< Abụ Akwa 1 >

1 Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụ si bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu! Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ, bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile. Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achị si ghọọ ohu.
Haa! Mzinda uja wasiyidwa wokhawokha, umene kale unali wodzaza ndi anthu! Kale unali wotchuka pakati pa mitundu ya anthu! Tsopano wasanduka ngati mkazi wamasiye. Kale unali mfumukazi ya onse pa dziko lapansi, tsopano wasanduka kapolo.
2 Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị, anya mmiri na-asọdakwa na nti ya, nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya, ọ dịghị onye na-akasị ya obi. Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya; ha niile aghọọla ndị iro ya.
Ukulira mowawidwa mtima usiku wonse, misozi ili pa masaya pake. Mwa abwenzi ake onse, palibe ndi mmodzi yemwe womutonthoza. Abwenzi ake onse amuchitira chiwembu; onse akhala adani ake.
3 Juda ejeela biri nʼala ọzọ, mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta. Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche, ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla. Nʼetiti nhụju anya ya ndị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya.
Yuda watengedwa ku ukapolo, kukazunzika ndi kukagwira ntchito yolemetsa. Iye akukhala pakati pa anthu a mitundu ina; ndipo alibe malo opumulira. Onse omuthamangitsa iye amupitirira, ndipo alibe kwina kothawira.
4 Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ, nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka. Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu, ndị nchụaja ya na-asụ ude, ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute, ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu.
Misewu yopita ku Ziyoni ikulira, chifukwa palibe ndi mmodzi yemwe akubwera ku maphwando ake. Zipata zake zonse zili pululu, ansembe akubuwula. Anamwali ake akulira, ndipo ali mʼmasautso woopsa.
5 Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya; ndị iro ya nọ nʼahụ udo. Nʼihi na Onyenwe anyị emekpaala ya ahụ, nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile. E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ, dịka ndị a dọtara nʼagha.
Adani ake asanduka mabwana ake; odana naye akupeza bwino. Yehova wamubweretsera mavuto chifukwa cha machimo ake ambiri. Ana ake atengedwa ukapolo pamaso pa mdani.
6 Ịma mma niile esitela nʼahụ ada Zayọn pụọ. Ụmụ eze ya dị ka ele nke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri. Nʼihi adịghị ike ha, ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga.
Ulemerero wonse wa mwana wamkazi wa Ziyoni wachokeratu. Akalonga ake ali ngati mbawala zosowa msipu; alibe mphamvu zothawira owathamangitsa.
7 Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala, Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie. Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị. Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya, o nweghị onye inyeaka ha hụrụ. Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụ ya, chịa ya ọchị.
Pa masiku a masautso ndi kuzunzika kwake, Yerusalemu amakumbukira chuma chonse chimene mʼmasiku amakedzana chinali chake. Anthu ake atagwidwa ndi adani ake, panalibe aliyense womuthandiza. Adani ake ankamuyangʼana ndi kumuseka chifukwa cha kuwonongeka kwake.
8 Jerusalem emehiela nke ukwu, nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ. Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya, nʼihi na ha ahụla ọtọ ya. Ya onwe ya kwa na-asụ ude, ma chigharịakwa azụ.
Yerusalemu wachimwa kwambiri ndipo potero wakhala wodetsedwa. Onse amene ankamulemekeza pano akumunyoza, chifukwa aona umaliseche wake. Iye mwini akubuwula ndipo akubisa nkhope yake.
9 Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.”
Uve wake umaonekera pa zovala zake; iye sanaganizire za tsogolo lake. Nʼchifukwa chake kugwa kwake kunali kwakukulu; ndipo analibe womutonthoza. “Inu Yehova, taonani masautso anga, pakuti mdani wapambana.”
10 Onye iro agbasaala aka ya chịkọtaa akụ ya niile. O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche iche si bata ebe nsọ ya. Ndị ahụ na-ekwesighị ịbata bụ ndị batara nʼebe nzukọ gị.
Adani amulanda chuma chake chonse; iye anaona mitundu ya anthu achikunja ikulowa mʼmalo ake opatulika, amene Inu Mulungu munawaletsa kulowa mu msonkhano wanu.
11 Ndị ya niile na-asụ ude mgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri. Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri, ime ka ha nwee ike dịrị ndụ. “Onyenwe anyị, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile, nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.”
Anthu ake onse akubuwula pamene akufunafuna chakudya; asinthanitsa chuma chawo ndi chakudya kuti akhale ndi moyo. “Inu Yehova, taonani ndipo ganizirani, chifukwa ine ndanyozeka.”
