< Jud 1 >

1 Jud, odibo Jisọs Kraịst, na nwanne Jemis, Na-edegara ndị niile a kpọrọ, ndị ahụrụ nʼanya nʼime Chineke, bụ Nna, na ndị nọkwa nʼokpuru nchebe Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
JUDE a servant of Jesus Christ, and brother of James, to those who are sanctified in God the Father, and preserved by Jesus Christ, the called:
2 Ka ebere na udo na ịhụnanya bara unu ụba.
mercy unto you, and peace and love be multiplied.
3 Ndị m hụrụ nʼanya, ebe ọ na-anụ m ọkụ nʼobi idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nʼotu, ma ahụrụ m mkpa ọ dị idere unu akwụkwọ a, ịrịọ unu ka unu guzosie ike buo agha ichebe okwukwe ahụ, nke e nyefere ndị nsọ nʼaka idebe.
Beloved, when I gave all diligence to write unto you concerning the common salvation, I held it necessary to write unto you, exhorting you to contend earnestly for the faith once delivered unto the saints.
4 Nʼihi na ụfọdụ mmadụ, bụ ndị e dere ihe banyere ọmụma ikpe dịrị ha, siterị nʼoge gara aga, ezobatala nʼetiti unu. Ha bụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agbanwe amara Chineke anyị, mee ya ka ọ bụrụ ohere ha nwere ibi ndụ ịkwa iko, na nke ịgọnarị Jisọs Kraịst, onye naanị ya bụ Onye kachasị ihe niile elu na Onyenwe.
For certain men have craftily introduced themselves, who were from of old proscribed for this condemnation, ungodly men, changing the grace of God into impurity, and denying our only sovereign God and Lord, Jesus Christ.
5 Ọ bụ ezie na unu maa ihe ndị a niile, ma achọrọ m ichetara unu otu Onyenwe anyị si zọpụta ndị ya site nʼala Ijipt, ma mesịa laa ndị niile na-ekweghị ekwe nʼiyi.
But I would remind you, though ye once knew this, that the Lord, though he delivered the people out of the land of Egypt, afterwards destroyed those who believed not.
6 Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. (aïdios g126)
And the angels who preserved not their own primitive state, but deserted their proper abode, hath he reserved in everlasting chains under darkness, unto the judgment of the great day. (aïdios g126)
7 Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
As Sodom and Gomorrha and the surrounding cities, in like manner with them abandoned to whoredom, and going after other flesh, are set forth an example, suffering the judicial punishment of eternal fire. (aiōnios g166)
8 Nʼụzọ dị otu a kwa, ndị a na-emerụ anụ ahụ ha nʼirọ nrọ ha, na-ajụkwa ike ọchịchị niile, ma na-ekwulukwa ndị ahụ jupụtara nʼebube nke anya na-adịghị ahụ.
In like manner also do these men, even when they dream, defile indeed the flesh, despise sovereignty, and revile dignities.
9 Ma Maikel onyeisi ndị mmụọ ozi, mgbe o guzogidere ekwensu na-arụrịtakwa ụka banyere ozu Mosis, ya onwe ya enweghị anya ike ịma ya ikpe nʼihi okwu nkwulu, kama ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị baara gị mba.”
Though Michael the archangel, when contending with the devil, he disputed about the body of Moses, dared not to produce a railing accusation, but said, The Lord rebuke thee.
10 Ma ndị a na-ekwulu ihe niile ọbụla ha na-aghọtaghị. Dịka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọbụla dị ha mma nʼanya si otu a na-ala onwe ha nʼiyi.
But these men speak evil even of the things of which they have no knowledge: but such things as they know naturally, as the brute beasts, in these they corrupt themselves.
11 Ahụhụ ga-adịrị ha, nʼihi na ha soro nzọ ụkwụ Ken, nyefee onwe ha na ndahie Belam nʼihi ihe nrite nʼuru, ma laa nʼiyi na nnupu isi Kora.
Wo unto them! for they have walked in the way of Cain, and have eagerly run in Balaam’s erroneous path of hire, and have perished in opposition, like Corah.
