< Ndị Ikpe 20 >

1 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa.
And all the children of Israel went forth, and the assembly gathered together as one man, from Dan to Beer-sheba, and the land of Gilead, unto Jehovah at Mizpah.
2 Ndị ndu ebo Izrel niile weere ọnọdụ na nzukọ nke ndị Chineke, ọnụọgụgụ ha bụ narị puku ndị agha anọ, ndị na-ebu mma agha.
And the heads of all the people, of all the tribes of Israel, presented themselves in the congregation of the people of God, four hundred thousand footmen that drew sword.
3 Mgbe na-adịghị anya, nzukọ ụmụ Izrel niile na Mizpa ruru ụmụ Benjamin ntị. Mgbe ahụ, ndịisi Izrel niile kpọrọ nwoke ahụ e gburu iko ya nwanyị sị ya, “Kọọrọ anyị otu ihe ọjọọ a si mee.”
And the children of Benjamin heard that the children of Israel had gone up to Mizpah. And the children of Israel said, Tell [us], how was this wickedness?
4 Ya mere, onye Livayị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo Gibea, obodo nta ndị Benjamin, kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị.
Then the Levite, the husband of the woman that was murdered, answered and said, I came to Gibeah that [belongs] to Benjamin, I and my concubine, to lodge.
5 Nʼoge abalị, ndị ikom Gibea bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ.
And the citizens of Gibeah rose against me, and surrounded the house because of me, by night; they thought to slay me, and my concubine have they humbled so that she died.
6 Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị Izrel niile nʼihi na ndị ikom Gibea ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala Izrel.
Then I took my concubine, and cut her in pieces, and sent her throughout the country of the inheritance of Israel; for they have committed lewdness and villany in Israel.
7 Ugbu a, unu ụmụ Izrel niile, unu onwe unu tụleenụ okwu a, nyekwanụ ndụmọdụ ihe a ga-eme ebe a.”
Behold, all ye, children of Israel, deliberate and give here [your] counsel.
8 Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya.
And all the people rose up as one man, saying, We will not any one go to his tent, neither will we any one turn into his house.
9 Ma ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme ndị Gibea. Anyị ga-efe nza chọpụta ndị ga-aga lụso ndị Gibea agha.
But now this is the thing which we will do to Gibeah: [we go] by lot against it;
10 Anyị ga-esite nʼebo niile nke Izrel họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere Geba dị na Benjamin, anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala Izrel si dị.”
and we will take ten men of a hundred throughout all the tribes of Israel, and a hundred of a thousand, and a thousand of ten thousand, to fetch victuals for the people, that they may do, when they come to Gibeah of Benjamin, according to all the villany that they have wrought in Israel.
11 Ya mere, ndị Izrel niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ.
And all the men of Israel were gathered against the city, knit together as one man.
12 Ndị ebo Izrel zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo Benjamin niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu?
And the tribes of Israel sent men to all the families of Benjamin, saying, What wickedness is this that has been done among you?
13 Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo Gibea ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼIzrel.” Ma ụmụ Benjamin egeghị ndị Izrel ibe ha ntị.
And now give up the men, the sons of Belial, who are in Gibeah, that we may put them to death, and put away evil from Israel. But [the children of] Benjamin would not hearken to the voice of their brethren the children of Israel.
14 Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na Gibea maka ibuso ndị Izrel agha.
And the children of Benjamin gathered themselves together out of the cities of Gibeah, to go out to battle against the children of Israel.
15 Nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na Gibea.
And the children of Benjamin were numbered at that time out of the cities, twenty-six thousand men that drew sword, besides the inhabitants of Gibeah, who were numbered seven hundred chosen men.
16 Nʼime ndị agha ndị a, e nwere narị ndị agha asaa, ndị a maara nke ọma dịka ndị na-agbata ụta nke ọma. Ha bụ ndị na-eme aka ekpe, onye ọbụla nʼime ha nwere ike iji okwute mata otu agịrị isi, ghara ịmahie ya.
