< Ndị Ikpe 1 >

1 Mgbe Joshua nwụrụ, ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị sị, “Olee ebo ga-ebu ụzọ gaa lụso ndị Kenan agha nʼihi anyị?”
Baada ya kifo cha Yoshua, wana wa Israeli walimuuliza Yahweh wakisema, “Ni nani atawashambulia kwanza Wakanaani kwa ajili yetu, ili kupigana nao?
2 Onyenwe anyị zara, “Ọ bụ ebo Juda. Enyefeela m ala ahụ nʼaka ha.”
Yahweh akasema, “Yuda atawashambulia. Tazama, nimewapa kumiliki nchi hii.
3 Ndị Juda gwara ụmụ nwanne ha ndị ebo Simiọn sị, “Soronụ anyị banye nʼala ahụ anyị ketara site nʼife nza, ka anyị ga lụso ndị Kenan agha. Anyị ga-esokwara unu banye nʼala nke unu.” Ya mere, ndị ebo Simiọn soro ha gaa.
Watu wa Yuda wakawaambia wana wa Simeoni, ndugu zao, “Njoo pamoja nasi katika eneo letu ambalo tumepewa ili kwa pamoja tupigane na Wakanaani. Na sisi pia tutakwenda nanyi katika eneo mlilopewa.” Basi kabila la Simeoni wakaenda pamoja nao.
4 Mgbe Juda busoro ha agha, Onyenwe anyị nyefere ndị Kenan, na ndị Periz nʼaka ha, mee ka ha gbuo puku ndị agha iri nʼime obodo Bezek.
Watu wa Yuda wakashinda, na Bwana akawapa ushindi juu ya Wakanaani na Waperizi. Wakawaua watu elfu kumi huko Bezeki.
5 Nʼebe ahụ ka ha zutere Adoni-Bezek, buso ya agha, tigbukwaa ndị Kenan na ndị Periz.
Wakamkuta Adoni Bezeki huko Bezeki, nao wakapigana naye na kuwashinda Wakanaani na Waperizi.
6 Ma Adoni-Bezek gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya, ma ha chụgidere ya, jide ya, gbupụ ya isi mkpụrụ aka ya abụọ na isi mkpụrụ ụkwụ ya abụọ.
Lakini Adoni Bezeki akamkimbilia, wakamfuata na kumshika, nao wakavikata vidole gumba na vidole vyake vikubwa.
7 Mgbe ahụ, Adoni-Bezek sịrị, “Iri ndị eze asaa ka m mesoro ụdị mmeso a unu mesoro m, ọ bụkwa nri si na tebul m dapụ ka ha riri. Ugbu a Chineke akwụghachila m ụgwọ ọrụ ọjọọ m.” Ha kpụụrụ ya gaa Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ.
Adoni Bezek akasema, “Wafalme sabini, ambao na vidole gumba vyako na vidole vikubwa vilivyokatwa, walikusanya chakula chao chini ya meza yangu. Kama nilivyofanya, hata hivyo Mungu amefanya kwangu.” Wakamleta Yerusalemu, naye akafa huko.
8 Ndị Juda busoro obodo Jerusalem agha, were mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi nʼime ya, ma gbaakwa obodo ahụ niile ọkụ.
Watu wa Yuda wakapigana dhidi ya jiji la Yerusalemu na kulichukua. Walishambulia kwa makali ya upanga na wakauwasha mji kwa moto.
9 Mgbe nke a gasịrị, ndị agha Juda busoro ndị Kenan bi na ndịda ala ugwu ugwu ahụ, bụ Negev, ya na akụkụ ọdịda anyanwụ nʼebe dị ala ala.
Baada ya hayo, watu wa Yuda walikwenda kupigana na Wakanaani waliokaa mlimani, Negebu, na magharibi mwa milima.
10 Ha jekwuru ndị Kenan bi nʼobodo Hebrọn (nke a na-akpọ Kiriat Aaba na mbụ) merie Sheshai, na Ahiman, na Talmai.
Yuda akaenda dhidi ya Wakanaani waliokaa Hebroni (jina la Hebroni hapo awali ilikuwa Kiriath-arba), nao wakamshinda Sheshai, Ahimani na Talmai.
11 Site nʼebe ahụ, ha jekwuru ndị bi na Debịa (nke a na-akpọ Kiriat Sefa, nʼoge mbụ).
Kutoka huko watu wa Yuda walipigana na wenyeji wa Debiri (jina la Debiri hapo awali ilikuwa Kiriath-seferi).
12 Kaleb sịrị, “Nwoke ọbụla ga-aga busoo Kiriat Sefa agha ma merie ya ka m ga-akpọnye Aksa bụ nwa m nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.”
Kalebu akasema, Yeyote atakayeivamia Kiriath-seferi na kuichukua, nitampa Aksa, binti yangu, awe mkewe.
13 Otniel nwa Kenaz, nwanne nta Kaleb, lụgburu obodo ahụ nʼagha. Nʼihi nke a, Kaleb kpọnyere ya Aksa, bụ nwa ya nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.
