege hao walio kuwa maadui zangu; wameniwinda pasipo sababu.
53 Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
Wamenitupa kwenye shimo na wakanitupia jiwe,
54 Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
na maji yaka mwagika juu ya kichwa changu. Nilisema, “Nimekatwa mbali!”
55 Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
Nililiita jna lako, Yahweh, kutoka kina cha shimo.
56 Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
Ulisikia sauti yangu. Ulisikia sauti yangu nilipo sema, “Usifunge sikio lako kwa kilio changu cha msaada.”
57 Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”
Ulikuja karibu siku niliyo kuiita; ulisema, “Usiogope”
58 Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.
Bwana, ulitetea kesi yangu, uliokoa maisha yangu!
59 Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.
Yahweh, umeona mabaya waliyo ni fanyia, hukumu kesi yangu.
60 Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
Umeona matusi yao, mipango yao yote dhidi yangu -
61 Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
Umesikia dhihaka yao, Yahweh, na mipango yao kunihusu.
62 Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
Midomo ya hao wanao inuka kinyume changu, na mashtaka yao, inakuja dhidi yangu siku nzima.
63 Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
Ngalia jinsi wanavyo keti na kuinuka; wana nidhihaki na nyimbo zao.
64 Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
Walipize, Yahweh, kwa kadiri ya waliyo fanya.
65 Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
Utaacha mioyo yao bila lawama! Hukumu yako iwe juu yao!
66 Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.
Una wakimbiza kwa hasira na kuwaharibu nchini ya mbingu, Yahweh!

< Abụ Akwa 3 >