< Ndị Ikpe 16 >

1 Otu ụbọchị, Samsin gara nʼotu obodo ndị Filistia a na-akpọ Gaza, soro otu nwanyị akwụna bi nʼebe ahụ hie ụra abalị.
Samson went to Gaza. There he saw a prostitute and he went to have sex with her that night.
2 A gwara ndị Gaza sị, “Samsin nọ nʼobodo a.” Nʼihi ya, ha gbara ebe ahụ gburugburu ma nọdụ na-eche nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ abalị niile. Ọ dịghị ihe ha mere nʼabalị ahụ nʼihi na ha zubere sị, “Mgbe chi bọrọ, anyị ga-egbu ya.”
The men of Gaza found out Samson was there, so they gathered to spend the night lying in wait for him at the town gates. They kept quiet all night, whispering to one another, “We'll kill him when it gets light.”
3 Ma Samsin dinara nʼụlọ nwanyị akwụna ahụ ruo nʼetiti abalị ahụ. Mgbe ọ pụtara, ọ gara ruo nʼọnụ ụzọ obodo ahụ, foro ibo ọnụ ụzọ obodo ahụ, ya na ibo ya abụọ, bukwasị ya nʼubu ya, buru ha gaa nʼelu ugwu chere obodo Hebrọn ihu.
But Samson only stayed until halfway through the night. He grabbed hold of the town gates along with their two posts and ripped them up, along with the lock-bar. Putting them on his shoulders, he carried them to the hill opposite Hebron.
4 Ọ dịghị anya, Samsin hụrụ otu nwaagbọghọ, onye ọ hụrụ nʼanya. Aha nwaagbọghọ a bụ Delaịla, onye si nʼobodo dị na Ndagwurugwu Sorek.
Later he fell in love with a woman named Delilah living in the Sorek Valley.
5 Ndị eze ndị Filistia, bịakwutere Delaịla rịọọ ya sị, “Gbalịa lee ma ị ga-enwe ike chọpụta ebe ike Samsin si abịa, ka anyị nwee ike ịmata ụzọ anyị ga-esi jide ya, kee ya agbụ. Ọ bụrụ na i meere anyị nke a, anyị na-ekwe nkwa na onye ọbụla nʼime anyị ga-enye gị puku shekel na narị shekel ọlaọcha.”
The Philistine leaders approached her, saying, “See if you can seduce him and get him to show you the secret of his incredible strength, and find out how we can overpower him and tie him up so he can't do anything. We'll all give you eleven hundred shekels of silver each.”
6 Nʼihi nke a, Delaịla gwara Samsin okwu sị ya, “Gwa m ebe ike gị si abịa. Gwakwa m otu mmadụ pụrụ isi kee gị agbụ, merie gị.”
Delilah went and pleaded with Samson, “Please tell me where your incredible strength comes from, and what can be used to tie you up so you can't do anything.”
7 Mgbe ahụ, Samsin zara sị ya, “Ọ bụrụ na mmadụ e jiri akwara eriri asaa dị ọhụrụ, ndị a na-amịkpọghị amịkpọ kee m, m ga-abụkwa onye na-adịghị ike dịka mmadụ ọbụla ọzọ.”
“If I'm tied up with seven supple bowstrings that haven't dried out, I'll become just as weak,” Samson told her.
8 Ngwangwa, ndịisi ndị Filistia wetara ya eriri asaa dị ọhụrụ ndị a na-amịbeghị nʼanwụ, o weere ha kee Samsin.
The Philistine leaders brought her seven supple bowstrings that hadn't dried out, and she tied him up with them.
9 Ma o mere ka ụfọdụ ndị ikom Filistia zoo onwe ha nʼotu akụkụ ụlọ ya. O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị!” Otu mgbe ahụ kwa, Samsin biliri dọbisie eriri ahụ dịka ọ bụ eriri e ji ogho mee nke bịara ọkụ nso. Ya mere, a chọpụtaghị ebe ike Samsin si abịa.
Having arranged for men to hide in her bedroom ready to attack him, she shouted out, “Samson, the Philistines are here to get you!” But he snapped the bowstrings like a thread snaps when a flame touches it. So nobody found out where his strength came from.
10 Emesịa, Delaịla gwara Samsin sị ya, “Lee, ị kwaala m emo, ghaara m ụgha. Biko, gwa m ụzọ a ga-esi kee gị agbụ.”
Later Delilah said to Samson, “You've made me look stupid, telling me these lies! So now please tell me what can be used to tie you up.”
11 Samsin zara sị ya, “Lee, ọ bụrụ na e jiri ụdọ ọhụrụ nke a na-ejibeghị kee ihe mgbe ọbụla, kee m, aga m adịkwa dịka ndị ọzọ.”
“If I'm tied up tight with new ropes that haven't been used before, I'll become just as weak as anyone else,” he told her.
