< Ndị Ikpe 7 >

1 Jerub-Baal, onye bụkwa Gidiọn, na ndị agha ya niile biliri nʼisi ụtụtụ, maa ụlọ ikwu ha nʼisi iyi Harod. Ma ndị agha Midia mara ụlọ ikwu nke ha nʼakụkụ ugwu ebe ndị Izrel nọ, nʼime ndagwurugwu nke dị nso nʼugwu nta More.
Ndipo Yerubaali (yaani Gideoni) akainuka mapema, na watu wote waliokuwa pamoja naye, wakaweka kambi kando ya chemchemi ya Harodi. Kambi ya Midiani ilikuwa kaskazini mwao katika bonde karibu na kilima cha More.
2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Lee, ndị ikom gị dị ọtụtụ. Agaghị m enyefe ndị Midia nʼaka ha, ma ọ bụghị otu a, Izrel ga-anya isi megide m, sị, ‘Ike aka m azọpụtala m.’
Bwana akamwambia Gideoni, Kuna askari wengi sana kwa mimi kukupa ushindi juu ya Wamidiani, ili Waisraeli wasijisifu juu yangu, wakisema, 'Nguvu zetu zimetuokoa'.
3 Ugbu a, maa ọkwa nye ndị agha sị ha, ‘Onye ọbụla ụjọ na-atụ, ya hapụ ugwu Gilead laghachi azụ.’” Nʼihi nke a, iri puku ndị agha abụọ na abụọ laghachiri azụ nʼụlọ nke aka ha. Ma ndị agha dị puku iri nʼọnụọgụgụ fọdụrụ.
Basi, tangaza masikioni mwa watu, ukisema, Yeyote anayeogopa, anayetetemeka, arudi na atoke katika mlima Gileadi. 'Basi, watu elfu ishirini na mbili wakaondoka, na elfu kumi wakabaki.
4 Ma Onyenwe anyị gwara Gidiọn, sị ya, “Lee, ndị agha gị ka dị ọtụtụ. Duru ha gbada na mmiri ala, m ga-anwale ha ma webilatara gị ọnụọgụgụ ha nʼebe ahụ. Ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a ga-eso gị jee,’ ọ ga-eje, ma ọ bụrụ na m sị, ‘Onye nke a agaghị eso gị jee,’ ọ gaghị eso jee.”
Bwana akamwambia Gideoni, 'Watu bado ni wengi sana. Wapeleke chini kwenye maji, na nitafanya idadi yao iwe ndogo kwa ajili yako. Kama nikisema, 'Huyu atakwenda pamoja nawe,' atakwenda pamoja nawe; lakini kama nikisema, 'Huyu hawezi kwenda pamoja nawe,' hatakwenda. '
5 Ya mere, Gidiọn duuru ha bịa na mmiri ala ahụ. Nʼebe ahụ, Onyenwe anyị gwara ya okwu sị ya, “Kewapụ ndị ji ire ha rachara mmiri dịka nkịta, site na ndị ahụ gburu ikpere nʼala ịṅụ mmiri.”
Gideoni akawapeleka watu kwenye maji; Bwana akamwambia, “Ondoa kila mtu atakayelamba maji, kama mbwa alambavyo, kutoka kwa wale wanaopiga magoti na kunywa.”
6 Ọ bụ naanị narị ndị agha atọ ji ọbụ aka ha kwọlịte mmiri ha ṅụrụ. Ma ndị agha fọdụrụ gburu ikpere ha abụọ nʼala tinye ọnụ ha na mmiri, ṅụọ mmiri.
Wanaume mia tatu walilamba. Wengine wote walipiga magoti kunywa maji.
7 Onyenwe anyị sịrị Gidiọn, “Ọ bụ narị ndị ikom atọ ndị a raara mmiri ka m ga-eji zọpụta gị, ma rarakwa ndị Midia nye gị nʼaka. Zilaga ndị fọdụrụ ka ha laa nʼụlọ nke aka ha.”
Bwana akamwambia Gideoni, “Kwa watu hawa mia tatu waliokwisha kulamba maji, nitakuokoa na kukupa ushindi juu ya Wamidiani. Acha kila mtu arudi mahali pake.”
8 Gidiọn zilagara ndị Izrel ndị a nʼụlọ ikwu ha ma hapụ naanị narị mmadụ atọ ndị napụtara ndị ahụ na-ala ala ngwongwo niile ha ji ebu agha, na opi ike. Ndị Midia mara ụlọ ikwu ha na ndagwurugwu, nʼebe na-adịghị anya site nʼebe Gidiọn nọ.
