< Ndị Ikpe 8 >

1 Ndị Ifrem jụrụ Gidiọn ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji meso anyị mmeso dị otu a? Ọ bụ gịnị mere i zighị ozi kpọ anyị mgbe ị gara ibuso ndị Midia agha?” Ha tara ya ụta nke ukwuu.
The men of Ephraim said to him, "Why have you done such a thing to us, not calling us when you went to fight with Midian?" And they argued with him fiercely.
2 Ma Gidiọn zaghachiri ha sị, “Gịnị ka m rụpụtara e ji atụnyere nke unu. Ọ bụ na ntụtụkọta ihe ubi Ifrem adịghị mma karịa owuwe ihe ubi nke Abieza?
He said to them, "What have I now done in comparison with you? Isn't the gleaning of the grapes of Ephraim better than the vintage of Abiezer?
3 Chineke nyefere unu Oreb na Zeeb, ndị ndu Midia, nʼaka. Gịnị ka m rụpụtara a ga-eji tụnyere nke unu?” Okwu a mere ka ọnụma ha nʼebe ọ nọ dajụọ.
God has delivered into your hand the princes of Midian, Oreb and Zeeb; and what was I able to do in comparison with you?" Then their anger subsided toward him, when he had said that.
4 Nʼoge a, Gidiọn gabigara, gafee osimiri Jọdan, ya na narị ndị agha atọ so ya. Ike gwụrụ ha nke ukwuu ma ha nọgidere na-achụsi ndị iro ha ọsọ ike.
Gideon came to the Jordan, and passed over, he, and the three hundred men who were with him, exhausted and famished.
5 Ọ sịrị ndị ikom Sukọt, “Nyetụnụ ndị agha m achịcha nʼihi na ike gwụrụ ha. Ana m na-achụso Zeba na Zalmuna, ndị eze Midia ọsọ.”
He said to the men of Succoth, "Please give loaves of bread to the people who follow me; for they are exhausted, and I am pursuing after Zebah and Zalmunna, the kings of Midian."
6 Ma ndịisi Sukọt sịrị, “Anyị ga-esi aṅaa nye ndị agha gị achịcha? Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị?”
The princes of Succoth said, "Are the hands of Zebah and Zalmunna now in your hand, that we should give bread to your army?"
7 Mgbe ahụ, Gidiọn zaghachiri, “Nʼihi nke a, mgbe Onyenwe anyị nyefere m Zeba na Zalmuna nʼaka, aga m eji ogwu na ụga na-epu nʼọzara dọkasịa unu ahụ.”
Gideon said, "Therefore when the LORD has delivered Zebah and Zalmunna into my hand, then I will thresh your flesh with the thorns of the wilderness and with briers."
8 O sitere nʼebe ahụ gaa Peniel rịọkwaa ndị obodo ahụ otu arịrịọ ahụ. Ma otu ụdị ọsịsa ahụ ndị Sukọt nyere ka ndị Peniel nyekwara.
He went up there to Penuel, and spoke to them in like manner; and the men of Penuel answered him as the men of Succoth had answered.
9 Ya mere, ọ gwara ndị ikom Peniel sị, “Mgbe m nwere mmeri lọta, aga m akwatu ụlọ elu a.”
He spoke also to the men of Penuel, saying, "When I come again in peace, I will break down this tower."
10 Nʼoge a, Zeba na Zalmuna na puku ndị agha iri na ise fọdụụrụ ha nọ na Kako. Ndị a bụ naanị ndị agha fọdụrụ nʼime usuu ndị agha ndị Midia niile. Nʼihi na ọnụọgụgụ ndị agha e gburu egbu dị narị puku na iri puku abụọ.
Now Zebah and Zalmunna were in Karkor, and their armies with them, about fifteen thousand men, all who were left of all the army of the Kedemites; for there fell one hundred twenty thousand men who drew sword.
11 Gidiọn rigoro site ụzọ ndị na-achị anụ ụlọ nke dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Nọba na Jogbeha, bịakwasị ndị agha ahụ na mberede nʼihi na ha nọ nʼatụghị egwu ihe ọbụla ime ha.
And Gideon went up by the way of those who dwell in tents on the east of Nobah and Jogbehah, opposite Zebah, and struck the army, when the army was unsuspecting.
