< Ndị Ikpe 12 >

1 Mgbe ahụ, ndị Ifrem kpọkọtara ndị agha ha na Zafọn zigara Jefta ozi sị ya, “Gịnị mere ị kpọghị anyị ka anyị bịa nyere gị aka ịlụso ndị Amọn agha? Anyị na-abịa iwere ọkụ irechapụ gị na ezinaụlọ gị.”
Watu wa Efraimu walitoka pamoja; nao wakapitia Zafoni, wakamwambia Yeftha, Kwa nini umetangulia kupigana na wana wa Amoni, wala hukutuita twende pamoja nawe? Tutachoma nyumba yako.
2 Jefta zaghachiri ha sị, “Akpọrọ m unu mgbe mụ na ndị m na ndị Amọn na-ese okwu dị ukwu ma unu jụrụ ịbịa. Unu azọpụtaghị m site nʼaka ha.
Yeftha akawaambia, Mimi na watu wangu tulikuwa katika vita kubwa na wana wa Amoni. Nilipokuita, hukuniokoa kutoka kwao.
3 Mgbe m hụrụ na unu achọghị inyere anyị aka, e tinyere m ndụ m nʼaka m, gabiga nʼofe nke ọzọ ibuso ndị Amọn agha. Ma Onyenwe anyị nyeere m aka imeri ha. Ugbu a, nʼihi gịnị ka unu ji bịa ịlụso m ọgụ taa?”
Nilipoona ya kuwa hamkuniokoa, nikaweka uhai wangu na nguvu yangu mwenyewe, na kupita kipita ili kupigana na wana wa Amoni, na Bwana alinipa ushindi. Kwa nini mmekuja kupigana nami leo?”
4 Jefta kpọkọtara ndị ikom Gilead pụọ buso ndị Ifrem agha. Ndị Gilead tidara ha nʼala nʼihi na ndị Ifrem sịrị, “Ndị gbapụrụ agbapụ site nʼIfrem na Manase ka unu bụ.”
Yeftha akawakusanya watu wote wa Gileadi na akapigana na Efraimu. Watu wa Gileadi waliwaangamiza wana wa Efraimu kwa sababu walisema, “Ninyi Wagileadi ni wakimbizi katika Efraimu-katika Efraimu na Manase.”
5 Ọ nọchiri akụkụ Jọdan dị ndị agha Ifrem nʼazụ, ebe ndị agha Ifrem nwere ike isi gbapụ. Mgbe ọbụla onye agha Ifrem ọbụla gbapụrụ ọsọ chọọ ịgafe osimiri ahụ, ndị agha Gilead ga-ejide ya jụọ ya sị, “Ị bụ onye Ifrem?” Ọ bụrụ na onye ahụ ekwuo na ya abụghị onye Ifrem,
Wagileadi waliteketeza ngome za Yordani zinaelekea Efraimu. Ikiwa yeyote kati ya waliopona wa Efraimu akisema, Nipe ruhusa niende juu ya mto; watu wa Gileadi wakamwambia, “Je, wewe ni Mwefraimu?” Ikiwa akasema, “Hapana,”
6 ha sịrị, “Ọ dị mma, kpọọ, ‘Shibolet.’” Ọ bụrụ na onye ahụ akpọ, “Sibolet,” nʼihi na ọ kpọpụtaghị mkpụrụ okwu ahụ nke ọma, ha na-akpụrụ ya gbuo ya na ngabiga mmiri Jọdan. Ọ bụ ọnụọgụgụ iri puku anọ, na puku abụọ ndị Ifrem ka e gburu mgbe ahụ.
basi watamwambia, Sema Shiboleth. Na kama akisema 'Sibboleth' (kwa maana hakuweza kutamka neno hilo kwa usahihi), Wagileadi watamkamata na kumwua kwenye mabwawa ya Yordani. Waefraimu elfu arobaini waliuawa wakati huo.
7 Jefta duuru ndị Izrel afọ isii. Mgbe ọ nwụrụ, e liri ya nʼotu obodo Gilead.
Yeftha alikuwa mwamuzi juu ya Israeli kwa miaka sita. Ndipo Yeftha Mgileadi akafa, akazikwa katika moja ya miji ya Gileadi.
8 Onye ikpe ọzọ Izrel nwere bụ Ibzan onye bi na Betlehem.
Baada yake, Ibzani wa Bethlehemu akawa mwamuzi juu ya Israeli.
9 O nwere iri ụmụ ndị ikom atọ na iri ụmụ ndị inyom atọ. O kenyere ndị ikom ikwu ọzọ ụmụ ya ndị inyom. Otu a kwa, o sikwa nʼikwu ọzọ lụtara ụmụ ya ndị ikom iri ndị inyom atọ. O kpere Izrel ikpe afọ asaa.
Alikuwa na wana thelathini. Aliwapeleka binti thelathini katika ndoa, naye akaleta binti thelathini kutoka nje kwa ajili ya wanawe, Alikuwa mwamuzi wa Israeli kwa miaka saba.
10 Ibzan nwụrụ, e lie ya na Betlehem.
Ibzani alikufa na kuzikwa huko Bethlehemu.
11 Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Elọn, onye Zebụlọn. O kpere Izrel ikpe afọ iri.
Baada yake, Eloni wa Zabuloni akawa mwamuzi juu ya Israeli. Akawaamua Israeli kwa miaka kumi.
12 Emesịa, Elọn nwụrụ, e lie ya nʼAijalon, nʼime ala Zebụlọn.
Eloni wa Zabuloni akafa, akazikwa huko Aiyaloni katika nchi ya Zabuloni.
13 Onye ọzọ kpere Izrel ikpe bụ Abdon nwa Hilel, onye Piraton.
Baada ya huyo, Abdoni mwana wa Hileli, Mpirathoni, akawa mwamuzi juu ya Israeli.
14 O nwere iri ụmụ ndị ikom anọ na iri ụmụ ụmụ atọ ndị na-agba iri ịnyịnya ibu asaa. O kpere ụmụ Izrel ikpe afọ asatọ.
Alikuwa na wana arobaini na wajukuu thelathini. Walikuwa wakipanda punda sabini, naye akawaamua Israeli kwa miaka nane.
15 Mgbe ahụ, Abdon nwa Hilel nwụrụ, e lie ya na Piraton ala dị nʼIfrem, nʼobodo ugwu ndị Amalek.
Abdoni mwana wa Hileli, Mpirathoni, akafa, akazikwa huko Pirathoni katika nchi ya Efraimu, katika kilima cha Waamaleki.

< Ndị Ikpe 12 >