< Ndị Ikpe 2 >

1 Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere na Gilgal bịa Bokim gwa ndị Izrel okwu sị ha, “Mụ onwe m kpọpụtara unu site nʼIjipt, kpọbata unu nʼala a dịka m kwere nna unu ha na nkwa. Asịrị m, ‘Agaghị m ala azụ imezu ọgbụgba ndụ mụ na unu,
Malaika wa Bwana akatoka Gilgali, akaenda Bokimu, akasema, “Nimekuleta kutoka Misri, na nimekuleta katika nchi niliyoapa kuwapa baba zako.
2 unu na ndị bi nʼobodo ahụ agbakwala ndụ ọbụla, kama unu ga-etitu ebe ịchụ aja ha.’ Ma unu erubeghị isi nʼokwu a, gịnị mere unu emeghị nke a?
Nikasema, 'Sitakuvunja kamwe agano langu na wewe. Usifanye agano na wale wanaoishi katika nchi hii. Ziangushe madhabahu zao. Lakini hukusikiliza sauti yangu. Je! ni nini hiki ulichokifanya?
3 Agwara m unu, na ‘agaghị m esite nʼihu unu chụpụ ha; ha ga-adịrị unu dịka ọnya nʼakụkụ niile, ebe chi niile ha ga-abụkwara unu ihe na-eweta ọnwụnwa.’”
Basi sasa nasema, “Sitawafukuza Wakanaani mbele yenu, nao watakuwa miiba kwenu, na miungu yao itakuwa mtego kwa ajili yenu.”
4 Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ kwusiri okwu ndị a, ụmụ Izrel niile kwara akwa nke ukwuu.
Malaika wa Bwana alipowaambia maneno hayo kwa watu wote wa Israeli, watu wakapiga kelele na kulia.
5 Nʼihi nke a, ha kpọrọ ebe ahụ Bokim. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ.
Waliita mahali hapo Bokimu. Hapo wakatoa dhabihu kwa Bwana.
6 Mgbe Joshua zilagasịrị ndị Izrel niile, onye ọbụla nʼime ha gara nʼihe nketa ya, inweta ya, dịka ebo ọbụla dị nʼIzrel si dị.
Yoshua alipowaruhusu watu waende zao, wana wa Israeli kila mmoja akaenda mahali alipopewa, wakiwa na umiliki wa ardhi yao.
7 Ndị Izrel fereOnyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, bụkwa ndị hụrụ ọrụ ukwuu niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.
Watu walimtumikia Bwana wakati wa maisha ya Yoshua na wazee walioendelea baada yake, ni wale waliokuwa wameona matendo yote makuu ya Bwana aliyoyafanya kwa Israeli.
8 Ma Joshua, nwa Nun, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara otu narị afọ, na afọ iri.
Yoshua mwana wa Nuni, mtumishi wa Bwana, alikufa akiwa na umri wa miaka 110.
9 E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, nʼobodo Timnat Heres, nʼala ugwu ugwu nke ebo Ifrem, nʼụzọ mgbago ugwu Gaash.
Wakamzika ndani ya mpaka wa nchi aliyopewa huko Timnath Heresi, katika mlima wa Efraimu, kaskazini mwa Mlima Gaash.
10 Emesịa, ọgbọ ahụ niile nwụrụ dịka ndị nna nna ha, ọgbọ ọzọ tolitere, ndị na-amaghị Onyenwe anyị maọbụ ihe ndị nke o mere nye ụmụ Izrel.
Kizazi hicho chote kilikusanyika kwa baba zao. Kizazi kingine kilichofuata baada yao ambao hakikumjua Bwana au kile alichokifanya kwa Israeli.
11 Mgbe ahụ, ndị Izrel mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị site nʼife Baal ofufe.
Watu wa Israeli walifanya yaliyo mabaya machoni pa Bwana, nao wakawatumikia Mabaali.
12 Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, bụ Chineke ahụ, nna ha fere ofufe, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt. Ma ha malitere ife na ịsọpụrụ, na ịkpọ isiala nye ọtụtụ chi dị iche iche, bụ chi nke ndị bi ha gburugburu. Ha si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe.
Wakaondoka kwa Bwana, Mungu wa baba zao, aliyewatoa kutoka Misri. Wakaifuata miungu mingine, miungu ya watu waliokuwa karibu nao, nao wakaisujudia. Wakamkasirisha BWANA kwa sababu
13 Ha gbakụtara Onyenwe anyị azụ, fee chi Baal na Ashtọret ofufe.
waliondoka kwa Bwana na kumwabudu Baal na Maashtoreti.
14 Ya mere, Onyenwe anyị were iwe megide Izrel, rara ha nye nʼaka ndị ji aka ike pụnara ha ihe ha nwere. O weere ha resi ndị iro ha gbara ha gburugburu, bụ ndị ha enwekwaghị ike iguzogide.