Among all this people there were seven hundred chosen men left-handed; all these slang stones at a hair [breadth], and missed not.
17 Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ Izrel, ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ Benjamin, dị narị puku anọ.
And the men of Israel, besides Benjamin, were numbered four hundred thousand men that drew sword: all these were men of war.
18 Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha Izrel buru ụzọ gaa Betel ịjụta Chineke ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha Benjamin agha?” Onyenwe anyị zara sị ha na ọ bụ Juda ga-ebu ụzọ.
And the children of Israel arose and went up to Bethel, and inquired of God, and said, Which of us shall go up first to the battle against the children of Benjamin? And Jehovah said, Judah first.
19 Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ Izrel niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso Gibea.
And the children of Israel rose up in the morning and encamped against Gibeah.
20 Emesịa, ndị Izrel pụrụ izute ndị Benjamin, doo onwe ha nʼusoro ibu agha na Gibea.
And the men of Israel went out to battle against Benjamin; and the men of Israel put themselves in array to fight against them at Gibeah.
21 Ma nʼụbọchị ahụ, ndị Benjamin si Gibea nupụta nʼigwe gbuo ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ.
And the children of Benjamin went forth out of Gibeah, and destroyed to the ground of the Israelites that day twenty-two thousand men.
22 Ndị agha Izrel gbarịtara onwe ha ume, ma werekwa ọnọdụ ibu agha dịka ha mere nʼụbọchị mbụ.
And the people, the men of Israel, took courage, and set the battle again in array in the place where they put themselves in array the first day.
23 Ndị agha Izrel kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ Onyenwe anyị ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị Benjamin ọgụ?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ ga lụso ha agha.”
And the children of Israel went up and wept before Jehovah until even, and inquired of Jehovah, saying, Shall I go up again to battle against the children of Benjamin my brother? And Jehovah said, Go up against him.
24 Nʼihi nke a, ndị Izrel jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ Benjamin agha nʼụbọchị nke abụọ ya.
And the children of Israel came near against the children of Benjamin the second day.
25 Nʼoge a kwa, ndị agha Benjamin si nʼobodo Gibea pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha Izrel ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha.
And Benjamin went forth against them out of Gibeah the second day, and again destroyed to the ground of the children of Israel eighteen thousand men: all these drew the sword.
26 Mgbe ahụ, ndị Izrel niile gara Betel, nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu Onyenwe anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu Onyenwe anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ.
Then all the children of Israel, and all the people, went up and came to Bethel, and wept, and abode there before Jehovah, and fasted that day until even, and offered up burnt-offerings and peace-offerings before Jehovah.
27 Ndị Izrel jụrụ ase site nʼaka Onyenwe anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼebe ahụ.
And the children of Israel inquired of Jehovah (and the ark of the covenant of God was there in those days,
28 Finehaz nwa Elieza, nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ Izrel jụrụ Onyenwe anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị Benjamin agha, ka ị sị anyị agala?” Onyenwe anyị zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha Benjamin echi.”
and Phinehas, the son of Eleazar, the son of Aaron, stood before it in those days), saying, Shall I yet again go out to battle against the children of Benjamin my brother, or shall I cease? And Jehovah said, Go up; for to-morrow I will give them into thy hand.
29 Nʼihi nke a, ụmụ Izrel kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo Gibea.
And Israel set liers in wait against Gibeah, round about.
30 Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị Benjamin, ha were ọnọdụ ha imegide ndị Gibea dịka ha mere nʼoge gara aga.
And the children of Israel went up against the children of Benjamin on the third day, and put themselves in array against Gibeah, as at the other times.
31 Ndị Benjamin pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị Izrel dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo Betel, na nke ọzọ gawara obodo Gibea.
And the children of Benjamin went out against the people, and were drawn away from the city, and began to smite of the people, slaying as at the former times, in the highways, of which one leads to Bethel and the other to Gibeah in the field, about thirty men of Israel.
32 Ya mere, mgbe ndị agha Benjamin malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị Izrel nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.”
