< Ndị Ikpe 13 >

1 Ndị Izrel mehiekwara ọzọ nʼihu onyenwe anyị. Nʼihi nke a, Onyenwe anyị kwenyere ka ndị Filistia merie ha. Ndị Izrel nọrọ nʼokpuru ọchịchị ha iri afọ anọ.
And the children of Israel again did that which was evil in the sight of the LORD; and the LORD delivered them into the hand of the Philistines forty years.
2 Nʼoge ahụ, o nwere otu nwoke onye Zora aha ya bụ Manoa. Nwoke a si nʼagbụrụ Dan, nwunye ya bụ nwanyị aga nke mere na ọ mụtaghị nwa.
And there was a certain man of Zorah, of the family of the Danites, whose name was Manoah; and his wife was barren, and bore not.
3 Otu ụbọchị, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri nwanyị a onwe ya, gwa ya okwu sị, “Ọ bụ ezie na ị bụ nwanyị aga nke mere na ị mụtaghị nwa ma na mgbe na-adịghị anya, ị ga-atụrụ ime mụta nwa.
And the angel of the LORD appeared unto the woman, and said unto her: 'Behold now, thou art barren, and hast not borne; but thou shalt conceive, and bear a son.
4 Ma site ugbu a, gaa nʼihu, aṅụkwala ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya. Erikwala ihe ọbụla rụrụ arụ.
Now therefore beware, I pray thee, and drink no wine nor strong drink, and eat not any unclean thing.
5 Ị ga-atụrụ ime, mụkwaa nwa nwoke, onye agụba agaghị aba nʼisi ya, nʼihi na ọ ga-abụ onye e kewapụrụ nye Chineke site nʼime akpanwa. Ọ ga-ebute ụzọ nʼịgbapụta Izrel site nʼaka ndị Filistia.”
For, lo, thou shalt conceive, and bear a son; and no razor shall come upon his head; for the child shall be a Nazirite unto God from the womb; and he shall begin to save Israel out of the hand of the Philistines.'
6 Nwanyị ahụ gbara ọsọ gbalaa gaa gwa di ya sị ya, “Otu onye nke Chineke egosila m onwe ya. O dokwara m anya na ọ bụ mmụọ ozi Chineke, nʼihi na ọ dị oke ebube nʼile anya. Ma ajụghị m ya ebe o siri bịa, ọ gwakwaghị m aha ya.
Then the woman came and told her husband, saying: 'A man of God came unto me, and his countenance was like the countenance of the angel of God, very terrible; and I asked him not whence he was, neither told he me his name;
7 Kama ọ sịrị m, ‘Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Ma ugbu a, ị gaghị aṅụ mmanya vaịnị maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ, nʼihi na nwantakịrị ahụ ga-abụ onye e doro nsọ nye Chineke, site nʼime akpanwa ruo nʼọnwụ ya.’”
but he said unto me: Behold, thou shalt conceive, and bear a son; and now drink no wine nor strong drink, and eat not any unclean thing; for the child shall be a Nazirite unto God from the womb to the day of his death.'
8 Mgbe ahụ, Manoa kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ sị, “Biko, Onyenwe anyị, ka onye nke Chineke ahụ i ziteere anyị bịaghachikwa ọzọ, kuziere anyị otu anyị ga-esi zụlite nwa nwoke a ga-amụta.”
Then Manoah entreated the LORD, and said: 'Oh, LORD, I pray Thee, let the man of God whom Thou didst send come again unto us, and teach us what we shall do unto the child that shall be born.'
9 Chineke zara ekpere ya. Mmụọ ozi ahụ bịakwutekwara nwunye Manoa mgbe ọ nọ nʼubi; maọbụ naanị ya nọ, di ya anọghị ya.
And God hearkened to the voice of Manoah; and the angel of God came again unto the woman as she sat in the field; but Manoah her husband was not with her.
10 Ya mere, nwanyị ahụ gbara ọsọ gaa gwa di ya sị, “Lee, nwoke ahụ bịakwutere m ụbọchị a, abịala ọzọ!”
And the woman made haste, and ran, and told her husband, and said unto him: 'Behold, the man hath appeared unto me, that came unto me that day.'
11 Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.”
And Manoah arose, and went after his wife, and came to the man, and said unto him: 'Art thou the man that spokest unto the woman?' And he said: 'I am.'
12 Manoa gwara ya okwu sị, “Mgbe okwu gị mezuru, gịnị bụ iwu banyere ndụ na ọrụ nwa nwoke a?”
And Manoah said: 'Now when thy word cometh to pass, what shall be the rule for the child, and what shall be done with him?'