12 Ya mere, Delaịla chịkọtara ụdọ ọhụrụ jiri ya kee ya nke ọma. Ma ụfọdụ ndị ikom Filistia zokwara onwe ha nʼime ime ụlọ ahụ. Ọzọkwa, Delaịla tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin biliri dọbisie eriri ahụ e ji kee ya ka a ga-asị na ọ bụ ogho ka e ji mee ha.
So Delilah got some new ropes and tied him up with them. She shouted out, “Samson, the Philistines are here to get you!” As before, men were hiding in her bedroom. But again Samson snapped the ropes from his arms as if they were thin threads.
13 Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya sị, “Lee, ị na-eme ka abụ m onye nzuzu, ghaara m ụgha. Gwa m eziokwu, otu a ga-esi kee gị agbụ.” Samsin zara sị ya, “Lee, e kewara agịrị isi dị m nʼisi ụzọ asaa, i were ụzọ nkekọta asaa e kekọtara agịrị isi m, kpanyekọtaa ha nʼihe i ji ekwe akwa, were ntu osisi i ji akpachi akwa kpachie ya, mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.” Mgbe Samsin rahụrụ ụra, Delaịla weere agịrị isi Samsin kpanyekọtaa ya nʼihe o ji ekwe akwa.
Delilah said to Samson, “You keep on making me look stupid, telling me these lies! Just tell me what can be used to tie you up!” “If you were to weave the seven braids of my hair into the web on the loom and tighten it with the pin, I'll become as weak as anyone else,” he told her. So while he was asleep, Delilah took the seven braids of his head, weaving them into the web,
14 O jikwa ǹtu osisi o ji akpachi akwa, kpachikọtasie agịrị isi Samsin ike. Ọzọ, Delaịla sịrị ya, “Samsin, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma Samsin bilitere nʼike fokọrọ ǹtu osisi ahụ, na ihe eji akpa akwa, na akwa akpara akpa.
and tightening the pin. She shouted out, “Samson, the Philistines are here to get you!” But Samson woke up and ripped out both the pin and the web from the loom.
15 Mgbe ahụ, Delaịla gwara ya okwu sị, “Olee ka i si kwuo na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọ bụ na i nweghị ike ịgwa m ihe dị gị nʼobi? Lee, ugbo atọ ndị a, i mere m ka m dịka onye nzuzu, ma ị gwabeghị m ebe ike gị dị ruo ugbu a.”
Then Delilah complained to Samson, “How can you tell me, ‘I love you,’ when you don't let me into your confidence? Three times you've me look stupid, not telling me where your incredible strength comes from!”
16 Delaịla sikwara otu a nyegide Samsin nsogbu tutu ruo mgbe Samsin na-enweghịkwa ike ịnagide nsogbu ya.
She nagged and complained all the time, pestering him until he wanted to die.
17 Ya mere, ọ gwara ya ihe niile, “Ọ dịbeghị mgbe agụba ọbụla gara nʼelu isi m, nʼihi na abụ m onye Nazirait, onye e doro nsọ nye Chineke ka m bụ, site nʼafọ nne m. Ọ bụrụkwa na a kpụchapụ agịrị isi m, mgbe ahụ, ike niile dị m nʼahụ ga-apụ. Mgbe ahụ, aga m adịkwa ka ndị ọzọ.”
Eventually Samson confided in her, sharing everything. “My hair has never been cut, because I've been dedicated as a Nazirite to God from my birth. If I'm shaved, my strength will leave me, and I'll become as weak as anyone else.”
18 Mgbe Delaịla matara na ọ gwala ya ihe niile, o ziri ozi kpọọ ndịisi ndị Filistia ahụ, sị, “Bịaghachinụ otu ugbu a, nʼihi na ọ gwara m ihe niile.” Ya mere, ndịisi ndị Filistia lọghachiri jiri ego ọlaedo ahụ nʼaka ha.
Delilah realized that he had truly confided in her and shared everything, she sent a message to the Philistine leaders telling them, “Come back once more, because this time he's confided in me and told me everything.” So the Philistine leaders returned, bringing with them the money to give to her.
19 Ma Delaịla mere ka o dinaa nʼapata ụkwụ ya rahụ ụra. Mgbe ahụ, ọ kpọbatara nwoke na-akpụcha isi, ka ọ kpụchapụ agịrị isi niile dị Samsin nʼisi, si otu a mee ka ike ghara ịdịkwa ya. Ike ya hapụrụ ya.
Delilah soothed him sleep on her lap, and then called in someone to shave off the seven braids of hair. She started to torment him but he couldn't do anything for his strength left him.
20 O tiri mkpu sị, “Samsin, lee, ndị Filistia abịala ijide gị.” Ma mgbe Samsin bilitere site nʼụra, o chere nʼobi ya, “Aga m apụ ka m si mee na mbụ megharịa arụ ma nwere onwe m.” Ma ọ maghị na Onyenwe anyị ahapụla ya.
