< Ndị Ikpe 4 >

1 Mgbe Ehud nwụsịrị, ụmụ Izrel mekwara ihe ọjọọ megide Onyenwe anyị.
Baada ya Ehudi kufa, watu wa Israeli walifanya tena yaliyo mabaya machoni pa Bwana.
2 Nʼihi ya, Onyenwe anyị renyere ha nʼaka Jabin, eze Kenan, onye chịrị nʼobodo Hazọ. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi nʼobodo a na-akpọ Heroshet Hagoyim.
Bwana akawatia mkononi mwa Yabini, mfalme wa Kanaani, aliyewala huko Hasori. Kamanda wa jeshi lake aitwaye Sisera, naye aliishi Harosheti ya Mataifa.
3 Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.
Wana wa Israeli wakamwomba Bwana awasaidie, kwa sababu Sisera alikuwa na magari ya chuma mia tisa na akawashinda wana wa Israeli kwa nguvu kwa miaka ishirini.
4 Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel.
Basi Debora, nabii wa kike (mke wa Lapidothi), alikuwa mwamuzi anayeongoza katika Israeli wakati huo.
5 Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.
Naye aliketi chini ya mtende wa Debora kati ya Rama na Betheli katika nchi ya mlima wa Efraimu, na watu wa Israeli walimwendea ili kutatua migogoro yao.
6 O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa.
Akamtuma Baraka mwana wa Abinoamu kutoka Kedeshi huko Naftali. Akamwambia, Bwana, Mungu wa Israeli, anakuamuru, Nenda katika mlima wa Tabori, uende pamoja nawe watu elfu kumi kutoka Naftali na Zabuloni.
7 Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’”
Nitamfukuza Sisera, jemadari wa jeshi la Yabini, akutane nawe karibu na mto Kishoni, pamoja na magari yake na jeshi lake, na nitakupa ushindi juu yake. '
8 Barak sịrị ya, “Ejikeere m ịga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m. Ọ bụrụkwanụ na ị jụ iso m, agaghị m aga.”
Baraka akamwambia, 'Ikiwa utakwenda nami, nitakwenda, lakini ikiwa huendi pamoja nami, sitaenda.'
9 Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh.
Alisema, 'Nitakwenda nawe. Hata hivyo, njia unayoienda haitakupa heshima wewe, kwa kuwa Bwana atamuuza Sisera mkononi mwa mwanamke. Ndipo Debora akainuka, akaenda pamoja na Baraka Kedeshi.
10 Barak sitere nʼebo Zebụlọn na Naftalị kpọkọtaa ndị ikom ga-eso ya jee agha ahụ, puku ndị agha iri ndị dịnyere ya. Debọra sokwa ya jee.
Baraki akawaita wana wa Zebuloni na Naftali kusanyika Kedeshi. Watu elfu kumi walimfuata, na Debora akaenda pamoja naye.
11 Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.
Heberi (Mkeni) alijitenganisha na Wakeni - walikuwa wazao wa Hobabu (mkwe wa Musa) - na akaweka hema yake mwaloni uliopo huko Saanaimu karibu na Kedesh.
12 Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa,
Walipomwambia Sisera kwamba Baraka, mwana wa Abinoamu, alikuwa amekwenda mlima wa Tabori,
13 Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.
Sisera akawaita magari yake yote, magari ya farasi mia tisa, na askari wote waliokuwa pamoja naye, kutoka Haroshethi ya Mataifa mpaka Mto Kishoni.
14 Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.
Debora akamwambia Baraka, Nenda! Kwa maana hii ndiyo siku ambayo Bwana amekupa ushindi juu ya Sisera. Je! si Bwana anayekuongoza? Basi Baraka akashuka kutoka mlima wa Tabori na watu kumi elfu wakamfuata.
15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.
Bwana alifanya jeshi la Sisera kuchanganyikiwa, magari yake yote, na jeshi lake lote. Watu wa Baraka waliwashinda na Sisera akaanguka kutoka kwenye gari lake na kukimbia kwa miguu.
16 Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.
Lakini Baraka akayafuata magari na jeshi mpaka Haroshethi ya Mataifa, na jeshi lote la Sisera likauawa kwa upanga, wala hakuna mtu aliyeokoka.
17 Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken.
Lakini Sisera akakimbia kwa miguu mpaka hema ya Yaeli, mkewe Heberi Mkeni; kwa sababu kulikuwa na amani kati ya Yabini mfalme wa Hazori, na nyumba ya Heberi Mkeni.
18 Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya.
Jaeli akatoka kumlaki Sisera, akamwambia, karibu, bwana wangu; karibu kwangu, wala usiogope. Basi akakaribia kwake, akaingia hemani kwake, naye akamvika bushuti.
19 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya.
Akamwambia, Tafadhali nipe maji kidogo ninywe, kwa maana nina kiu. Alifungua mfuko wa ngozi ya maziwa akampa anywe, kisha akamfunika tena.
20 Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’”
Akamwambia, “Simama mlangoni pa hema. Ikiwa mtu atakuja na kukuuliza, 'Je, kuna mtu hapa?', Sema 'Hapana'.”
21 Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.
Kisha Jaeli (mke wa Heberi) akachukua kigingi cha hema na nyundo mkononi mwake akamwendea kwa siri, kwa sababu alikuwa amelala usingizi mzito, naye akakitia kigingi cha hema upande wa kichwa chake akamchoma na kikapenya kushuka chini. Hivyo akafa.
22 Mgbe Barak bịara ịchọ Sisera, Jael jekwuru ya sị, “Bịa ka m gosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” Barak sooro ya jee, ma lee, Sisera anwụọlarị site na ǹtu ahụ a kpọrọ ya nʼisi.
Baraka alipokuwa akimfuata Sisera, Jaeli alitoka kukutana naye akamwambia, “Njoo, nitakuonyesha mtu unayemtafuta.” Basi akaingia pamoja naye, tazama Sisera amekufa, na kigingi cha hema kando ya kichwa chake.
23 Nʼụbọchị ahụ, Chineke meriri Jabin, eze ndị Kenan nʼihu ụmụ Izrel.
Basi siku hiyo Mungu alimshinda Jabin, mfalme wa Kanaani, mbele ya watu wa Israeli.
24 Aka ụmụ Izrel bụ nke dị ike na-adịkwa ike nke ukwu megide Jabin bụ eze Kenan ruo mgbe ha lara ya nʼiyi.
Uwezo wa watu wa Israeli ulikua na nguvu zaidi dhidi ya Jabin mfalme wa Kanaani, hata walipomwangamiza.

< Ndị Ikpe 4 >