And the children of Benjamin said, They are smitten down before us, as at the first. And the children of Israel said, Let us flee, that we may draw them from the city to the highways.
33 Ndị ikom niile nke Izrel sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na Baal-Tama, ndị Izrel ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke Geba, si nʼọhịa mapụta.
And all the men of Israel rose up out of their place, and put themselves in array at Baal-Tamar; and the ambush of Israel rushed forth out of their place, out of the meadows of Geba.
34 Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha.
And there came from opposite Gibeah ten thousand chosen men out of all Israel, and the battle was severe; but they knew not that disaster was coming upon them.
35 Onyenwe anyị meriri ndị Benjamin nʼihu Izrel, nʼụbọchị ahụ; ndị Izrel gburu ndị agha Benjamin ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha.
And Jehovah smote Benjamin before Israel; and the children of Israel destroyed of the Benjaminites that day twenty-five thousand one hundred men: all these drew the sword.
36 Mgbe ahụ, ndị Benjamin nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha. Ugbu a, ndị ikom Izrel nyere ndị Benjamin ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ Gibea.
And the children of Benjamin saw that they were smitten. — And the men of Israel gave place to Benjamin, because they trusted to the ambush that they had set against Gibeah.
37 Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo Gibea, kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ.
And the ambush hasted, and fell upon Gibeah; and the ambush drew along, and smote the whole city with the edge of the sword.
38 Ndị Izrel na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ,
Now there was an appointed sign between the men of Israel and the ambush, that they should make a thick column of smoke rise up out of the city.
39 ma mgbe ahụ, ndị Izrel ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha. Ndị Benjamin egbuolarị iri ndị Izrel atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.”
And when the men of Israel turned back in the battle, Benjamin began to smite, slaying of the men of Israel about thirty men; for they said, Surely they are quite routed before us as in the first battle.
40 Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị Benjamin lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ.
And when the burning began to rise up out of the city as a pillar of smoke, Benjamin looked behind, and behold, the whole city ascended [in smoke] to the heavens.
41 Mgbe ahụ, ndị Izrel bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị Benjamin nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha.
Then the men of Israel turned back, and the men of Benjamin were amazed, for they saw that disaster was come upon them.
42 Ha si nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị Izrel si nʼobodo Gibea gbapụta gburu ha nʼebe ahụ.
And they turned before the men of Israel to the way of the wilderness; but the battle overtook them; and those who came out of the cities destroyed them in their midst.
43 Ha gbara ndị Benjamin gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Gibea, gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ.
They encompassed the Benjaminites, chased them, trode them down at the resting-place over against Gibeah toward the sun-rising.
44 Ndị agha Benjamin e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ.
And there fell of Benjamin eighteen thousand men: all these, men of valour.
45 Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume Rimọn dị, ndị Izrel gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị Benjamin ọsọ ruo Gidom, gbukwaa puku ndị agha ha abụọ.
And they turned and fled towards the wilderness to the cliff of Rimmon, and they gleaned of them in the highways five thousand men; and pursued hard after them to Gidom, and slew two thousand men of them.
46 Ya mere, ndị Benjamin e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha.
So that all who fell that day of Benjamin were twenty-five thousand men that drew the sword: all these, men of valour.
47 Naanị narị ndị agha isii nʼime ha tụgharịrị gbapụ ọsọ gbalaga nʼọzara, nʼebe nkume Rimọn dị. Ha nọgidere nʼebe ahụ ọnwa anọ.
And six hundred men turned and fled to the wilderness to the cliff of Rimmon, and abode at the cliff of Rimmon four months.
48 Mgbe ahụ, ndị agha Izrel hapụrụ ha, laghachi azụ, gaa nʼobodo ndị Benjamin niile gbuo ndị niile nọ nʼime ha, igwe anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ niile dị nʼime ha. Obodo niile ha ruru, ha kpọrọ ha ọkụ.
And the men of Israel turned again upon the children of Benjamin, and smote them with the edge of the sword, as well the men of [every] city as the cattle, and all that was found; even all the cities that were found did they set on fire.

< Ndị Ikpe 20 >