< Joshua 8 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla egwu, adakwala mba. Chịrị ndị agha gị niile gaa Ai, nʼihi na ugbu a, unu onwe unu ga-emeri ha. Aga m eme ka i merie eze ndị Ai, na ndị ya na obodo ya, na ala ya.
And Jehovah said to Joshua, Fear not, neither be dismayed. Take with thee all the people of war, and arise, go up to Ai. See, I have given into thy hand the king of Ai, and his people, and his city, and his land.
2 Ị ga-emekwa obodo Ai na eze ya ihe i mere Jeriko na eze ya. Ma ihe dị iche na nke a bụ na unu ga-edebere onwe unu ihe niile unu kwatara nʼagha, ya bụ anụ ụlọ niile na ngwongwo obodo ahụ niile. Jikerenụ ibuso ha agha. Ọ bụkwa nʼazụ obodo ha ka unu ga-esi lụso ha agha.”
And thou shalt do to Ai and to its king as thou didst to Jericho and to its king; only, the spoil thereof and the cattle thereof shall ye take as prey for yourselves. Set an ambush against the city behind it.
3 Mgbe ahụ, Joshua na ndị agha ya niile, biliri gaa ibuso Ai agha. Joshua họpụtara iri puku ndị agha atọ zipụ ha nʼabalị
And Joshua arose, and all the people of war, to go up to Ai. And Joshua chose thirty thousand valiant men, and sent them away by night.
4 o nyere ha iwu a, “Lee! Unu ga-aga zoo onwe unu nʼọhịa dị nʼazụ obodo Ai. Unu ezola onwe unu nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ, kama nọọnụ nso, nọọkwanụ na njikere.
And he commanded them, saying, See, ye shall be in ambush against the city, behind the city: go not very far from the city, and be all of you ready.
5 Mụ na ndị niile so m ga-abịaru obodo ahụ nso. Mgbe ha ga-apụta ịlụso anyị ọgụ dịka ha mere na mbụ, anyị ga-agbakwa ọsọ nʼihu ha,
And I and all the people that are with me will approach to the city; and it shall come to pass when they come out against us, as at the first, that we will flee before them.
6 Ha ga-achụ anyị ọsọ, tutu ruo mgbe anyị mere ka ha niile hapụ nʼobodo ha pụta. Nʼihi nʼuche ha, ha ga-asị, ‘Ha na-agbara anyị ọsọ dịka ha mere na mbụ, bịanụ ka anyị chụọ ha ọsọ gbuo ha.’ Ya mere, dịka anyị na-agbapụ site nʼebe ha nọ,
And they will come out after us till we have drawn them from the city; for they will say, They flee before us, as at the first; and we will flee before them.
7 unu ga-esite nʼebe unu zoro onwe unu bilie, nweta obodo ahụ, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ya nʼaka unu.
And ye shall rise up from the ambush and take possession of the city; and Jehovah your God will deliver it into your hand.
8 Mgbe unu weere obodo ahụ, unu ga-esunye obodo ahụ ọkụ. Meenụ ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu. Hụnụ na unu mezuru ihe ndị a m nyere unu nʼiwu.”
And it shall be when ye have taken the city, that ye shall set the city on fire; according to the word of Jehovah shall ye do. See, I have commanded you.
9 Mgbe Joshua nyesịrị ha iwu ndị a, o zipụrụ ha. Ha hapụkwara nʼabalị ahụ gaa zoo onwe ha nʼọhịa dị nʼetiti Betel na ọdịda anyanwụ Ai. Ma Joshua na ndị agha ndị ọzọ fọdụrụ nọdụrụ nʼabalị ahụ nʼetiti ndị Izrel.
And Joshua sent them forth; and they went to lie in ambush, and abode between Bethel and Ai, on the west of Ai. And Joshua lodged that night among the people.
10 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Joshua chịkọtara ndị agha ya, ya na ndị ndu Izrel gara nʼihu ha, ruo Ai.
And Joshua rose early in the morning, and inspected the people, and went up, he and the elders of Israel, before the people to Ai.
11 Ndị agha niile ha na ya so, chere ihu ha gaa nso obodo ruo nʼihu ya. Ha mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ugwu obodo Ai, ndagwurugwu bụ ihe kewara ha na obodo ahụ.
And all the people of war that were with him went up, and drew near, and came before the city; and they encamped on the north of Ai; and the valley was between them and Ai.
12 Joshua chịịrị ihe ruru puku ndị agha ise, zoo ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ obodo ahụ, nʼetiti Betel na Ai.
Now he had taken about five thousand men, and set them in ambush between Bethel and Ai, on the west of the city.
13 Ya mere, ndị agha were ọnọdụ ha nʼusoro, ndị ga-ebu agha nọ nʼakụkụ ugwu, ndị niile zoro onwe ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo ahụ. Ma nʼabalị ahụ, Joshua gara nọdụ na ndagwurugwu ahụ.
And when they had set the people, the whole camp on the north of the city, and their ambush on the west of the city, Joshua went that night into the midst of the valley.
14 Mgbe eze Ai hụrụ nke a, ya na ndị ikom obodo ahụ niile mere ngwangwa pụọ nʼisi ụtụtụ izute ndị Izrel nʼotu ebe, nke chere ihu nʼAraba. Ma ọ mataghị na o nwere ndị agha zubere imegide ya ndị zoro onwe ha nʼọhịa dị nʼazụ obodo.
And it came to pass when the king of Ai saw it, that the men of the city hasted and rose early, and went out against Israel to battle, he and all his people, at the appointed place before the plain. But he knew not that there was an ambush against him behind the city.