Hasira ya Bwana ikawaka juu ya Israeli, naye akawapa washambuliaji walioiba mali zao kutoka kwao. Aliwauza kama watumwa waliofanyika kwa nguvu za maadui zao waliowazunguka, hivyo hawakuweza kujikinga dhidi ya adui zao.
15 Dịka ọ ṅụrụ ya nʼiyi nye ha, mgbe ọbụla ụmụ Izrel pụrụ ibu agha, aka Onyenwe anyị megidere ha ime ka ha bụrụ ndị e meriri emeri. Ọnọdụ ha jọrọ njọ nke ukwuu.
Israeli walipokwenda kupigana, mkono wa Bwana ulikuwa dhidi yao kuwashinda, kama alivyowaapia. Na walikuwa katika shida kali.
16 Nʼihi ọnọdụ ọjọọ a, Onyenwe anyị mere ka ndị ikpe sị nʼetiti ha pụta, ịnapụta ha site nʼaka ndị a ji ike na-apụnara ha ihe ha nwere.
Ndipo Bwana akawainua waamuzi, waliowaokoa katika mikono ya wale waliokuwa wakiba mali zao.
17 Ma ụmụ Izrel egeghị ndị ikpe ahụ ntị, kama ha nọgidere na-akpọ isiala nye ma na-agbasokwa chi ndị ọzọ. Dịka nna nna ha na-emeghị, ha mere ngwangwa wezuga onwe ha site nʼụzọ Onyenwe anyị, bụrụ ndị na-enupu isi nʼebe iwu Onyenwe anyị dị.
Hata hivyo hawakuwasikiliza waamuzi wao. Hawakuwa waaminifu kwa Bwana na wakajitoa wenyewe kama makahaba kwa miungu mingine na kuabudu. Waligeuka upesi na kuiacha njia waliyoishi baba zao-wale waliotii amri za Bwana-lakini wao wenyewe hawakufanya hivyo.
18 Ma mgbe ọbụla Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel onye ikpe, ọ na-anọnyere onye ikpe ahụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ ya. Ọ na-esitekwa nʼaka onye ikpe a napụta ụmụ Izrel nʼaka ndị iro ha nʼihi na Onyenwe anyị nwere obi ebere nʼahụ ụmụ Izrel, mgbe ha na-asụ ude, nʼihi mmegbu na mkpagbu niile ndị iro ha na-emegbu ha, ma na-akpagbukwa ha.
Bwana aliinua waamuzi kwa ajili yao, Bwana akawasaidia waamuzi na kuwakomboa kutoka kwa mikono ya adui zao siku zote muamuzi aliishi. Bwana aliwahurumia walipougua kwa sababu ya wale waliowadhulumu na kuwasumbua.
19 Ma mgbe ọbụla onye ikpe a nwụrụ, ụmụ Izrel na-alaghachi azụ biwe ndụ ọjọọ karịa nke nna nna ha ochie. Ha na-agbaso chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala nye ha, na ife ha ofufe. Ha jụrụ iwezuga agwa ọjọọ ha ndị a ma ọ bụkwa ụzụ isiike ha.
Lakini mwamuzi alipokufa, waligeuka na kufanya mambo ambayo yalikuwa mabaya zaidi kuliko baba zao walivyofanya. Wakaenda kuifuata miungu mingine kuitumikia na kuiabudu. Walikataa kuacha matendo yao yote mabaya au njia zao za ukaidi.
20 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel, ma sị, “Nʼihi na mba a emebiela ọgbụgba ndụ ahụ m nyere nna ha nʼiwu, jụkwa ige m ntị,
Hasira ya Bwana iliwaka juu ya Israeli; akasema, Kwa sababu taifa hili limevunja masharti ya agano langu ambalo nililiweka kwa ajili ya baba zao-kwa sababu hawakuisikiliza sauti yangu.
21 agaghị m achụpụkwa site nʼihu ha mba ndị ahụ Joshua hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.
Tangu sasa sitaliondoa mbele yao taifa lolote aliloliacha Yoshua baada ya kufa.
22 Aga m eji ha nwalee Izrel, ịchọpụta ma ha ga-elezi anya idebe ụzọ Onyenwe anyị, gaakwa ije nʼime ya dịka nna nna ha mere m.”
Nitafanya hivi ili kuwajaribu Israeli, ikiwa watafuata njia ya Bwana au sivyo, kama vile baba zao walivyoifuata.
23 Onyenwe anyị hapụrụ mba ndị ahụ niile ka ha nọgide. Ọ chụpụghị ha ngwangwa site na inyefe ha nʼaka Joshua.
Ndiyo sababu Bwana aliwaacha mataifa hayo, wala hakuwafukuza haraka na kuwatia mikononi mwa Yoshua.

< Ndị Ikpe 2 >