12 “Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe? Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ. O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m, nke e mere ka ọ bịakwasị m, bụ nke Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị m, nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ?
“Kodi zimenezi mukuziyesa zachabe, inu nonse mukudutsa? Yangʼanani ndipo muone. Kodi pali mavuto ofanana ndi amene andigwerawa, amene Ambuye anandibweretsera pa tsiku la ukali wake?
13 “O si nʼelu zite ọkụ, e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m. Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee, meekwa ka m laghachi azụ. O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu, onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile.
“Anatumiza moto kuchokera kumwamba, unalowa mpaka mʼmafupa anga. Anayala ukonde kuti ukole mapazi anga ndipo anandibweza. Anandisiya wopanda chilichonse, wolefuka tsiku lonse.
14 “Ọ na-eleru anya na mmehie m niile; jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ. A nyakwasịla ya nʼolu m. Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m. O werela m nyefee nʼaka ndị ahụ m na-apụghị iguzogide.
“Wazindikira machimo anga onse ndipo ndi manja ake anawaluka pamodzi. Machimowa afika pakhosi panga, ndipo Ambuye wandithetsa mphamvu. Iye wandipereka kwa anthu amene sindingalimbane nawo.
15 “Onyenwe anyị ajụla ndị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m. Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m, ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile. Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị ya ka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke.
“Ambuye wakana anthu anga onse amphamvu omwe ankakhala nane: wasonkhanitsa gulu lankhondo kuti lilimbane nane, kuti litekedze anyamata anga; mʼmalo ofinyira mphesa Ambuye wapondereza anamwali a Yuda.
16 “Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa. Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya. O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso; o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m. Ụmụ m atọgbọla nʼefu, nʼihi na onye iro emeriela.”
“Chifukwa cha zimenezi ndikulira ndipo maso anga adzaza ndi misozi. Palibe aliyense pafupi woti anditonthoze, palibe aliyense wondilimbitsa mtima. Ana anga ali okhaokha chifukwa mdani watigonjetsa.
17 Lee ka Zayọn si gbasapụ aka ya ma o nweghị onye nkasiobi o nwere. Onyenwe anyị enyela iwu banyere Jekọb na ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya. Jerusalem aghọkwaala ihe rụrụ arụ nʼetiti ha.
“Ziyoni wakweza manja ake, koma palibe aliyense womutonthoza. Yehova walamula kuti abale ake a Yakobo akhale adani ake; Yerusalemu wasanduka chinthu chodetsedwa pakati pawo.
18 “Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume. Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya. Geenụ ntị unu ndị niile, leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m. A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼagha buru ha jee mba ọzọ.
“Yehova ndi wolungama, koma ndine ndinawukira malamulo ake. Imvani inu anthu a mitundu yonse; onani masautso anga. Anyamata ndi anamwali anga agwidwa ukapolo.
19 “Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma, ma ha ghọgburu m. Ndị nchụaja m na ndị okenye m nwụrụ nʼime obodo mgbe ha nọ na-achọta nri ha ga-eji debe onwe ha ndụ.
“Ndinayitana abwenzi anga koma anandinyenga. Ansembe ndi akuluakulu anga anafa mu mzinda pamene ankafunafuna chakudya kuti akhale ndi moyo.
20 “Lee, Onyenwe anyị, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị. Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ, obi m kwa enweghị izuike nʼime m nʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ. Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa. Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya.
“Inu Yehova, onani mmene ine ndavutikira! Ndikuzunzika mʼkati mwanga, ndipo mu mtima mwanga ndasautsidwa chifukwa ndakhala osamvera. Mʼmisewu anthu akuphedwa, ndipo ku mudzi kuli imfa yokhayokha.
21 “Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m, ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi. Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m, ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m. Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa, nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị.
“Anthu amva kubuwula kwanga, koma palibe wonditonthoza. Adani anga onse amva masautso anga; iwo akusangalala pa zimene Inu mwachita. Lifikitseni tsiku limene munalonjeza lija kuti iwonso adzakhale ngati ine.
22 “Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị. Mesokwa ha mmeso dịka i si mesoo m nʼihi mmehie niile nke m. Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ, ana m adakwa mba nʼobi m.”
“Lolani kuti ntchito zawo zoyipa zifike pamaso panu; muwalange ngati mmene mwandilangira ine chifukwa cha machimo anga onse. Ndikubuwula kwambiri ndipo mtima wanga walefuka.”

< Abụ Akwa 1 >