12 Zeba na Zalmuna, eze abụọ ndị Midia, gbapụrụ ọsọ, ma Gidiọn na ndị agha ya chụgidere ha ọsọ, jide ha. Ha gweriri ndị agha ha niile.
Zebah and Zalmunna fled, and he pursued after them, and he took the two kings of Midian, Zebah and Zalmunna, and routed the entire army.
13 Emesịa, Gidiọn nwa Joash, sitere nʼokporoụzọ Heres lọta agha ahụ.
Gideon the son of Joash returned from the battle from the ascent of Heres.
14 Nʼebe ahụ ka Gidiọn nọ jide otu nwokorobịa onye Sukọt. O jụrụ ya ajụjụ, nwokorobịa ahụ depụtakwaara ya aha ndịisi obodo Sukọt. Ha dị iri asaa na asaa, ndị okenye obodo ahụ.
He caught a young man of the men of Succoth, and inquired of him: and he described for him the officials of Succoth, and its elders, seventy-seven men.
15 Mgbe Gidiọn bịaruru obodo Sukọt, ọ gwara ha okwu sị, “Ngwa leenụ Zeba na Zalmuna ndị unu kparịrị m maka ha, kwuo sị, ‘Ijidela Zeba na Zalmuna nʼaka gị ugbu a nke mere na anyị ga-enye ndị ikom gị ike gwụrụ achịcha?’”
He came to the men of Succoth, and said, "Look Zebah and Zalmunna, concerning whom you taunted me, saying, "Are the hands of Zebah and Zalmunna now in your hand, that we should give bread to your men who are weary?"
16 O jidere ndị okenye obodo ahụ, were ogwu na ụga taa ndị ikom Sukọt ahụhụ ime ka ha mara ihe.
He took the elders of the city, and thorns of the wilderness and briers, and with them he threshed the men of Succoth.
17 Ọ kwaturu ụlọ elu Peniel gbukwaa ndị ikom obodo ahụ niile.
He broke down the tower of Penuel, and killed the men of the city.
18 Mgbe ahụ, ọ jụrụ Zeba na Zalmuna, “Ndị ikom dị aṅaa ka unu gburu na Taboa?” Ha zara sị ya, “Ha nwere ụdịdị ka gị onwe gị, onye ọbụla nwere ụdịdị dịka nwa eze.”
Then he said to Zebah and Zalmunna, "What kind of men were they whom you killed at Tabor?" They answered, "As you are, so were they; each one resembled the son of a king."
19 Gidiọn zaghachiri sị, “Ndị ahụ bụ ụmụnne m ndị ikom, ndị nke nne m mụrụ. Ugbu a, Onyenwe anyị nʼonwe ya maara na a sị na unu egbughị ha, agaraghị m egbu unu.”
He said, "They were my brothers, the sons of my mother. As the LORD lives, if you had saved them alive, I would not kill you."
20 O chigharịrị gwa Jeta, ọkpara ya, sị ya, “Gbuo ha!” Ma Jeta amịpụtaghị mma, nʼihi na ọ bụ naanị nwokorobịa. Ọ tụrụ egwu igbu ha.
He said to Jether his firstborn, "Get up, and kill them." But the youth did not draw his sword; for he feared, because he was yet a youth.
21 Zeba na Zalmuna, gwara Gidiọn okwu sị, “Jiri aka gị gbuo anyị. ‘A hụ dimkpa, a hụ ike ya.’” Nʼihi nke a, Gidiọn were aka ya gbuo ha, chịkọrọkwa ihe olu niile ha nyakwasịrị ịnyịnya kamel ha nʼolu.
Then Zebah and Zalmunna said, "Rise up yourself, and kill us, for a man is judged by his strength." Gideon arose, and killed Zebah and Zalmunna, and took the crescent ornaments that were on their camels' necks.
22 Mgbe ahụ, ndị Izrel gwara Gidiọn sị ya, “Bịa ka ị bụrụ eze anyị! Gị na ụmụ gị ndị ikom, na ezinaụlọ gị niile, ga-abụ ndị ga-achị, nʼihi na ị gbapụtala anyị site nʼaka usuu ndị agha Midia.”
Then the men of Israel said to Gideon, "Rule over us, both you, and your son, and your son's son also; for you have saved us out of the hand of Midian."
