< Ndị Ikpe 9 >
1 Otu ụbọchị, Abimelek nwa Jerub-Baal jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na Shekem, na ndị ikwu nne ya niile sị ha,
Now Abimelech, the son of Jerubbaal, went to Shechem, to his maternal brothers, and he spoke to them, and to all the relatives of the house of his maternal grandfather, saying:
2 “Jekwurunụ ndị Shekem jụọ ha, ‘Kedụ nke kara unu mma: ọ bụ ka ụmụ iri ndị ikom asaa Jerub-Baal mụrụ chịa unu, ka ọ bụ ka otu onye chịa unu?’ Chetakwanụ na mụ na unu bụ otu anụ ahụ na ọbara.”
“Speak to all the men of Shechem: Which is better for you: that seventy men, all the sons of Jerubbaal, should rule over you, or that one man should rule over you? And consider also that I am your bone and your flesh.”
3 Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị Shekem ihe Abimelek kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.”
And his maternal brothers spoke about him to all the men of Shechem, all these words, and they inclined their hearts after Abimelech, saying, “He is our brother.”
4 Ha sitere nʼụlọ arụsị Baal-Berit nye ya iri shekel ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya.
And they gave to him the weight of seventy silver coins from the shrine of Baal-berith. With this, he hired for himself indigent and wandering men, and they followed him.
5 Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo Ofra. Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama Jotam, bụ ọdụdụ nwa Jerub-Baal, zoro onwe ya gbapụ.
And he went to his father’s house in Ophrah, and he killed his brothers, the sons of Jerubbaal, seventy men, upon one stone. And there remained only Joatham, the youngest son of Jerubbaal, and he was in hiding.
6 Mgbe ahụ, ndị Shekem na ndị Bet Milo kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na Shekem. Nʼebe ahụ ka ha nọ mee Abimelek eze Izrel.
Then all the men of Shechem gathered together, and all the families of the city of Millo, and they went and appointed Abimelech as king, beside the oak that stood at Shechem.
7 Mgbe Jotam nụrụ ya, o rigooro nʼugwu Gerizim guzo nʼebe ahụ tikuo ndị Shekem niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka Chineke nwe ike gee unu ntị.
When this had been reported to Jotham, he went and stood at the top of Mount Gerizim. And lifting up his voice, he cried out and said: “Listen to me, men of Shechem, so that God may listen to you.
8 Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’
The trees went to anoint a king over themselves. And they said to the olive tree, ‘Reign over us.’
9 “Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ Chineke na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
And it responded, ‘How could I abandon my fatness, which both gods and men make use of, and depart to be promoted among the trees?’
10 “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi fiig ka ọ bụrụ eze ha.
And the trees said to the fig tree, ‘Come and accept royal power over us.’
11 “Ma osisi fiig sịrị, ‘Ọ bụrụ na m ekwere na m ga-abụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
And it responded to them, ‘How could I abandon my sweetness, and my very sweet fruits, and depart to be promoted among the other trees?’
12 “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi vaịnị ma ọ ga-ekwenye ịbụ eze ha.
And the trees said to the vine, ‘Come and reign over us.’
13 “Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye Chineke na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’
And it responded to them, ‘How could I abandon my wine, which gives joy to God and men, and be promoted among the other trees?’
14 “Nʼikpeazụ, osisi niile jekwuuru ogwu ọhịa, ‘Bịa ka ị bụrụ eze anyị.’
And all the trees said to the bramble, ‘Come and reign over us.’
15 “Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na Lebanọn!’
And it responded to them: ‘If truly you would appoint me as king, come and rest under my shadow. But if you are not willing, let fire go forth from the bramble, and let it devour the cedars of Lebanon.’”
16 “Ugbu a, omume unu o ziri ezi ma sitekwa nʼezi obi na unu mere Abimelek eze? Mmeso unu mesoro Jerub-Baal na ezinaụlọ ya o ziri ezi? Unu omesoro ya dịka o kwesiri ya?
So now, if you are upright and without sin in appointing Abimelech as a king over you, and if you have acted well with Jerubbaal, and with his house, and if you have repaid, in turn, the benefits of him who fought on your behalf,
17 Chetakwanụ na nna m lụrụ ọgụ maka unu, kpọọ ndụ ya ihe efu, nʼihi ịnapụta unu site nʼaka ndị Midia.
and who gave his life to dangers, so that he might rescue you from the hand of Midian,
18 Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa Abimelek nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị Shekem niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu.
though you now have risen up against my father’s house, and have killed his sons, seventy men, upon one stone, and have appointed Abimelech, the son of his handmaid, as a king over the inhabitants of Shechem, since he is your brother,
19 Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe Jerub-Baal na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka Abimelek bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ.
if therefore you are upright and have acted without fault with Jerubbaal and his house, then you should rejoice on this day in Abimelech, and he should rejoice in you.