She shouted out, “Samson, the Philistines are here to get you!” Samson woke up and thought to himself, “I'll do like before and shake myself free.” But he didn't know that the Lord had left him.
21 Ndị Filistia jidere ya, ghụpụ ya anya ya abụọ, duru ya gbadata Gaza. Nʼebe ahụ, ha jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nye ya ọrụ ịnyagharị igwe na-akwọ ọka nʼụlọ mkpọrọ ha tinyere ya.
The Philistines grabbed him and gouged out his eyes. Then they took him to Gaza where they imprisoned him in bronze chains. He was made to work grinding grain at the mill in the prison.
22 Mgbe na-adịghị anya, agịrị isi ya malitekwara ito ọzọ.
But his hair began to grow back after it had been shaved off.
23 Ugbu a, ndịisi ndị Filistia niile zukọtara ịchụrụ chi ha bụ Dagọn, aja dị ukwuu, na ịṅụrị ọṅụ, na-asị, “Chi anyị enyela Samsin bụ onye iro anyị nʼaka anyị.”
The Philistine leaders gathered for a great religious festival to sacrifice to their god Dagon and to celebrate, saying, “Our god has handed Samson our enemy over to us!”
24 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ya, ha toro chi ha sị, “Chi anyị enyela onye iro anyị nʼaka anyị, onye mere ka ala anyị tọgbọrọ nʼefu gbukwaa ọtụtụ ndị anyị.”
When the people saw him, they praised their god, and said, “Our god has handed our enemy over to us, the one who devastated our land and killed so many of us.”
25 Mgbe ha ka nọ nʼobi ụtọ, ha tiri mkpu sị, “Dupụtara anyị Samsin, ka o kpaa anyị ọchị.” Ya mere, e dupụtara Samsin site nʼụlọ mkpọrọ ka o meere ha ihe egwuregwu. Ha mere ka o guzo nʼetiti ebe ogidi e ji wuo ụlọ ahụ dị.
As they began to get drunk, they shouted, “Summon Samson so he can entertain us!” So they summoned Samson from the prison to entertain them, and made him stand between the two main pillars of the building.
26 Mgbe ahụ, Samsin sịrị onye na-eji ya nʼaka sị, “Debe m nʼebe m ga-emetụ ogidi ndị ụlọ a na-eguzo na ha aka, ka m nwe ike dabere na ha.”
Samson said to the servant boy who was leading him by the hand, “Leave me by the pillars on which the temple rests so I can feel them, and lean against them.”
27 Nʼoge a, mmadụ ejupụtala nʼime ụlọ ahụ, nwoke na nwanyị; ndịisi ọchịchị ndị Filistia nọkwa nʼebe ahụ. Ndị ọzọ ọnụọgụgụ ha ruru puku atọ, nwoke na nwanyị, nọ nʼelu ụlọ ahụ na-ele Samsin, ebe ọ na-emere ha ihe ọchị.
The temple was full of people. All the Philistine rulers were there, and on the roof were the ordinary people watching what Samson was doing.
28 Mgbe ahụ, Samsin kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “O! Onyenwe m Onyenwe anyị, biko cheta m naanị otu ugbu a. Biko, Chineke, nye m ike nʼotu ohere a m nwere, ka m nwee ike ịbọrọ ọbọ nʼahụ ndị Filistia nʼihi, ọ bụladị, mkpụrụ anya m abụọ.”
Samson called out to the Lord, “Lord God, please remember me and give me strength. Please God, do this just once more, so that with one act I may pay the Philistines back in revenge for the loss of my two eyes.”
29 Mgbe ahụ, Samsin jidesiri ogidi abụọ dị nʼetiti ụlọ ahụ aka ike, aka nri ya nʼotu, aka ekpe ya na nke ọzọ.
Samson reached for the two middle pillars that supported the temple. With his right hand leaning on one pillar and his left hand on the other,
30 Samsin kpere ekpere sị, “Ka m soro ndị Filistia nwụọ!” O ji ike ya niile nuo ogidi ahụ aka. Otu mgbe ahụ kwa, ụlọ arụsị ahụ dara, dakwasị ndịisi ọchịchị Filistia ndị ahụ, na ndị niile nọ nʼime ụlọ ahụ. Ya mere, ndị niile so Samsin nwụọ nʼoge ahụ dị ọtụtụ karịa ndị Samsin gburu mgbe ọ dị ndụ.
Samson shouted, “Let me die with the Philistines!” and he pushed with all his strength. The temple collapsed on the rulers and all the people in it. So those killed at his death were more than he killed in his life.
31 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụnna ndị ikom Samsin, na ndị ezinaụlọ nna ya bịara nʼebe ahụ, buru ozu ya. Ha liri ya nʼagbata Zora na Eshtaol, ebe e liri nna ya Manoa. Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ.
Then his brothers and his whole family came and took him back and buried him between Zorah and Eshtaol in the tomb of Manoah his father. He led Israel as judge for twenty years.

< Ndị Ikpe 16 >