Kwa hiyo wale waliochaguliwa walichukua vifaa vyao na tarumbeta zao. Gideoni akawarudisha watu wote wa Israeli, kila mtu kwenda kwenye hema yake, lakini akawaweka watu mia tatu. Basi kambi ya Midiani ilikuwa chini yake katika bonde.
9 Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị gwara Gidiọn okwu sị ya, “Bilie, gaa lụso ọmụma ụlọ ikwu ahụ agha, nʼihi na ana m aga inyefe ha nʼaka gị.
Usiku huo huo Bwana akamwambia, “Simama! Kavamie kambi, kwa maana nitakupa ushindi juu yake.
10 Ma ọ bụrụ na ụjọ na-atụ gị ibuso ha agha, duru Pura onyeozi gị gaa nso nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ,
Lakini ikiwa unaogopa kushuka, shka kwenye kambi pamoja na Purh mtumishi wako,
11 ṅaa ntị, nụrụ ihe ha na-ekwu. Emesịa, ị ga-abụ onye a gbara ume ibu agha megide ọmụma ụlọ ikwu ahụ.” Ya mere, ya na Pura onyeozi ya gara nʼebe dị nso, nʼebe ndị nche ọmụma ụlọ ikwu ahụ nọ.
na usikilize kile wanachosema, na ujasiri wako utaimarishwa kushambulia kambi.” Basi Gidioni akaenda pamoja na Pura mtumishi wake, mpaka chini kwa walinzi wa kambi.
12 Ma lee, usuu ndị agha Midia, na ndị Amalek, na ndị obodo ndị ọzọ ahụ si nʼọwụwa anyanwụ bịa jupụtara na ndagwurugwu ahụ dị ka igurube. Nʼezie, ịnyịnya kamel ha dị ọtụtụ, dịka aja dị nʼakụkụ oke osimiri.
Wamidiani, Waamaleki, na watu wote wa mashariki walikaa karibu na bonde, wengi kama wingu la nzige. Ngamia zao walikuwa zaidi ya mawingu; walikuwa zaidi kuliko idadi ya mchanga katika bahari.
13 Gidiọn rutere mgbe otu onye nọ na-akọrọ enyi ya banyere nrọ ọ rọrọ. Ọ na-asị, “Arọrọ m nrọ, ebe otu ogbe achịcha dị gburugburu, e ji ọka balị mee dabatara nʼime ụlọ ikwu ndị Midia. O ji ike dị egwu tie ụlọ ikwu a, nke mere na ụlọ ikwu a dajiri, kpuo ihu nʼala.”
Gideoni alipofika huko, mtu alikuwa akimwambia mwenzake ndoto. Mtu huyo akasema, “Angalia! Niliota ndoto, na nikaona mkate wa shayiri umeanguka ndani ya kambi ya Midiani. Ukaja hemani, na kuipiga kwa nguvu sana hata ikaanguka chini ikapinduka na kulala chini. '
14 Onye ibe ya zara sị, “Nke a abụghị ihe ọzọ karịa mma agha Gidiọn nwa Joash, onye Izrel na-aga ịbịakwute anyị nʼebe a. Chineke enyefeela ndị Midia na ụlọ ikwu ya niile nʼaka ya.”
Mtu mwingine akasema, 'Hii si kitu kingine isipokuwa upanga wa Gideoni (mwana wa Yoashi), Mwisraeli. Mungu amempa ushindi juu ya Midiani na jeshi lake lote. '
15 Mgbe Gidiọn nụrụ nrọ ahụ, na nkọwa ya, ọ kpọrọ isiala kelee Chineke. Ọ laghachiri na ọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel sị ha, “Bilienụ ọtọ! Nʼihi na Onyenwe anyị enyefeela unu ọmụma ụlọ ikwu ndị Midia nʼaka.”
Gideoni aliposikia habari ya ile ndoto na tafsiri yake, akainama chini na kuabudu. Alirudi kwenye kambi ya Israeli na kusema, “Simameni! Bwana ametupa ushindi juu ya jeshi la Midiani.”
16 O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, nyekwa onye ọbụla nʼime ha opi ike, na ite aja nke iheọkụ dị nʼime ya.
Akawagawa watu mia tatu katika makundi matatu, na akawapa tarumbeta zote na mitungi tupu, na taa ndani ya kila mtungi.
17 Ọ sịrị ha, “Unu na-ele m anya, meekwa ihe m na-eme. Mgbe anyị bịaruru nso na mpụta ebe ụlọ ikwu ahụ dị, meenụ ihe ọbụla unu hụrụ m mere.
Akawaambia, 'Niangalieni mimi na kufanya yale ninayoyafanya. Tazama! Ninapofika kwenye mwisho wa kambi, ni lazima mfanye kile ninachofanya.