20 Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼAbimelek pụta repịa unu, ndị Shekem na Bet Milo, ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị Shekem na Bet Milo, pụta repịa Abimelek.”
But if you have acted perversely, may fire go forth from him and consume the inhabitants of Shechem and the town of Millo. And may fire go forth from the men of Shechem and from the town of Millo, and devour Abimelech.”
21 Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu Abimelek bụ nwanna ya.
And when he had said these things, he fled and went away to Beer. And he lived in that place, out of fear of Abimelech, his brother.
22 Mgbe ọ gasịrị afọ atọ Abimelek bidoro ịchị Izrel,
And so Abimelech reigned over Israel for three years.
23 Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti Abimelek na ndị nwe obodo Shekem, nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide Abimelek.
And the Lord put a very grievous spirit between Abimelech and the inhabitants of Shechem, who began to detest him,
24 Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ Jerub-Baal asaa ahụ nʼisi Abimelek, na ndị Shekem ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya.
and to place blame for the crime of the killing of the seventy sons of Jerubbaal, and for the shedding of their blood, upon Abimelech, their brother, and upon the rest of the leaders of the Shechemites, who assisted him.
25 Nʼọnọdụ imegide ya, ndị Shekem doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka Abimelek mata na ihe dị otu a na-eme.
And they stationed an ambush against him at the summit of the mountains. And while they were waiting for his arrival, they committed robberies, taking spoils from those passing by. And this was reported to Abimelech.
26 Nʼoge ahụ, Gaal, nwa Ebed, chịkọtara ụmụnne ya ndị ikom gaa biri na Shekem, ndị Shekem nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ.
Now Gaal, the son of Ebed, went with his brothers, and crossed over to Shechem. And the inhabitants of Shechem, uplifted by his arrival,
27 Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara Abimelek.
departed into the fields, laying waste to the vineyards, and trampling the grapes. And while singing and dancing, they entered into the shrine of their god. And while feasting and drinking, they cursed Abimelech.
28 Mgbe ahụ, Gaal nwa Ebed sịrị, “Onye bụ Abimelek? Gịnị mere na anyị bụ ndị Shekem ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa Jerub-Baal? Ọ bụkwaghị Zebul bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ Hamọ, nna Shekem ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee Abimelek ofufe?
And Gaal, the son of Ebed, cried out: “Who is Abimelech, and what is Shechem, that we should serve him? Is he not the son of Jerubbaal, who has appointed Zebul, his servant, as ruler over the men of Hamor, the father of Shechem? Why then should we serve him?
29 A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga Abimelek. Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’”
I wish that someone would set this people under my hand, so that I might take away Abimelech from their midst.” And it was told to Abimelech, “Gather the multitude of an army, and approach.”
30 Mgbe Zebul onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe Gaal nwa Ebed kwuru, o were nnọọ oke iwe.
For Zebul, the ruler of the city, upon hearing the words of Gaal, the son of Ebed, became very angry.
31 O zigara Abimelek ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa Ebed na ndị ikwu ya abịala obodo Shekem. Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị.
And he sent messengers secretly to Abimelech, saying: “Behold, Gaal, the son of Ebed, has arrived at Shechem with his brothers, and he has set the city against you.
32 Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa.
And so, rise up in the night, with the people who are with you, and lie hidden in the field.
33 Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe Gaal na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.”
And at first light in the morning, as the sun is rising, rush upon the city. And when he goes out against you, with his people, do to him what you are able to do.”
34 Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo Shekem zoo onwe ha na nso obodo ahụ.
And so Abimelech rose up, with all his army, by night, and he set ambushes near Shechem in four places.
35 Gaal nwa Ebed pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe Abimelek na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta.
And Gaal, the son of Ebed, went out, and he stood at the entrance to the gate of the city. Then Abimelech rose up, and all the army with him, from the places of the ambushes.
36 Mgbe Gaal hụrụ ha, ọ kpọrọ Zebul si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” Zebul zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.”
And when Gaal had seen the people, he said to Zebul, “Behold, a multitude is descending from the mountains.” And he responded to him, “You are seeing the shadows of the mountains, as if they were the heads of men, and so you are being deceived by this error.”
