< Ndị Ikpe 15 >

1 Mgbe oge nta gasịrị, nʼoge owuwe ihe ubi, mgbe a na-aghọ ọka, Samsin weere nwa ewu nta, gaa ileta nwunye ya. O gwara nna nwunye ya sị, “Ana m aga nʼọnụụlọ nwunye m.” Ma nna nwunye ya ekweghị ka ọ banye.
Patapita nthawi, mu nyengo yodula tirigu, Samsoni anatenga kamwana kambuzi ndipo anapita kukacheza kwa mkazi wake. Iye anati, “Ndikufuna kukalowa ku chipinda cha mkazi wanga.” Koma abambo a mkaziyo anamuletsa kutero.
2 Nna ya sịrị, “O doro m anya na ị kpọrọ nwa m nwanyị asị, ọ bụ nʼihi nke a ka m jiri kenye ya enyi gị nwoke ka ọ bụrụ nwunye ya. Nwanne ya nwanyị nke nta, ọ maghị mma karịa ya? Kpọrọ ya ka ọ nọchie anya ya.”
Abambo a mkaziyo anati, “Ine ndimaganiza kuti umamuda kwambiri nʼchifukwa chake ndinamupereka kwa mnzako. Kodi mngʼono wake uja sindiye wokongola kupambana iye? Ingotengani ameneyo mʼmalo mwake.”
3 Samsin sịrị ha, “Nʼoge a, o ziri m ezi ị bọkwara ọbọ nʼebe ndị Filistia nọ.” Aghaghị m imesi ha ike.
Samsoni anawawuza kuti, “Pano sindikhala wochimwa ndikawachita choyipa chachikulu Afilistiwa.”
4 Ya mere, Samsin pụrụ gaa jide narị nkịta ọhịa atọ, wetakwa ọwa ụfọdụ. O kekọtara ọdụdụ ha abụọ abụọ. O kenyere ọwa nʼagbata otu nkịta ọhịa na ibe ya.
Choncho Samsoni anapita nakagwira nkhandwe 300 nazimangirira michira ziwiriziwiri ndipo pa fundo iliyonse ya michirayo anamangirira nsakali.
5 Emesịa, ọ mụnyere ọkụ nʼọwa ahụ niile. O mekwara ka nkịta ọhịa ndị ahụ dọkpụrụ ọwa a mụnyere ọkụ baa nʼubi ọka ndị Filistia, si otu a rechapụ ọka niile guzoro eguzo nʼubi, na ubi vaịnị niile, ha na osisi oliv niile ọkụ.
Anayatsa nsakalizo kenaka ndi kuzitayira nkhandwe zija mʼminda ya tirigu ya Afilisti, ndipo zinatentha milu ya tirigu, ndi wosadula yemwe pamodzi ndi mitengo ya mpesa ndi ya olivi.
6 Mgbe ndị Filistia chọpụtara ihe mere, ha jụrụ sị, “Onye mere ihe dị otu a?” A gwara ha, “Ọ bụ Samsin ọgọ onye Timna, nʼihi na a kpọnyere enyi ya nwunye ya.” Nʼihi nke a, ndị Filistia niile zukọtara kpọpụta nwaagbọghọ ahụ na nna ya kpọọ ha ọkụ.
Tsono Afilisti anayamba kufunsana kuti, “Ndani wachita izi?” Ena anati, “Ndi Samsoni mkamwini wa munthu wa ku Timna uja chifukwa Mtimunayo anatenga mkazi wake ndi kumupereka kwa mnzake.” Choncho Afilisti anapita kukatentha mtsikanayo pamodzi ndi abambo ake.
7 Ma Samsin gwara ha okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu mere ihe dị otu a, agaghị akwụsị tutu m bọrọ ọbọ ihe ọjọọ unu mere.”
Samsoni anawawuza kuti, “Ngati mumachita zangati zimenezi, ndiye ine sindileka mpaka nditakulipsirani.”
8 Ya mere, ọ pụkwuru ha ọzọ, site nʼoke iwe, gbuo ọtụtụ mmadụ nʼime ha. Mgbe nke a gasịrị, ọ gara biri nʼime otu ọgba nkume nke Etam.
Choncho Samsoni anamenyana nawo koopsa ndipo anapha ambiri a iwo. Kenaka anakalowa mʼphanga la Etamu, nakhala momwemo.