18 Mgbe ọbụla mụ na ndị so m nʼazụ fụrụ opi ike anyị, unu niile ga-afụkwa opi ike unu nʼakụkụ ọbụla unu nọ, tie mkpu, sị, ‘Anyị dịnyere Onyenwe anyị, dịnyekwara Gidiọn.’”
Nitakapopiga tarumbeta, mimi na wote Mlio pamoja nami, basi mtapiga tarumbeta zenu katika kila upande wa kambi nzima na kupiga kelele, “Kwa Bwana na Gideoni!”
19 Nʼabalị ahụ, mgbe etiti abalị ahụ gabigasịrị, Gidiọn na narị ndị agha ya gbeere egbere ruo na mpụta ebe ndị agha Midia mara ụlọ ikwu ha. Nʼoge a, ha ka gbanwere ndị agha na-eche nche.
Basi Gideoni na watu mia moja waliokuwa pamoja naye walifika mwisho wa kambi, hapo mwanzoni mwa saa ya kati. Wakati Wamidiani walikuwa wakibadilisha walinzi, walipiga tarumbeta na kuvunja mitungi iliyokuwa mikononi mwao.
20 Ụzọ ndị agha Gidiọn atọ ahụ fụrụ opi ike ha, tiwakwaa ite aja ha. Ha ji ọwaọkụ ndị ahụ nʼaka ekpe ha na opi ike ha gaje igbu nʼaka nri ha, ha tiri mkpu sị, “Mma agha Onyenwe anyị, na mma agha Gidiọn!”
Vikosi vitatu vilipiga tarumbeta na kuvunja mitungi. Walikuwa na taa katika mikono yao ya kushoto na tarumbeta katika mikono yao ya kulia ili kuwapiga. Walipiga kelele, “Upanga wa Bwana na wa Gideoni.”
21 Onye ọbụla nʼime ha guzoro nʼebe o kwesiri ịnọ gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ndị Midia niile malitere ịgba ọsọ, na-etikwa mkpu akwa mgbe ha na-agbalaga.
Kila mtu alisimama mahali pake kando ya kambi na jeshi la Midiani likakimbia. Walipiga kelele na kukimbia
22 Mgbe ha fụrụ narị opi ike atọ ndị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ndị ikom niile nọ nʼakụkụ niile nke ọmụma ụlọ ikwu ahụ tụgharịa were mma agha gburịta onwe ha. Ndị agha ahụ gbapụrụ ọsọ gbara gaa Bet-Shita nʼụzọ Zerera, gbarukwaa nke oke ala Ebel-Mehola, nke dị nso Tabat.
Walipopiga tarumbeta mia tatu, Bwana akaweka upanga wa kila mtu wa Midiani dhidi ya wenzake na dhidi ya jeshi lake lote. Jeshi likimbia mpaka Bethshita kuelekea Serera, mpaka mpaka wa Abel Mehola, karibu na Tabathi.
23 A kpọpụtara ndị Izrel si Naftalị, na Asha na Manase niile ka ha pụta chụso ndị Midia ọsọ.
Watu wa Israeli kutoka Naftali, Asheri, na Manase wote waliitwa nje, nao wakawafuata Midiani.
24 Gidiọn ziri ozi nʼala ugwu ugwu Ifrem sị ha, “Pụtanụ gbochie ụzọ niile ndị Midia si agbafe. Cheenụ ọnụ mmiri Jọdan niile nche ruo na Bet-Bara.” Ya mere, a kpọpụtara ndị ikom niile nọ na Ifrem, bụ ndị gbochiri mmiri Jọdan ruo na Bet-Bara.
Gideoni akatuma wajumbe katika nchi zote za mlima wa Efraimu, akisema, “Nenda chini dhidi ya Midiani na umiliki Mto Yordani mpaka Bethbara, ukawazuie.” Basi wanaume wote wa Efraimu walikusanyika pamoja na kuimiliki maji, mpaka Bethbara na Mto Yordani.
25 Ha jidekwara ọchịagha ndị Midia abụọ, ndị aha ha bụ Oreb na Zeeb. Ha gburu Oreb nʼelu nkume nke na-aza aha ya ruo taa. E gbukwara Zeeb nʼebe a na-azọcha vaịnị. Ebe ahụ na-azakwa aha Zeeb ruo taa. Ha bipụrụ Oreb na Zeeb isi buru ha jekwuru Gidiọn nʼakụkụ osimiri Jọdan.
Wakawatwaa wakuu wawili wa Midiani, Orebu na Zeebu. Wakamwua Orebu kwenye mwamba wa Orebu, nao wakamwua Zeebu katika shinikizo la divai la Zeebu. Wakawafuata Wamidiani, wakamletea Gideoni vichwa vya Orebu na Zeebu, ng'ambo ya pili ya Yordani.

< Ndị Ikpe 7 >