< Ndị Ikpe 3 >

1 Ndị a bụ aha mba dị iche iche Onyenwe anyị hapụrụ nʼala ahụ iji nwapụta ndị Izrel ahụ niile na-esoghị mgbe e buru agha nʼime ala Kenan.
Now these are the nations which Jehovah left, to prove Israel by them, even as many of Israel as had not known all the wars of Canaan;
2 O mere nke a naanị ka ọ kuziere ọgbọ niile ndị Izrel ibu agha, bụ ndị ahụ na-amabeghị ihe agha bụ nʼoge gara aga.
only that the generations of the children of Israel might know, to teach them war, at the least such as before knew nothing of it:
3 Ndịisi ise nke ndị Filistia, na ndị Kenan niile, ndị Saịdọn na ndị Hiv, ndị bi nʼelu ugwu Lebanọn, site nʼugwu Baal-Hemon ruo na mbata obodo Hamat.
namely, the five lords of the Philistines, and all the Canaanites, and the Sidonians, and the Hivites who lived on Mount Lebanon, from Mount Baal Hermon to Lebo Hamath.
4 A ga-esite na ndị a nwapụta okwukwe ụmụ Izrel ma ịmata ma ha ga-edebe iwu Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Mosis nye nna nna ha ochie.
They were left, to prove Israel by them, to know whether they would listen to the commandments of Jehovah, which he commanded their fathers by the hand of Moses.
5 Nʼihi nke a, ụmụ Izrel biri nʼetiti ndị Kenan, ndị Het, ndị Hiv, ndị Periz, ndị Amọrait, na ndị Jebus.
The children of Israel lived among the Canaanites, the Hethites, and the Amorites, and the Perizzites, and the Hivites, and the Jebusites:
6 Ha lụtaara onwe ha ụmụ ha ndị inyom na nwunye, werekwa ụmụ ha ndị inyom nye ụmụ ha ndị ikom, feekwa chi ha niile ofufe.
and they took their daughters to be their wives, and gave their own daughters to their sons and served their gods.
7 Ụmụ Izrel mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Ha chefuru Onyenwe anyị Chineke ha, malite ife chi Baal, na Ashera ofufe.
The children of Israel did that which was evil in the sight of Jehovah, and forgot Jehovah their God, and served the Baals and the Asheroth.
8 Nʼihi ya, iwe ọkụ Onyenwe anyị kpaliri megide ụmụ Izrel. Ọ raara ha nye nʼaka eze Kushan Rishataim, eze Aram Naharaim, onye ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ya afọ asatọ.
Therefore the anger of Jehovah was kindled against Israel, and he sold them into the hand of Cushan Rishathaim king of Aram Naharaim; and the children of Israel served Cushan Rishathaim eight years.
9 Ma mgbe ụmụ Izrel kpọkuru Onyenwe anyị, o mere ka Otniel, nwa Kenaz, bilie nʼetiti ha. Otniel bụ nwa nwanne Kaleb nke nta. Ọ bụkwa ya napụtara ụmụ Izrel site nʼaka ndị iro ha.
When the children of Israel cried to Jehovah, Jehovah raised up a savior to the children of Israel, who saved them, even Othniel the son of Kenaz, Caleb's younger brother; and he obeyed him.
10 Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị ya, nke mere ka ọ bụrụ onye ikpe ndị Izrel, ọ pụrụ ibu agha. Onyenwe anyị nyefere Kushan Rishataim bụ eze ndị Aram nʼaka Otniel, onye ike ya karịrị nke ya.
The Spirit of Jehovah came on him, and he judged Israel; and he went out to war, and Jehovah delivered Cushan Rishathaim king of Mesopotamia into his hand: and his hand prevailed against Cushan Rishathaim.
11 Sitekwa nʼoge ahụ gaa nʼihu, udo dịịrị nʼala niile iri afọ anọ, mgbe Otniel na-ekpe Izrel ikpe. Nʼikpeazụ, Otniel, nwa Kenaz nwụrụ.