Otinieli, mwana wa Kenazi, ndugu mdogo wa Kalebu, akaiteka Debiri, naye Kalebu akampa Aksa, binti yake, awe mkewe.
14 Otu ụbọchị, mgbe Aksa bịakwutere Otniel, ọ kwagidere ya ka ọ rịọọ ala ubi site nʼaka nna ya. Mgbe Aksa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịdata, Kaleb jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ ka m mere gị?”
Ndipo Aksa alifika kwa Othnieli, naye akamsihi amuombe baba yake ampe shamba. Alipokuwa akishuka katika punda wake, Kalebu akamwuliza, “Nikufanyie nini?”
15 Ọ zaghachiri, “Nyem onyinye pụrụ iche. Ebe ọ bụ na i nyela m ala Negev, biko nyekwa m isi mmiri ụfọdụ.” Nʼihi nke a, Kaleb nyere ya isi mmiri mgbago na isi mmiri nke ndịda.
Akamwambia, Nibariki. Kwa kuwa umenipa nchi ya Negebu, nipe pia chemchemi za maji. Kwa hiyo Kalebu akampa chemchemi za juu na chemchemi za chini.
16 Ụmụnna nwunye Mosis, onye Ken, si nʼobodo nkwụ nkwụ soro ndị Juda, gaa biri nʼetiti ndị ahụ bi nʼọzara Juda, na Negev, nke dị nso nʼArad.
Kizazi cha Mkeeni shemeji yake na Musa, walikwenda kutoka mji wa Mitende pamoja na watu wa Yuda, mpaka jangwa la Yuda, ambalo liko Negevu, kuishi na watu wa Yuda karibu na Arad.
17 Ndị ikom Juda sooro ndị ikom Simiọn, ụmụnna ha, lụso ndị Kenan bi na Zefat agha, bibie obodo ahụ kpamkpam. Nʼihi nke a, a gụgharịrị obodo ahụ, kpọọ ya Homa.
Nao watu wa Yuda wakaenda pamoja na wana wa Simeoni ndugu zao, wakawaangamiza Wakanaani waliokaa Zefathi, wakaiharibu kabisa. Mji uliitwa Horma.
18 Ndị agha Juda lụgbukwara obodo Gaza, na Ashkelọn, na Ekrọn, tinyere ala niile gbara ha gburugburu.
Watu wa Yuda pia waliiteka Gaza na nchi iliyoizunguka, Ashkeloni na nchi iliyoizunguka, na Ekron na nchi iliyoizunguka.
19 Onyenwe anyị nọnyeekwara ndị Juda mee ka ha kpochapụ ndị niile bi nʼobodo niile dị nʼala ugwu ugwu ahụ. Ma ha enweghị ike ịchụpụ ndị bi nʼala ndagwurugwu ahụ, nʼihi na ndị ahụ nwere ụgbọ agha igwe dị iche iche.
Yahweh alikuwa pamoja na watu wa Yuda na wakaimiliki nchi ya milima, lakini hawakuweza kuwatoa wenyeji wa kwenye bonde kwa sababu walikuwa na magari ya chuma.
20 E nyekwara Kaleb obodo Hebrọn, dịka Mosis kwere ya na nkwa. Kaleb chụpụrụ ụmụ Anak atọ site nʼala ahụ.
Hebroni alipewa Kalebu (kama Musa alivyosema), naye akawafukuza kutoka huko wana watatu wa Anaki.
21 Ndị ebo Benjamin enweghị ike chụpụ ndị Jebus bi na Jerusalem. Nʼihi nke a, ha soro ụmụ Benjamin biri ruo taa.
Lakini wana wa Benyamini hawakuwafukuza Wayebusi waliokaa Yerusalemu. Basi Wayebusi wakakaa na watu wa Benyamini huko Yerusalemu hata leo.
22 Ma ndị sitere nʼebo Josef busoro obodo Betel agha. Onyenwe anyị nọnyeere ha.
Nyumba ya Yusufu ilijiandaa kuishambulia Betheli, na Yahweh alikuwa pamoja nao.
23 Mgbe ha zipuru ndị ikom ịga nyochapụta obodo Betel, nke a na-akpọ Luz,
Walipeleka watu kuipeleleza Betheli (jiji lililoitwa Luzu).
24 ndị nnyopụta ahụ hụrụ otu nwoke sị nʼobodo ahụ na-apụta. Ha gwara ya okwu sị ya, “Zi anyị ụzọ anyị ga-esi banye nʼime obodo a, anyị ga-ahụ na e mesoro gị mmeso dị mma.”
Wapelelezi waliona mtu akitoka nje ya jiji, wakamwambia, “Tafadhali tuonyeshe jinsi ya kuingia ndani ya jiji, na tutakutendea mema.”
25 Ya mere, nwoke ahụ gosiri ha ụzọ, ha ji mma agha gbuo mmadụ niile bi nʼime obodo ahụ, ma ha hapụrụ nwoke ahụ na ezinaụlọ ya ndụ.