9 Ndị Filistia gara maa ụlọ ikwu ha nʼala Juda, gbasaa nʼala ahụ ruo obodo Lehi.
Pambuyo pake Afilisti anakamanga misasa ya nkhondo mʼdziko la Yuda, ndi kuthira nkhondo mʼdera la Lehi.
10 Ndị Juda jụrụ ajụjụ sị ha; “Ọ bụ gịnị mere unu ji bịa nʼebe a ibuso anyị agha?” Ha zara sị, “Anyị na-achọ ijide Samsin, ka anyị megwara ya ihe ọjọọ o mere anyị.”
Anthu a fuko la Yuda anafunsa kuti, “Nʼchifukwa chiyani mwabwera kudzamenyana nafe?” Iwo anayankha kuti, “Tabwera kudzamanga Samsoni ndi kuti timuchite zofanana ndi zimene anatichita.”
11 Nʼihi nke a, ndị Juda zipụrụ puku ndị agha ka ha gaa jide Samsin nʼọgba nkume ahụ nke Etam. Ndị a bịara jụọ Samsin ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Ọ bụ na ị maghị na ndị Filistia na-achị obodo anyị?” Samsin zara sị ha, “Ihe m mere bụ imegwata ha ihe ha mere m.”
Ndipo anthu 3,000 a ku Yuda anapita ku phanga la Etamu, ndi kukamufunsa Samsoni kuti, “Kodi iwe sudziwa kuti ife amatilamulira ndi Afilisti? Tsono ndi chiyani chimene watichitachi?” Iye anayankha kuti, “Ine ndinachita zomwe iwo anandichita.”
12 Ha sịrị ya, “Anyị abịala ka anyị kee gị agbụ, dọkpụrụ gị, nye nʼaka ndị Filistia.” Samsin sịrị ha, “Ṅụọrọnụ m iyi na unu agaghị eji aka unu gbuo m.”
Iwo anati kwa iye, “Ife tabwera kuti tikumange ndi kukupereka kwa Afilisti.” Ndipo Samsoni anati, “Lonjezani mwa lumbiro kuti simundipha ndinu.”
13 Ha zara sị ya, “Anyị agaghị egbu gị kama anyị ga-eke gị agbụ.” Ya mere, ha kere ya agbụ, duru ya jekwuru ndị Filistia.
Iwo anamuyankha kuti, “Ayi, ife sitikupha. Koma tingokumanga ndi kukupereka mʼmanja mwa Afilisti.” Choncho anamumanga ndi zingwe ziwiri zatsopano namutulutsa mʼphanga muja.
14 Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa.
Samsoni anafika ku Lehi, ndipo Afilisti anamuchingamira akufuwula. Nthawi yomweyo Mzimu wa Yehova unatsika pa iye mwamphamvu ndipo zingwe zimene anamumanga nazo zinasanduka ngati thonje lopsa mʼmoto, zinachita ngati zasungunuka nʼkuchoka mʼmanja mwake.
15 Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia.
Anapeza chibwano cha bulu amene anali atangofa kumene. Anachitola ndi kuphera nacho anthu 1,000.
16 Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.”
Ndipo Samsoni anati, “Ndi chibwano cha bulu, milu ndi milu ya anthu. Ndi chibwano cha bulu, ndapha anthu 1,000.”
17 Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi.
Atatsiriza kuyankhula, anataya chibwanocho, ndipo malowo anawatcha Ramati-Lehi.
18 Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?”
Pambuyo pake anamva ludzu kwambiri ndipo anayitana Yehova mopempha kuti, “Inu mwapatsa mtumiki wanu chipulumutso chachikulu chotere. Kodi tsopano ndife ndi ludzu ndi kugwidwa ndi anthu osachita mdulidwewa?”
19 Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa.
Pamenepo Mulungu anangʼamba nthaka ku Lehi, ndipo madzi anatuluka mʼdzenjemo. Samsoni anamwa madziwo, ndipo mphamvu zake zinabwerera nakhalanso monga analili. Choncho chitsimecho chinatchedwa Eni-Hakore, ndipo chilipobe ku Lehiko mpaka lero.
20 Ya mere, Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ nʼoge ndị Filistia.
Samsoni anatsogolera Israeli pa nthawi ya Afilisti kwa zaka makumi awiri.

< Ndị Ikpe 15 >