< Ndị Ikpe 4 >

1 Mgbe Ehud nwụsịrị, ụmụ Izrel mekwara ihe ọjọọ megide Onyenwe anyị.
厄胡得死後,以色列子民又行了上主視為惡的事。
2 Nʼihi ya, Onyenwe anyị renyere ha nʼaka Jabin, eze Kenan, onye chịrị nʼobodo Hazọ. Aha onyeisi ndị agha ya bụ Sisera, onye bi nʼobodo a na-akpọ Heroshet Hagoyim.
因此上主將他們交在客納罕王雅賓手中,他當時在哈祚爾為王,他的軍長息色辣駐紮在哈洛舍特哥因。
3 Nʼihi na o nwere narị ụgbọ agha igwe itoolu, ma megbukwaa ụmụ Izrel nke ukwu iri afọ abụọ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa, ka o nyere ha aka.
因為雅賓王有九百輛鐵甲車,極力壓迫以色列子民已有二十年之久,以色列子民遂呼籲上主。
4 Nʼoge a, Debọra, bụ nwanyị na-ebu amụma, nwunye Lapidọt bụ onyendu ụmụ Izrel.
當時有一位女先知德波辣是拉丕多特的妻子,作以色列的民長。
5 Ọ na-anọ nʼokpuru osisi nkwụ a na-akpọ Nkwụ Debọra, nke dị nʼagbata Rema na Betel, bụ nʼala ugwu ugwu Ifrem na-ekpe ikpe. Nʼebe ahụ ka ụmụ Izrel na-ejekwuru ya ka o doziere ha okwu ha niile.
她常坐在厄弗辣因山地、辣瑪和貝特耳中間那棵德波辣棕樹下,以色列子民都到她那裏去聽判斷。
6 O ziri ozi kpọọ Barak, nwa Abinoam, onye bi nʼobodo Kedesh, nke dị nʼime Naftalị, ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị Chineke ụmụ Izrel na-enye gị iwu, ‘Gaa chịkọtaa puku ndị agha iri bụ ndị sitere nʼebo Naftalị na Zebụlọn, duru ha jeruo ugwu Taboa.
她打發人從納斐塔里刻德士把阿彼諾罕的兒子巴辣克叫來,對他說:「這是上主以色列的上主的命令:你要從納斐塔里和則步隆子孫中,率領一萬人向大博爾山進發:
7 Aga m edute Sisera, ọchịagha ndị agha Jabin, mee ka ọ bịaruo nso iyi ukwu Kishọn, ya na ụgbọ agha ya niile na ndị agha ya niile ma nyefee ha nʼaka gị.’”
我要引領雅賓的將軍息色辣和他的車輛軍隊到克雄河畔,到你跟前來,把他交在你手中。」
8 Barak sịrị ya, “Ejikeere m ịga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m. Ọ bụrụkwanụ na ị jụ iso m, agaghị m aga.”
巴辣克對她說:「你若同我去,我就去;你若不同我去,我就不去。」
9 Debọra sịrị, “Aghaghị m isoro gị jee ma nʼihi mkpebi gị nʼihe a, nsọpụrụ agaghị abụ nke gị, nʼihi na Onyenwe anyị ga-enyefe Sisera nʼaka nwanyị.” Ya mere, Debọra biliri soro Barak jee obodo Kedesh.
她回答說:「我一定同你去,但是你此行並無光榮,因為上主要把息色辣交在一個女子手中。」於是德波辣起身同巴辣克往刻德士去了。
10 Barak sitere nʼebo Zebụlọn na Naftalị kpọkọtaa ndị ikom ga-eso ya jee agha ahụ, puku ndị agha iri ndị dịnyere ya. Debọra sokwa ya jee.