13 Mmụọ ozi Onyenwe anyị zaghachiri, “Nwunye gị aghaghị imezu ihe niile m nke m gwara ya.
And the angel of the LORD said unto Manoah: 'Of all that I said unto the woman let her beware.
14 Ka ọ ghara iri ihe ọbụla si nʼosisi vaịnị, maọbụ ṅụọ mmanya ọbụla maọbụ ihe ọbụla na-aba nʼanya, maọbụ rie ihe rụrụ arụ ọbụla.”
She may not eat of any thing that cometh of the grapevine, neither let her drink wine or strong drink, nor eat any unclean thing; all that I commanded her let her observe.'
15 Manoa rịọrọ Mmụọ ozi Onyenwe anyị si ya, “Ọ ga-amasị anyị ma ị nọdụ chere ka anyị kwadoro gị nwa ewu.”
And Manoah said unto the angel of the LORD: 'I pray thee, let us detain thee, that we may make ready a kid for thee.'
16 Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị zara ya, “A sịkwarị na i mee ka m nọrọ, agaghị m eri nri gị ọbụla. Ma ọ bụrụ na i kwadoo aja nsure ọkụ, were ya chụọrọ Onyenwe anyị aja.” Ma Manoa aghọtaghị na onye ahụ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị.
And the angel of the LORD said unto Manoah: 'Though thou detain me, I will not eat of thy bread; and if thou wilt make ready a burnt-offering, thou must offer it unto the LORD.' For Manoah knew not that he was the angel of the LORD.
17 Mgbe ahụ, Manoa jụrụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ahụ, sị, “Biko, gịnị bụ aha gị, ka anyị nye gị nsọpụrụ dịịrị gị mgbe okwu gị mezuru?”
And Manoah said unto the angel of the LORD: 'What is thy name, that when thy words come to pass we may do thee honour?'
18 Ọ zara, “Nʼihi gịnị kwa ka ị na-ajụ banyere aha m? Ọ bụ ihe karịrị nghọta.”
And the angel of the LORD said unto him: 'Wherefore askest thou after my name, seeing it is hidden?'
19 Mgbe ahụ, Manoa weere nwa ewu, ya na ụfọdụ mkpụrụ ọka, jiri ha chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼelu nkume. Mgbe ahụ kwa, Onyenwe anyị mere ihe dị ebube nke ukwuu mgbe Manoa na nwunye ya guzo na-ele anya:
So Manoah took the kid with the meal-offering, and offered it upon the rock unto the LORD; and the angel did wondrously, and Manoah and his wife looked on.
20 Mgbe ire ọkụ ahụ sitere nʼebe ịchụ aja ahụ na-arịgo na-aga elu, Mmụọ ozi Onyenwe anyị wụliri elu soro ire ọkụ ahụ rigoro gawa nʼeluigwe! Mgbe Manoa na nwunye ya hụrụ ka nke a na-eme, ha kpuru ihu ha nʼala.
For it came to pass, when the flame went up toward heaven from off the altar, that the angel of the LORD ascended in the flame of the altar; and Manoah and his wife looked on; and they fell on their faces to the ground.
21 Mgbe Mmụọ ozi Onyenwe anyị na-egosighị onwe ya ọzọ nye Manoa na nwunye ya, ka Manoa ghọtara na ọ bụ Mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ha hụrụ.
But the angel of the LORD did no more appear to Manoah or to his wife. Then Manoah knew that he was the angel of the LORD.
22 Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!”
And Manoah said unto his wife: 'We shall surely die, because we have seen God.'
23 Ma nwunye ya zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị chọrọ igbu anyị, ọ garaghị anara aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka anyị chụrụ nye ya. Ọzọkwa, ọ garaghị egosi anyị ihe ndị a niile maọbụ gwa anyị ihe ndị a.”
But his wife said unto him: 'If the LORD were pleased to kill us, He would not have received a burnt-offering and a meal-offering at our hand, neither would He have shown us all these things, nor would at this time have told such things as these.'
24 Emesịa, nwanyị ahụ mụrụ nwa nwoke, onye ha gụrụ Samsin. Onyenwe anyị gọzikwara nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-etolite.
And the woman bore a son, and called his name Samson; and the child grew, and the LORD blessed him.
25 Mmụọ Onyenwe anyị bidokwara na-agba ya ume nʼoge niile, mgbe ọ nọ Mahane Dan, nke dị nʼetiti Zora na Eshtaol.
And the spirit of the LORD began to move him in Mahaneh-dan, between Zorah and Eshtaol.

< Ndị Ikpe 13 >