The land had rest forty years. And Othniel the son of Kenaz died.
12 Ụmụ Izrel bidoro ime ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. Ya mere, Onyenwe anyị nyefere ha nʼaka Eglọn, eze Moab.
The children of Israel again did that which was evil in the sight of Jehovah: and Jehovah strengthened Eglon the king of Moab against Israel, because they had done that which was evil in the sight of Jehovah.
13 Ọ kpọtara ndị Amọn na ndị Amalek ka ha dịnyere ya. Eglọn bịara buso ndị Izrel agha, nweta obodo Nkwụ, ya abụrụzia nke ha.
He gathered to him the people of Ammon and Amalek; and he went and struck Israel, and they possessed the city of palm trees.
14 Afọ iri na asatọ site nʼoge ahụ ka ụmụ Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị Eglọn, eze Moab.
The children of Israel served Eglon the king of Moab eighteen years.
15 Ma mgbe ụmụ Izrel tikuru Onyenwe anyị banyere ọnọdụ ọjọọ ha, o zitere ha onye nzọpụta. Aha nwoke ahụ bụ Ehud, nwa Gera, onye sitere nʼagbụrụ Benjamin. Ọ bụ onye na-eme aka ekpe. Ya onwe ya bụkwa onye na-ebugara Eglọn, eze Moab, ego ụtụ niile ụmụ Izrel na-atụ kwa afọ.
But when the children of Israel cried to Jehovah, Jehovah raised them up a savior, Ehud the son of Gera, the Benjamite, a man left-handed. The children of Israel sent tribute by him to Eglon the king of Moab.
16 Tupu ọ malite ije ya, o buru ụzọ kwadebere onwe ya mma agha nwere ihu abụọ na nzuzo. Ogologo mma ahụ ga-eru ihe dịka site nʼọnụ mkpịsịaka ruo nʼisi mbụ aka. Ehud kekwasịrị mma ahụ nʼapata ụkwụ aka nri ya, yikwasị ya uwe mwụda ya.
Ehud made him a sword which had two edges, eighteen inches in length; and he girded it under his clothing on his right thigh.
17 O bunyere Eglọn, eze Moab ego ụtụ ahụ. Eglọn bụ nwoke buru oke ibu.
He offered the tribute to Eglon king of Moab: now Eglon was a very fat man.
18 Mgbe Ehud nyesịrị eze Eglọn ego ụtụ ahụ o ji bịa, o zilagara ndị butere ego ahụ.
When he had made an end of offering the tribute, he sent away the people who bore the tribute.
19 Mgbe ọ bịaruru nso nʼobodo Gilgal, ebe arụsị dị iche iche a pịrị apị dị, ọ laghachiri azụ jekwuru eze Eglọn sị ya, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ma ọ ga-abụ na nzuzo.” Mgbe ahụ, eze zipụrụ ndị so ya nọdụ, ka ya na Ehud naanị nwee ike ịnọ kparịa ụka ha na nzuzo.
But he himself turned back from the quarries that were by Gilgal, and said, "I have a secret message for you, O king." The king said, "Keep silence." All who stood by him went out from him.
20 Ehud bịakwutere ya mgbe ọ nọ naanị ya nʼọnụụlọ dị nʼime nʼelu ụlọeze ya, sị, “Enwere m ozi Chineke sị m zie gị.” Dịka eze ahụ si nʼoche ya bilite ọtọ,
Ehud came to him; and he was sitting by himself alone in the cool upper room. Ehud said, "I have a message from God to you, O king." He arose out of his seat.
21 Ehud tinyere aka ekpe ya nʼime uwe ya, mịpụta mma ahụ nwere ihu abụọ nke o kegidere nʼapata ụkwụ aka nri ya. O weere ya mapuo eze Eglọn afọ.
And it happened as he rose up that Ehud put forth his left hand and took the sword from his right thigh and thrust it into his belly.