12 Ndị a bụ ihe ntụpọ nʼetiti unu nʼoge mmemme oriri ịhụnanya unu, ha na-eso unu na-erikọ nri na-atụghị egwu ọbụla. Ha bụ ndị na-elekọta naanị onwe ha. Ha dị ka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri, nke ifufe na-ebugharị. Ha bụ osisi a na-ahụ nʼoge ọkọchị nke na-adịghị amị mkpụrụ, nke e si na mgbọrọgwụ ya hoputa, nke nwụrụ anwụ ugboro abụọ.
These are in your feasts of love, as sunken rocks; though joining in your banquet, they feed themselves fearlessly; clouds without water carried about by the winds; trees untimely withering, fruitless, twice dead, rooted up;
13 Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi. (aiōn g165)
raging billows of the sea foaming out their own infamies; stars wandering from their courses, for whom the blackness of darkness for ever is reserved. (aiōn g165)
14 Ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka Enọk, onye bụ agbụrụ nke asaa site nʼAdam buru nʼamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na puku kwụrụ puku ndị nsọ ya.
Now Enoch, the seventh from Adam, prophesied also of these men, saying, Behold, the Lord cometh with myriads of his saints,
15 Ọ na-abịa ikpe mmadụ niile ikpe, na ịtụ ha niile mmehie ajọ omume niile ha nʼanya, bụ nke ha mere nʼụzọ na-ezighị ezi. Tinyere okwu ọjọọ niile nke ndị mmehie ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke kwuru megide ya.”
to execute judgment against all men, and to convict all the ungodly of all their deeds of ungodliness which they have impiously committed, and of all the bitter words which impious offenders have spoken against him.
16 Ndị a bụ ndị na-atamu ntamu oge niile, ndị o nweghị ihe ọbụla na-adị ha mma. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ. Ha na-anya isi banyere onwe ha, na-aja ndị ọzọ mma; ka ha nwee ike nweta ihe ha na-achọ nʼaka ha.
These men are murmurers, complainers at their lot in life, walking after their own corrupt passions; and their mouth utters hyperbolically pompous expressions, pretending high personal admiration, in order to make their advantage.
17 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, chetanụ ihe ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kwuru na ha ga-emezu.
But ye, beloved, remember the words which have been spoken before by the apostles of our Lord Jesus Christ,
18 Nʼihi na ha sịrị unu, “Nʼọgwụgwụ oge ahụ, ndị na-eji ihe niile na-emere ihe ọchị ga-adị. Ndị na-agbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ.
how they told you that in the last time there will be scoffers, walking after their own ungodly passions.
19 Ọ bụ ndị anụ ahụ ha na-achị, ndị na-enweghị Mmụọ Nsọ nʼime ha, bụ ndị na-eweta nkewa nʼetiti unu.”
These are the men who separate themselves, sensual, destitute of the Spirit.
20 Ma unu, ndị m hụrụ nʼanya, nọgidenụ na-ewuli onwe unu elu na ntọala okwukwe unu dịkarịsịrị nsọ. Na-ekpekwanụ ekpere nʼime Mmụọ Nsọ.
But ye, beloved, building yourselves up on your most holy faith, praying by the Holy Ghost,
21 Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
preserve yourselves in the love of God, waiting for the mercy of our Lord Jesus Christ unto eternal life. (aiōnios g166)
22 Gosinụ ụfọdụ ndị na-enwe obi abụọ ebere.
And of some have compassion, distinguishing their case;
23 Zọpụtanụ ndị ọzọ site nʼịgụpụta ha nʼọkụ. Nʼebe ndị ọzọ nọ gosinụ ha obi ebere, kama jirinụ ịtụ egwu mee nke a, kpọọnụ ọ bụladị uwe nke anụ ahụ mmehie merụrụ asị.
and others save with trembling, snatching them out of the fire; though hating even the garment spotted by the flesh.
24 Ugbu a, nye onye ahụ pụrụ ichebe unu, ka unu ghara ịda, onye pụrụ ịkpọbata unu nʼihu ya dị ebube nʼọnọdụ enweghị ntụpọ ọbụla nʼoke ọṅụ
Now to him who is able to guard you from stumbling, and to present you blameless before the presence of his glory with exultation,
25 ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
to the only wise God our Saviour, be glory and majesty, might and dominion, both now and unto all eternity. Amen. (aiōn g165)

< Jud 1 >