< Abụ Akwa 3 >

1 Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
I am the man who has seen affliction by the rod of his wrath.
2 O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
He has led me and caused me to walk in darkness, and not in light.
3 Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
Surely he turns his hand against me again and again all day long.
4 O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
He has made my flesh and my skin old. He has broken my bones.
5 O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
He has built against me, and surrounded me with bitterness and hardship.
6 O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
He has made me dwell in dark places, as those who have been long dead.
7 Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
He has walled me about, so that I can’t go out. He has made my chain heavy.
8 Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
Yes, when I cry, and call for help, he shuts out my prayer.
9 O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
He has walled up my ways with cut stone. He has made my paths crooked.
10 Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
He is to me as a bear lying in wait, as a lion in hiding.
11 o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
He has turned away my path, and pulled me in pieces. He has made me desolate.
12 Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
He has bent his bow, and set me as a mark for the arrow.
13 O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
He has caused the shafts of his quiver to enter into my kidneys.
14 Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
I have become a derision to all my people, and their song all day long.
15 O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
He has filled me with bitterness. He has stuffed me with wormwood.
16 O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
He has also broken my teeth with gravel. He has covered me with ashes.
17 Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
You have removed my soul far away from peace. I forgot prosperity.
18 Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
I said, “My strength has perished, along with my expectation from the LORD.”
19 Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
Remember my affliction and my misery, the wormwood and the bitterness.
20 Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
My soul still remembers them, and is bowed down within me.
21 Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
This I recall to my mind; therefore I have hope.
22 Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
It is because of the LORD’s loving kindnesses that we are not consumed, because his mercies don’t fail.
23 Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
They are new every morning. Great is your faithfulness.
24 Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
“The LORD is my portion,” says my soul. “Therefore I will hope in him.”
25 Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
The LORD is good to those who wait for him, to the soul who seeks him.
26 Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
It is good that a man should hope and quietly wait for the salvation of the LORD.
27 Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
It is good for a man that he bear the yoke in his youth.
28 Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
Let him sit alone and keep silence, because he has laid it on him.
29 Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
Let him put his mouth in the dust, if it is so that there may be hope.
30 Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
Let him give his cheek to him who strikes him. Let him be filled full of reproach.
31 Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
For the Lord will not cast off forever.
32 Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
For though he causes grief, yet he will have compassion according to the multitude of his loving kindnesses.
33 Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
For he does not afflict willingly, nor grieve the children of men.
34 Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
To crush under foot all the prisoners of the earth,
35 ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
to turn away the right of a man before the face of the Most High,
36 ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
to subvert a man in his cause, the Lord doesn’t approve.
37 Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
Who is he who says, and it comes to pass, when the Lord doesn’t command it?
38 Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
Doesn’t evil and good come out of the mouth of the Most High?
39 Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
Why should a living man complain, a man for the punishment of his sins?
40 Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
Let us search and try our ways, and turn again to the LORD.
41 Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
Let’s lift up our heart with our hands to God in the heavens.
42 “Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
“We have transgressed and have rebelled. You have not pardoned.
43 “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
“You have covered us with anger and pursued us. You have killed. You have not pitied.
44 I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
You have covered yourself with a cloud, so that no prayer can pass through.
45 I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.
You have made us an off-scouring and refuse in the middle of the peoples.
46 “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.
“All our enemies have opened their mouth wide against us.
47 Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
Terror and the pit have come on us, devastation and destruction.”
48 Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
My eye runs down with streams of water, for the destruction of the daughter of my people.
49 Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
My eye pours down and doesn’t cease, without any intermission,
50 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
until the LORD looks down, and sees from heaven.
51 Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
My eye affects my soul, because of all the daughters of my city.
52 Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
They have chased me relentlessly like a bird, those who are my enemies without cause.
53 Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
They have cut off my life in the dungeon, and have cast a stone on me.
54 Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
Waters flowed over my head. I said, “I am cut off.”
55 Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
I called on your name, LORD, out of the lowest dungeon.
56 Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
You heard my voice: “Don’t hide your ear from my sighing, and my cry.”
57 Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”
You came near in the day that I called on you. You said, “Don’t be afraid.”
58 Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.
Lord, you have pleaded the causes of my soul. You have redeemed my life.
59 Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.
LORD, you have seen my wrong. Judge my cause.
60 Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
You have seen all their vengeance and all their plans against me.
61 Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
You have heard their reproach, LORD, and all their plans against me,
62 Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
the lips of those that rose up against me, and their plots against me all day long.
63 Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
You see their sitting down and their rising up. I am their song.
64 Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
You will pay them back, LORD, according to the work of their hands.
65 Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
You will give them hardness of heart, your curse to them.
66 Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.
You will pursue them in anger, and destroy them from under the heavens of the LORD.

< Abụ Akwa 3 >