23 Ma Gidiọn gwara ha okwu sị, “Mụ onwe m na ụmụ m agaghị abụ eze unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ eze unu.”
Gideon said to them, "I will not rule over you, neither shall my son rule over you: the LORD shall rule over you."
24 Ọ sịrị, “Enwere m otu arịrịọ m ga-arịọ unu. Onye ọbụla nʼime unu nye m ọlantị site nʼoke unu nwetara site nʼihe nkwata nʼagha.” (Ọ bụ omenaala ndị Ishmel niile iyi ọlantị ọlaedo.)
Gideon said to them, "I would make a request of you, that you would give me every man the earrings from his plunder." (For they had golden earrings, because they were Ishmaelites.)
25 Ha jiri obi ụtọ kwenye, gbasaa akwa nʼala, tinyechaa ọlantị ha nʼime ya. Onye ọbụla nʼime ha mere nke a.
They answered, "We will willingly give them." They spread a garment, and every one of them threw an earring from his plunder.
26 Ịdị arọ nke ọlantị ọlaedo ndị a bụ otu puku na narị shekel asaa, na-agụnyeghị ihe ịchọ mma ndị ọzọ, na ihe olu, na uwe odo odo ndị eze Midia na-eyi, na ihe olu dị nʼolu ịnyịnya kamel ha.
The weight of the golden earrings that he requested was one thousand and seven hundred pieces of gold, besides the crescents, and the pendants, and the purple clothing that was on the kings of Midian, and besides the chains that were about their camels' necks.
27 Gidiọn jiri ọlaedo ahụ niile kpụọ efọọd debe ya nʼOfra, nʼobodo nke aka ya. Ma mgbe na-adịghị anya, ụmụ Izrel niile malitere ịgbaso na ife ihe ahụ ofufe. Nʼụzọ dị otu a, ọ ghọọrọ Gidiọn na ezinaụlọ ya ihe ịma nʼọnya.
Gideon made an ephod of it, and put it in his city, even in Ophrah: and all Israel prostituted themselves after it there; and it became a snare to Gideon, and to his house.
28 Otu a ka Midia si ghọọ ndị Izrel meriri emeri. Midia eweliteghị isi ya ọzọ. Nʼihi nke a, Izrel biri nʼudo iri afọ anọ, nʼụbọchị niile Gidiọn dị ndụ.
So Midian was subdued before the children of Israel, and did not become a threat again. The land had rest forty years in the days of Gideon.
29 Jerub-Baal, nwa Joash laghachiri nʼụlọ nke aka ya, biri nʼebe ahụ.
Jerubbaal the son of Joash went and lived in his own house.
30 Ọ mụtakwara iri ụmụ ndị ikom asaa, nʼihi na ọ lụrụ ọtụtụ ndị inyom.
Gideon had seventy sons conceived from his body; for he had many wives.
31 O nwekwara iko nwanyị nʼobodo Shekem, onye mụtaara ya nwa nwoke aha ya bụ Abimelek.
His secondary wife who was in Shechem, she also bore him a son, and he named him Abimelech.
32 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Gidiọn nwa Joash, nwụrụ, mgbe ọ kasịrị nka nke ukwu. E liri ya nʼili nna ya Joash nʼobodo Ofra, nʼala Abieza.
Gideon the son of Joash died in a good old age, and was buried in the tomb of Joash his father, in Ophrah of the Abiezrites.
33 Ọ dịghị anya ka Gidiọn nwụsịrị, ụmụ Izrel laghachiri azụ bido ife chi Baal. Ha guzobere Baal-Berit ka ọ bụrụ chi ha.
It happened, as soon as Gideon was dead, that the children of Israel turned again, and played the prostitute after the Baals, and made Baal Berith their god.
34 Ma ụmụ Izrel echetaghị Onyenwe anyị Chineke ha, onye napụtara ha site nʼaka ndị iro ha niile gbara ha gburugburu.
The children of Israel did not remember the LORD their God, who had delivered them out of the hand of all their enemies on every side;
35 Ha ekwesighịkwa ntụkwasị obi nye ezinaụlọ Jerub-Baal (ya bụ Gidiọn) dịka ezi ihe niile o mere ha si dị.
neither did they show kindness to the house of Jerubbaal, who is Gideon, according to all the goodness which he had shown to Israel.

< Ndị Ikpe 8 >