< Ndị Ikpe 21 >

1 Mgbe ndị ikom Izrel niile zukọtara na Mizpa, ha ṅụrụ iyi sị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ekwe ka nwoke ọbụla si nʼebo Benjamin lụọ ụmụ anyị ndị inyom.”
And the men of Israel have sworn in Mizpeh, saying, 'None of us doth give his daughter to Benjamin for a wife.'
2 Ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu Chineke. Ha welitere olu bee akwa dara ụda.
And the people come in to Beth-El, and sit there till the evening before God, and lift up their voice, and weep — a great weeping,
3 “Ha sịrị, Onyenwe anyị, Chineke Izrel, gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị Izrel? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo Izrel achọ taa?”
and say, 'Why, O Jehovah, God of Israel, hath this been in Israel — to be lacking to-day, from Israel, one tribe?'
4 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ.
And it cometh to pass on the morrow, that the people rise early, and build there an altar, and cause to ascend burnt-offerings and peace-offerings.
5 Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu Onyenwe anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na Mizpa?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa aghaghị ịnwụ.
And the sons of Israel say, 'Who [is] he that hath not come up in the assembly out of all the tribes of Israel unto Jehovah?' for the great oath hath been concerning him who hath not come up unto Jehovah to Mizpeh, saying, 'He is surely put to death.'
6 Ma oke iru ụjụ dị nʼala Izrel dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị Benjamin. Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo Izrel alaala nʼiyi, e kpochapụla ya.
And the sons of Israel repent concerning Benjamin their brother, and say, 'There hath been to-day cut off one tribe from Israel,
7 Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha Onyenwe anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?”
what do we do for them — for those who are left — for wives, and we — we have sworn by Jehovah not to give to them of our daughters for wives?'
8 Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa.
And they say, 'Who is [that] one out of the tribes of Israel who hath not come up unto Jehovah to Mizpeh?' and lo, none hath come in unto the camp from Jabesh-Gilead — unto the assembly.
9 Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si Jebesh Gilead bịa.
And the people numbered themselves, and lo, there is not there a man of the inhabitants of Jabesh-Gilead.
10 Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na Jebesh Gilead, ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị.
And the company send there twelve thousand men of the sons of valour, and command them, saying, 'Go — and ye have smitten the inhabitants of Jabesh-Gilead by the mouth of the sword, even the women and the infants.
11 Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.”
And this [is] the thing which ye do; every male, and every woman knowing the lying of a male, ye devote.'
12 Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na Jebesh Gilead dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na Shaịlo, nʼime Kenan, ebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha.
And they find out of the inhabitants of Jabesh-Gilead four hundred young women, virgins, who have not known man by the lying of a male, and they bring them in unto the camp at Shiloh, which [is] in the land of Canaan.
13 Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha Benjamin na nkume Rimọn maka ime udo.
And all the company send, and speak, unto the sons of Benjamin who [are] in the rock Rimmon, and proclaim to them peace;
14 Mgbe ndị Benjamin lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị Jebesh Gilead, bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile.
and Benjamin turneth back at that time, and they give to them the women whom they have kept alive of the women of Jabesh-Gilead, and they have not found for [all of] them so.
15 Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala Izrel maka ọnọdụ ndị Benjamin, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ka ebo ndị Izrel hapụ izu ezu.
And the people repented concerning Benjamin, for Jehovah had made a breach among the tribes of Israel.
16 Ndị okenye Izrel jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị Benjamin anwụchaala?
And the elders of the company say, 'What do we do to the remnant for wives — for the women have been destroyed out of Benjamin?'
17 Ndị Benjamin fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo Izrel ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ.
And they say, 'A possession of an escaped party [is] to Benjamin, and a tribe is not blotted out from Israel;
18 Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ Izrel ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye Benjamin nwunye.’
and we — we are not able to give to them wives out of our daughters, for the sons of Israel have sworn, saying, Cursed [is] he who is giving a wife to Benjamin.'
19 Ma lee, e nwere mmemme Onyenwe anyị a na-eme afọ niile na Shaịlo, nʼakụkụ ugwu Betel, na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere Betel gaa Shekem, na nʼakụkụ ndịda Lebona.”
And they say, 'Lo, a festival of Jehovah [is] in Shiloh, from time to time, which [is] on the north of Beth-El, at the rising of the sun, by the highway which is going up from Beth-El to Shechem, and on the south of Lebonah.'
20 Ya mere, ha gwara ndị ikom Benjamin, bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ,
And they command the sons of Benjamin, saying, 'Go — and ye have laid wait in the vineyards,
21 ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ Shaịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala Benjamin, ka ha bụrụ nwunye unu.
and have seen, and lo, if the daughters of Shiloh come out to dance in dances — then ye have gone out from the vineyards, and caught for you each his wife out of the daughters of Shiloh, and gone to the land of Benjamin;
22 Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na Jebesh Gilead. O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’”
and it hath been, when their fathers or their brethren come in to plead unto us, that we have said unto them, Favour us [by] them, for we have not taken [to] each his wife in battle, for ye — ye have not given to them at this time [that] ye are guilty.'
23 Ya mere, ndị Benjamin mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya.
And the sons of Benjamin do so, and take women according to their number, out of the dancers whom they have taken violently away; and they go, and turn back unto their inheritance, and build the cities, and dwell in them.
24 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ Izrel laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya.
And the sons of Israel go up and down thence at that time, each to his tribe, and to his family; and they go out thence each to his inheritance.
25 Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.
In those days there is no king in Israel; each doth that which is right in his own eyes.

< Ndị Ikpe 21 >