< Joshua 9 >

1 Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus,
When all the kings who were beyond the Jordan, in the hill country, and in the lowland, and on all the shore of the great sea in front of Lebanon, the Hittite, the Amorite, the Canaanite, the Perizzite, the Hivite, and the Jebusite, heard of it
2 ha niile zukọtara ibu agha megide Joshua na ụmụ Izrel.
they gathered themselves together to fight with Joshua and with Israel, with one accord.
3 Ma mgbe ndị Gibiọn nụrụ ihe Joshua mere Jeriko na Ai,
But when the inhabitants of Gibeon heard what Joshua had done to Jericho and to Ai,
4 ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha.
they also resorted to a ruse, and went and made as if they had been ambassadors, and took old sacks on their donkeys, and old, torn-up and bound up wine skins,
5 Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu.
and old and patched sandals on their feet, and wore old garments. All the bread of their food supply was dry and moldy.
6 Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.”
They went to Joshua at the camp at Gilgal, and said to him and to the men of Israel, “We have come from a far country. Now therefore make a covenant with us.”
7 Ndị ikom Izrel zaghachiri sị ndị Hiv ahụ, “Olee otu anyị si amata na unu ebighị anyị nso? Ma eleghị anya unu bi anyị nso, anyị na unu ọ ga-esi aṅaa gbaa ndụ?”
The men of Israel said to the Hivites, “What if you live among us? How could we make a covenant with you?”
8 Ha zara Joshua sị ya, “Anyị bụ ndị ohu unu.” Ma Joshua jụrụ ha ajụjụ sị, “Olee ndị unu bụ? Ebee ka unu si bịa?”
They said to Joshua, “We are your servants.” Joshua said to them, “Who are you? Where do you come from?”
9 Ha zara ya sị, “Ala anyị, ebe ndị ohu gị si bịa dị anya nke ukwuu. Anyị bịara nʼihi na anyị anụla akụkọ banyere Onyenwe anyị Chineke unu, na ihe niile o mere nʼIjipt.
They said to him, “Your servants have come from a very far country because of the name of Yahweh your God; for we have heard of his fame, all that he did in Egypt,
10 Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọrait, ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, Saịhọn eze Heshbọn, na Ọg eze Bashan, onye chịrị nʼAshtarọt.
and all that he did to the two kings of the Amorites who were beyond the Jordan, to Sihon king of Heshbon and to Og king of Bashan, who was at Ashtaroth.
11 Ndị okenye anyị na ndị niile bi nʼala anyị sịrị anyị, ‘Werenụ ihe unu ji aga njem, jekwurunụ ndị Izrel sị ha, “Anyị bụ ndị ohu unu, kwerenụ ka anyị na unu gbaa ndụ.”’
Our elders and all the inhabitants of our country spoke to us, saying, ‘Take supplies in your hand for the journey, and go to meet them. Tell them, “We are your servants. Now make a covenant with us.”’
12 Lee achịcha ndị a bụ nke anyị ji mgbe anyị hapụrụ ala anyị. Ha dị ọkụ mgbe anyị hapụrụ ụlọ anyị ịbịa njem a, nʼihi na e si nʼebe a na-eghe ya wepụta ya, ma ugbu a, dịka unu hụrụ, ha akpọọla nkụ, bidokwa ịma ebu.
This our bread we took hot for our supplies out of our houses on the day we went out to go to you; but now, behold, it is dry, and has become moldy.
13 A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.”
These wine skins, which we filled, were new; and behold, they are torn. These our garments and our sandals have become old because of the very long journey.”
14 Ndị ikom Izrel ritụrụ ụfọdụ nʼime ihe oriri ha ji bịa, ma ha ajụtaghị ihe bụ uche Onyenwe anyị.
The men sampled their provisions, and didn’t ask counsel from Yahweh’s mouth.
15 Mgbe ahụ, Joshua na ndị ahụ gbara ndụ udo ikwe ka ha dị ndụ. Ndịisi nzukọ Izrel mesiri ọgbụgba ndụ ahụ ike site nʼịṅụ iyi.
Joshua made peace with them, and made a covenant with them, to let them live. The princes of the congregation swore to them.
16 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị site na mgbe ụmụ Izrel na ndị Gibiọn gbara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ndị Gibiọn bụ ndị agbataobi ha, ndị bi ha nso.
At the end of three days after they had made a covenant with them, they heard that they were their neighbors, and that they lived among them.
17 Ya mere, ndị Izrel buliri ije gaa ịchọpụta ebe ndị a si bịa, si otu a bịaruo obodo ha niile nʼụbọchị nke atọ. Aha obodo ha bụ Gibiọn, Kefira, Beerọt na Kiriat Jearim.
The children of Israel traveled and came to their cities on the third day. Now their cities were Gibeon, Chephirah, Beeroth, and Kiriath Jearim.
18 Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ. Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a.
The children of Israel didn’t strike them, because the princes of the congregation had sworn to them by Yahweh, the God of Israel. All the congregation murmured against the princes.
19 Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla.
But all the princes said to all the congregation, “We have sworn to them by Yahweh, the God of Israel. Now therefore we may not touch them.
20 Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.”
We will do this to them, and let them live; lest wrath be on us, because of the oath which we swore to them.”
21 Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ.
The princes said to them, “Let them live.” So they became wood cutters and drawers of water for all the congregation, as the princes had spoken to them.
22 Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso?
Joshua called for them, and he spoke to them, saying, “Why have you deceived us, saying, ‘We are very far from you,’ when you live among us?
23 Ugbu a, unu ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, unu aghọọla ndị ohu anyị, ndị ga na-awara anyị nkụ mgbe niile, na ndị ga na-ekutere anyị mmiri nke anyị ga-eji rụọ ọrụ nʼụlọnsọ Chineke m.”
Now therefore you are cursed, and some of you will never fail to be slaves, both wood cutters and drawers of water for the house of my God.”
24 Ha zara Joshua sị, “Anyị mere nke a nʼihi na agwala anyị na Onyenwe anyị Chineke gị nyere Mosis iwu sị ya merie ala ndị a niile, ma kpochapụ ndị niile bi nʼime ya. Ọ bụ nke a mere ụjọ ji tụọ anyị. Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe dị otu a, nʼihi ichebe ndụ anyị.
They answered Joshua, and said, “Because your servants were certainly told how Yahweh your God commanded his servant Moses to give you all the land, and to destroy all the inhabitants of the land from before you. Therefore we were very afraid for our lives because of you, and have done this thing.
25 Ma ugbu a, anyị dị unu nʼaka. Unu nwere ike ime anyị ihe dị unu mma.”
Now, behold, we are in your hand. Do to us as it seems good and right to you to do.”
26 Nʼihi nke a, Joshua ekweghị ka ndị Izrel gbuo ha.
He did so to them, and delivered them out of the hand of the children of Israel, so that they didn’t kill them.
27 Joshua mere ha ndị ọwa nkụ na ndị ose mmiri nye ụmụ Izrel, na ịhụkwa banyere ihe ndị dị mkpa nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Ọ bụkwa nke a ka ha bụ ruo taa.
That day Joshua made them wood cutters and drawers of water for the congregation and for Yahweh’s altar to this day, in the place which he should choose.

< Joshua 9 >