巴辣克召集則步隆和納斐塔里的子孫到刻德士去,跟他上去的有一萬人,德波辣也同他上去了。
11 Nʼoge a, Heba, onye Ken, ahapụla ndị Ken ndị ọzọ, ndị bụ ụmụ ụmụ Hobab, nwanne nwunye Mosis gaa maa ụlọ ikwu ya nʼokpuru osisi ukwu dị na Zaananim, nke dị nso Kedesh.
那時刻尼人赫貝爾離開別的刻尼人,離開梅瑟的姻親曷巴布的子孫,在刻德士附近的匝阿納寧橡樹旁支搭了帳幕。
12 Mgbe ha gwara Sisera na Barak nwa Abinoam arịgorola nʼelu ugwu Taboa,
有人報告息色辣;阿彼諾罕的兒子巴辣克已上了大博爾山。
13 Sisera kpọkọtara ndị agha ya niile, tinyere narị ụgbọ agha itoolu ya, site na Haroshet Haroyim gaa nʼiyi ukwu Kishọn.
息色辣遂召集了他所有的車輛,即那九百輛鐵甲車,和隨從他的全軍,從哈洛舍特哥因出來。到了克雄河畔。
14 Mgbe ahụ, Debọra sịrị Barak, “Gaa nʼihu! Taa bụ ụbọchị nke Onyenwe anyị nyefere Sisera nʼaka gị. Ọ bụ na Onyenwe anyị apụbeghị jee nʼihu gị?” Nʼihi nke a, Barak duuru puku ndị agha iri ahụ gbada ndịda ugwu Taboa.
德波辣對巴辣克說:「起來! 因為今天上主已把息色辣交在你手中。上主不是走在你前面嗎﹖」於是巴辣克從大博爾山下來,那一萬人跟在他後面。
15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.
當時上主用利劍在巴辣克前面擾亂了息色辣和他的車輛以及他的軍隊,息色辣下車,徒步逃跑了。
16 Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ.
巴辣克就追趕車輛和軍隊,直追到哈洛舍特哥因;息色辣的全軍都喪身刀下,一個也沒有剩下。息色辣死
17 Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken.
息色辣徒步逃到刻尼人赫貝爾的妻子雅厄耳的帳幕那裏,因為哈祚爾王雅賓和刻尼人赫貝爾的家族相安無事。
18 Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya.
雅厄耳出來迎接息色辣,向他說:「我主! 請你躲起來,躲在我這裏,不必害怕! 」他就躲在她的帳幕裏;雅厄耳就用毯子蓋住他。
19 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya.
息色辣對她說:「請給我一點水喝! 因為我渴了。」她就打開皮囊給他奶喝,然後又蓋住他。
20 Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’”
息色辣又向她說:「你站在帳幕門口,若有人來問你說:這裏有人嗎﹖你就回答說:沒有。」
21 Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.
那時赫貝爾的妻子雅厄耳取了一根帳棚上的木橛,手裏拿著鎚子,悄悄走到息色辣前,把木橛釘在他的太陽穴裏,一直釘到地上;那時他正疲乏熟睡,就這樣死去。
22 Mgbe Barak bịara ịchọ Sisera, Jael jekwuru ya sị, “Bịa ka m gosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” Barak sooro ya jee, ma lee, Sisera anwụọlarị site na ǹtu ahụ a kpọrọ ya nʼisi.
那時巴辣克鄭在追趕息色辣,雅厄耳出來迎接他,對他說:「來! 我給你看看你所追尋的人。」他來到她那裏,看,息色辣已躺在那裏死了! 木橛在他的太陽穴中。
23 Nʼụbọchị ahụ, Chineke meriri Jabin, eze ndị Kenan nʼihu ụmụ Izrel.
這樣,那一天天主在以色列子民面前制伏了客納罕王雅賓。
24 Aka ụmụ Izrel bụ nke dị ike na-adịkwa ike nke ukwu megide Jabin bụ eze Kenan ruo mgbe ha lara ya nʼiyi.
以色列子民的力量日漸強大,超過了客納罕王雅賓,直到將他消滅。

< Ndị Ikpe 4 >