22 Ọ bụladị isi mma ahụ sooro ihu mma ahụ mibanye nʼime afọ ukwu eze Eglọn. Ọnụ mma ahụ pụtakwara nʼazụ eze ahụ. Ehud amịpụtaghị mma ahụ, kama abụba dị nʼafọ eze ahụ kpuchiri ya.
And the handle also went in after the blade; and the fat closed on the blade, for he didn't draw the sword out of his belly; and it came out behind.
23 Ya mere, Ehud pụrụ nʼezi, mechibido ya ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼọnụụlọ elu ahụ, kpọchie ha.
Then Ehud went forth into the porch, and shut the doors of the upper room on him, and locked them.
24 Mgbe ọ pụchara, ndị na-ejere eze ozi bịara chọọ ịbanye nʼụlọ ahụ. Ma mgbe ha hụrụ na a kpọchiri ọnụ ụzọ ụlọ ahụ akpọchi, ha kwuru nʼonwe ha sị, “Ọ ga-abụ na ọ na-anyụ nsị nʼụlọ mposi.”
Now when he was gone out, his servants came; and they saw, and look, the doors of the upper room were locked; and they said, "Surely he is covering his feet in the upper room."
25 Ma mgbe oge dị anya gasịrị ma eze apụtaghị, ha enweghị ike ijide onwe ha ọzọ. Ha weere ọtụghe ụzọ tụghee ọnụ ụzọ ahụ, hụ ebe eze ha tọgbọrọ nʼala, nwụọ.
They waited until they were ashamed; and look, he did not open the doors of the upper room: therefore they took the key, and opened them, and look, their lord was fallen down dead on the earth.
26 Mgbe ahụ ha nọ na-eche, Ehud gbapụrụ. O sitere nʼebe ahụ arụsị ndị ahụ a pịrị apị dị gbafee, gbaga Seira.
Ehud escaped while they waited, and passed beyond the quarries, and escaped to Seirah.
27 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ọ fụrụ opi ike nʼala ugwu ugwu Ifrem, ndị Izrel sooro ya site nʼugwu ahụ rịda, ya onwe ya na-edu ha.
It happened, when he had come, that he blew a trumpet in the hill country of Ephraim; and the children of Israel went down with him from the hill country, and he before them.
28 Ọ sịrị ha, “Soronụ m nʼazụ, nʼihi na Onyenwe anyị enyela ndị Moab ndị iro unu nʼaka unu.” Ya mere, ha sooro ya gbadaa, gaa nọchie ụzọ niile ndị Moab nwere ike isi gafee osimiri Jọdan. Ha ekwekwaghị ka onye Moab ọbụla si nʼebe ahụ gafee.
He said to them, "Follow after me; for Jehovah has delivered your enemies the Moabites into your hand." They went down after him, and took the fords of the Jordan against the Moabites, and did not allow a man to pass over.
29 Nʼụbọchị ahụ, ha gburu puku ndị agha Moab iri, ha niile siri ike bụrụkwa dimkpa. O nweghị otu onye gbapụrụ.
They struck of Moab at that time about ten thousand men, every lusty man, and every man of valor; and there escaped not a man.
30 Nʼụbọchị ahụ, e mere ka Moab nọdụ nʼokpuru ndị Izrel. Ala ahụ nwere ozuzu ike na udo, iri afọ asatọ.
So Moab was subdued that day under the hand of Israel. Then the land had rest eighty years. And Ehud judged them until he died.
31 Mgbe Ehud chịsịrị, Shamga, nwa Anat rịgotara ịchị. O tigburu narị ndị Filistia isii. Ọ bụ ndụdụ e ji achị ehi ka o ji tigbuo ha. Ya onwe ya kwa, zọpụtara ndị Izrel.
And after him was Shamgar the son of Anath, who alone struck down six hundred men of the Philistines with an oxgoad. And he also saved Israel.

< Ndị Ikpe 3 >