< Jud 1 >

1 Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
Judha, muranda waJesu Kristu nomununʼuna waJakobho, kuna vaya vakadanwa, vanodikanwa naMwari Baba, vanochengetwa naJesu Kristu:
2 Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba.
Ngoni, rugare norudo ngazviwande kwamuri.
3 Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe.
Shamwari dzinodikanwa, kunyange ndakanga ndichishingairira kuti ndinyore kwamuri pamusoro poruponeso rwatinogovana, ndakafunga kuti ndinofanira kunyora ndichikukurudzirai kuti murwire kutenda kwakapiwa vatsvene kamwe.
4 Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.
Nokuti vamwe varume vane kutongwa kwavo kwakanyorwa nezvako kare, vakapinda muchivande pakati penyu. Ivo vanhu vasina umwari, vanoshandura nyasha dzaMwari wedu vachidzitora semvumo yokuita upombwe, uye vachiramba Jesu Kristu, Ishe naTenzi wedu mumwe oga.
5 Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi.
Kunyange maizviziva henyu kare, ndinoda kukuyeuchidzai kuti Ishe akasunungura vanhu vake kubva muIjipiti, asi pashure akaparadza vaya vakanga vasingatendi.
6 Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. (aïdios g126)
Uye vatumwa vasina kuchengeta nzvimbo youkuru hwavo asi vakasiya musha wavo, ivava akavachengeta murima, vakasungwa nengetani dzokusingaperi vakamirira kutongwa pazuva guru. (aïdios g126)
7 Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Nenzira imwe cheteyo, Sodhomu neGomora uye namaguta akanga akapoteredza akazvipa kuupombwe nokutsauka, akava muenzaniso wavaya vari pakurangwa nomoto usingaperi. (aiōnios g166)
8 Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.
Nenzira imwe cheteyo, ava varoti vanosvibisa miviri yavo, vachiramba vakuru uye vachituka zvisikwa zvokudenga.
9 Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”
Asi kunyange Mikaeri mutumwa mukuru, paakanga achirwa nadhiabhori pamusoro pomuviri waMozisi, haana kutsunga kutaura mashoko okutuka nokumupomera mhosva, asi akati, “Ishe ngaakutuke!”
10 Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.
Asi vanhu ava vanotaura zvisina maturo pamusoro pezvinhu zvavasinganzwisisi; uye kunyange nezvinhu zvavanonzwisisa kubva pakuberekwa kwavo, semhuka dzisingafungi, zvinhu izvozvi ndizvo chaizvo zvinovaparadza.
11 Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.
Vane nhamo! Vakasarudza nzira yaKaini; vakamhanyira mubayiro wokutsauka kwaBharamu; vakaparadzwa mukupanduka kwaKora.
12 Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ.
Vanhu ava makwapa pamitambo yenyu yorudo, vanodya nemi vasingatyi napaduku, vanongozvipa zvokudya ivo chete. Makore asina mvura, anotinhwa nemhepo; miti yenguva yamasutso, isina michero uye yakadzurwa, yakafa zvakapetwa kaviri.
13 Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi. (aiōn g165)
Mafungu egungwa anopenga, anopupuma nyadzi dzawo; nyeredzi dzinodzungaira, ivava vakachengeterwa rima guru nokusingaperi. (aiōn g165)
14 Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya.
Enoki, wechinomwe kubva kuna Adhamu, akaprofita pamusoro pavanhu ava achiti, “Tarirai, Ishe ari kuuya nezviuru nezviuru zvavatsvene vake
15 Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”
kuti azotonga vanhu vose, uye abate nemhosva vose vasina umwari pamusoro pamabasa ose asina umwari avakaita nenzira isina umwari, uye namashoko okutuka akataurwa navanhu vasina umwari pamusoro pake.”
16 Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha.
Vanhu ava vanyunyuti uye vapomeri; vanotevera kuchiva kwavo vamene; vanozvirumbidza pachavo uye vanobata vamwe kumeso kuti zvivanakire ivo.
17 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu.
Asi, vadikani, rangarirai zvakataurwa navapostori vaIshe wedu Jesu Kristu.
18 Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ.
Vakati kwamuri, “Munguva yokupedzisira kuchava navaseki vachatevera kuchiva kwavo.”
19 Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.”
Ava ndivo vanhu vanokuparadzanisai, vanotevera nyama yavo uye vasina Mweya.
20 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ.
Asi imi, vadikani, zvivakei mukutenda kwenyu kutsvene uye munyengetere muMweya Mutsvene.
21 Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Zvichengetei murudo rwaMwari pamunenge muchimirira ngoni dzaIshe wedu Jesu Kristu kuti dzikuuyisei kuupenyu husingaperi. (aiōnios g166)
22 Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere.
Itirai ngoni avo vanokahadzika;
23 Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.
bvutai vamwe kubva mumoto mugovaponesa; vamwe muvanzwire ngoni dzakasanganiswa nokutya, muchivenga kunyange nenguo dzakasvibiswa nenyama.
24 Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ
Kuna iye anogona kukuchengetai kuti murege kugumburwa uye anokuisai pamberi pokubwinya kwake musina chamunopomerwa, uye nomufaro mukuru,
25 ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
kuna iye Mwari oga muponesi wedu, ngakuve nokubwinya, umambo, simba noukuru, nokuna Jesu Kristu Ishe wedu, nguva isati yavapo, zvino nokusingaperi! Ameni. (aiōn g165)

< Jud 1 >