37 Gaal kwukwara okwu sị, “Lee ndị mmadụ si nʼetiti ala ahụ na-arịdata, ndị ọzọ sikwa nʼakụkụ ụzọ ebe osisi iju ase dị.”
Again, Gaal said, “Behold, a people is descending from the middle of the land, and one company is arriving by the way that looks towards the oak.”
38 Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ Abimelek na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.”
And Zebul said to him: “Where is your mouth now, with which you said, ‘Who is Abimelech that we should serve him?’ Is this not the people that you were despising? Go out and fight against him.”
39 Ya mere, Gaal duuru ndị nwe Shekem pụọ ịlụso Abimelek ọgụ.
Therefore, Gaal went out, with the people of Shechem watching, and he fought against Abimelech,
40 Ma Abimelek chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ.
who pursued him, fleeing, and drove him into the city. And many were cut down on his side, even to the gate of the city.
41 Abimelek nọgidere nʼAruma nʼoge ahụ. Ma Zebul chụpụrụ Gaal na ndị ikwu ya site na Shekem.
And Abimelech made camp at Arumah. But Zebul expelled Gaal and his companions from the city, and he would not permit them to remain in it.
42 Nʼechi ya, ndị Shekem pụtara baa nʼọhịa. E mere ka Abimelek mara nke a.
Therefore, on the following day, the people departed into the field. And when this had been reported to Abimelech,
43 Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha.
he took his army, and divided it into three companies, and he placed ambushes in the fields. And seeing that the people had departed from the city, he rose up and rushed upon them,
44 Abimelek na usuu ndị agha so ya mapụtara, gbara ọsọ were ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Emesịa, ụzọ abụọ nʼime ụzọ atọ nke ndị agha na-eso ya chere ihu nʼọhịa gbuo ndị ahụ niile nọ nʼebe ahụ.
along with his own company, assaulting and besieging the city. But the two other companies pursued the enemies scattered in the field.
45 Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile.
Now Abimelech assaulted the city all that day. And he seized it, and he killed its inhabitants, and he destroyed it, so much so that he scattered salt in it.
46 Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu Shekem nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El Berit.
And when those living in the tower of Shechem had heard about this, they entered the temple of their god, Berith, where they had formed a covenant with him. And it was because of this, that the place had taken its name. And it was greatly fortified.
47 Mgbe Abimelek nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ,
Abimelech, also hearing that the men of the tower of Shechem had joined together,
48 ya na ndị agha ya rigoro ugwu Zalmon. O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.”
ascended to mount Zalmon, with all his people. And taking an axe, he cut down the branch of a tree. And laying it on his shoulder, and carrying it, he said to his companions, “What you see me do, you must do quickly.”
49 Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro Abimelek. Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu Shekem, nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ.
And so, eagerly cutting down branches from the trees, they followed their leader. And surrounding the fortified place, they set it on fire. And so it happened that, by smoke and fire, one thousand persons died, men and women together, the occupants of the tower of Shechem.
50 Ọzọ, Abimelek gara obodo Tebez lụso ya agha, merie ya.
Then Abimelech, setting out from there, arrived at the town of Thebez, which he surrounded and besieged with his army.
51 Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ.
Now there was, in the midst of the city, a high tower, to which men and women were fleeing together, with all the leaders of the city. And, having very strongly sealed the gate, they were standing on the roof of the tower to defend themselves.
52 Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ,
And Abimelech, drawing near the tower, fought valiantly. And approaching the gate, he strove to set it on fire.
53 otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya.
And behold, one woman, throwing a fragment of a millstone from above, struck the head of Abimelech, and broke his skull.
54 Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara.
And he quickly called to his armor bearer, and said to him, “Draw your sword and strike me, otherwise it may be said that I was slain by a woman.” And, doing as he was ordered, he killed him.
55 Mgbe ndị Izrel hụrụ na Abimelek anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha.
And when he was dead, all those of Israel who were with him returned to their homes.
56 Otu a ka Chineke si kwụghachi Abimelek ihe ọjọọ o mere megide nna ya site nʼigbu iri ụmụnna ya asaa.
And so did God repay the evil that Abimelech had done against his father by killing his seventy brothers.
57 Chineke mekwara ka ndị Shekem nata ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ ha. Ọbụbụ ọnụ Jotam nwa Jerub-Baal mezukwara nʼisi ha.
The Shechemites also were given retribution for what they had done, and the curse of Jotham, the son of Jerubbaal, fell upon them.