Aliwaonyesha njia ya kuingia kwenye mji. Waliuteka mji kwa makali ya upanga, lakini wakamuacha mtu huyo na ndugu zake wote waondoke.
26 Emesịa, nwoke ahụ kpọọrọ ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Het wuoro onwe ya otu obodo nʼebe ahụ. Ọ kpọrọ aha obodo ahụ Luz, nke bụkwa aha obodo ahụ ruo taa.
Na mtu huyo akaenda nchi ya Wahiti, akajenga mji, akauita Luzu, ambalo jina lake hata leo.
27 Manase achụpụghị ndị Bet-Shan na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Teanak na obodo nta ya ndị ọzọ, maọbụ Doa, maọbụ Ibleam, maọbụ Megido, tinyere obodo nta niile ndị ọzọ gbara ha gburugburu. Nʼihi na ndị Kenan bigidere nʼebe ahụ.
Watu wa Manase hawakuwafukuza watu waliokuwa katika miji ya Bethsheani na vijiji vyake, au Taanaki na vijiji vyake, au wale waliokaa Dori na vijiji vyake, wala wale waliokaa Ibleamu na vijiji vyake, wala walioshi Megido na vijiji vyake, kwa sababu Wakanaani walikuwa wameamua kuishi katika nchi hiyo.
28 Mgbe ụmụ Izrel dịrị ike karịa, ha manyere ndị Kenan ị rụrụ ha ọrụ, ma ha achụpụghị ha site nʼala ahụ.
Israeli ipokuwa na nguvu, waliwalazimisha Wakanaani wawatumikie kwa kazi ngumu, lakini hawakuwafukuza kabisa.
29 Ifrem enwekwaghị ike chụpụ ndị Kenan bi na Gaza. Ndị Kenan gara nʼihu biri nʼetiti ha nʼebe ahụ.
Efraimu hakuwafukuza Wakanaani waliokaa Gezeri; kwa hiyo Wakanaani wakakaa kati yao.
30 Otu a kwa, ebo Zebụlọn achụpụghị ndị Kenan bi nʼala Kitrọn, maọbụ na Nahalol, kama ha mere ha ndị ohu na-arụ ọrụ ike.
Zebuloni hakuwafukuza watu wa Kitroni, wala watu waliokuwa Nahaloli; na Wakanaani wakaendelea kuishi pamoja nao; lakini Zabuloni akawalazimisha Wakanaani wawatumikie kwa kazi ngumu.
31 Ọzọkwa, ndị ebo Asha achụpụghị ndị niile bi nʼAkọ, na Saịdọn, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, maọbụ Rehob.
Asheri hakuwafukuza watu wanaoishi Aka, au watu wanaoishi Sidoni, au wale wanaoishi Alabu, Akzib, Helba, Afeka, au Rehobu.
32 Ndị Asha binyere nʼetiti ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ, nʼihi na ha achụpụghị ha.
Kwa hiyo kabila ya Asheri iliishi kati ya Wakanaani (waliokaa katika nchi hiyo), kwa sababu hawakuwafukuza.
33 Ndị ebo Naftalị achụpụghịkwa ndị bi na Bet-Shemesh, maọbụ ndị bi na Bet-Anat. Kama ndị Naftalị binyere ndị Kenan bi nʼala ahụ. Ma ndị bi na Bet-Shemesh, na Bet-Anat ghọrọ ndị ohu ndị Naftalị.
Na kabila la Naftali halikuwafukuza watu waliokuwa wakiishi Bethshemeshi, wala waliokuwa wakiishi Bethanathi. Kwa hiyo kabila la Naftali liliishi kati ya Wakanaani (watu waliokuwa wakiishi katika nchi hiyo). Hata hivyo, wenyeji wa Bethshemeshi na Bethanathi walilazimishwa kufanya kazi ngumu kwa Naphthali.
34 Ma banyere ndị ebo Dan, ndị Amọrait chụpụrụ ha chụba ha nʼelu ugwu. Ha ekwenyeghị ka ha rịdata na ndịda ugwu ahụ.
Waamori waliwalazimisha kabila la Dani kuishi katika nchi ya kilima, hawakuwaruhusu kuja bondeni.
35 Ma ndị Amọrait nọgidesịrị ike nʼugwu Heres, na Aijalon, na Shaalbim, ma mgbe ike ebo Josef bara ụba, ha meriri ha, mee ha ndị ohu ha.
Basi Waamori waliishi katika mlima wa Heresi, huko Aiyaloni, na Shaalbimu, lakini nguvu za kijeshi za nyumba ya Yusufu ziliwashinda, nao wakalazimishwa kuwatumikia kwa kazi ngumu.
36 Oke ala ụmụ ndị Amọrait malitere na mgbago Akrabim ruo, ma gafeekwa ebe a na-akpọ Sela.
Mpaka wa Waamori ulikuwa kutoka kilima cha Akrabimu huko Sela hadi nchi ya vilima.

< Ndị Ikpe 1 >