15 Joshua na ndị Izrel niile mere ka ha chụghachi ha azụ site nʼihu ha, ha gbara ọsọ na-aga akụkụ ọzara ahụ niile dịka ndị e meriri emeri.
And Joshua and all Israel let themselves be beaten before them; and they fled by the way of the wilderness.
16 Nʼihi nke a, a kpọkuru ndị ikom niile nọ nʼime obodo Ai sị ha pụta bịa chụọ ụmụ Izrel ọsọ, ha chụrụ Joshua na-aga, e si otu a rapụta ha nʼebe dị anya site nʼobodo ahụ.
And all the people that were in the city were called together to pursue after them; and they pursued after Joshua, and were drawn away from the city.
17 Ọ dịkwaghị otu onye nwoke nke fọdụrụ na Ai maọbụ na Betel. Ha hapụkwara obodo ahụ ka o ghere oghe, gaa ịchụ ndị Izrel ọsọ.
And not a man remained in Ai and Bethel that went not out after Israel; and they left the city open, and pursued after Israel.
18 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ Joshua sị ya, “Setịpụ ùbe dị gị nʼaka nʼụzọ Ai, nʼihi na aga m enye gị obodo a.” Joshua mere dịka Onyenwe anyị gwara ya.
And Jehovah said to Joshua, Stretch out the javelin that is in thy hand toward Ai; for I will give it into thy hand. And Joshua stretched out the javelin that he had in his hand toward the city.
19 Mgbe ndị agha ahụ zoro onwe ha nʼime ọhịa lere anya hụ na Joshua setịrị aka ya, ngwangwa, ha wụpụtara site nʼebe ha zoro onwe ha, gbara ọsọ gbaba nʼobodo Ai, merie ya, mụnye ya ọkụ.
And the ambush arose quickly from their place, and they ran when he stretched out his hand, and came into the city, and took it, and hasted and set the city on fire.
20 Ma mgbe ndị agha Ai lere anya nʼazụ, hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo ha na-alali elu, ha dara mba nʼime onwe ha. Ohere ọbụla adịghịkwa nye ha ịgbalaga gaa otu ụzọ maọbụ ụzọ ọzọ. Nʼihi na ndị Izrel ahụ buuru ụzọ gbaa ọsọ, ndị ahụ gbara na-aga nʼọzara, chigharịrị bido ịlụso ndị agha Ai ahụ na-achụ ha ọsọ ọgụ.
And the men of Ai turned and saw, and behold, the smoke of the city went up to heaven, and they had no power to flee this way or that way; and the people that fled to the wilderness turned upon the pursuers.
21 Nʼihi na mgbe Joshua na ndị agha Izrel so ya lepụrụ anya hụ ka anwụrụ ọkụ si nʼobodo Ai na-arịgo elu, ha matara na ndị ha zoro onwe ha nʼọhịa abanyela obodo Ai, lụgbuo ya. Ya mere, Joshua na ndị agha so ya tụgharịrị bido igbu ndị agha obodo Ai.
When Joshua and all Israel saw that the ambush had taken the city, and that the smoke of the city went up, they turned again, and slew the men of Ai.
22 Ndị agha Izrel ahụ gara kpọọ obodo ahụ ọkụ pụtakwara, site nʼobodo ahụ, bido ịlụso ndị agha Ai ọgụ. Nke a mere ka ndị agha Ai nọdụ nʼetiti ụzọ ndị agha Izrel abụọ. Otu nʼihu ha, ndị nke ọzọ nʼazụ ha. Ya mere, ndị agha Izrel menyụrụ ha anya, gbuo ha, ruo na ọ dịkwaghị otu onye fọdụrụ nʼime ha, maọbụ onye gbapụrụ agbapụ.
And the others went out of the city against them; so they were in the midst of Israel, some on this side, and some on that side; and they smote them, until they let none of them escape or flee away.
23 Naanị eze Ai ka e jidere na ndụ. A kpọtakwara ya bịaruo nʼebe Joshua nọ.
And the king of Ai they took alive, and brought him to Joshua.
24 Mgbe ndị agha Izrel gbusịrị ndị agha Ai niile nọ nʼọhịa na nʼọzara, ha lọghachiri azụ gbuo ndị niile fọdụrụ nʼime obodo ahụ.
And it came to pass when Israel had ended slaying all the inhabitants of Ai in the field, in the wilderness wherein they had chased them, and they had all fallen by the edge of the sword, until they were consumed, that all Israel returned to Ai, and smote it with the edge of the sword.
25 Ndị niile e gburu nʼụbọchị ahụ, ma nwoke ma nwanyị dị puku iri na abụọ. Ọ bụkwa ndị niile nọ nʼobodo ahụ ka e gburu.
And so it was, that all who fell that day, men as well as women, were twelve thousand, all the people of Ai.
26 Nʼihi na Joshua nọgidere setịpụ ùbe o ji nʼaka ya, megide obodo Ai, tutu e bibie ndị niile nọ nʼobodo ahụ kpamkpam.
And Joshua did not draw back his hand, which he had stretched out with the javelin, until they had utterly destroyed all the inhabitants of Ai.
27 Ma ndị Izrel kwaara anụ ụlọ, na ihe nkwata nʼagha nke obodo ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị nyere Joshua nʼiwu si dị.
Only, the cattle and the spoil of the city Israel took as prey to themselves, according to the word of Jehovah which he had commanded Joshua.
28 Ya mere, Joshua kpọrọ obodo Ai ọkụ, mee ya ka ọ ghọọ mkpọmkpọ ebe nke tọgbọrọ nʼefu ruo taa.
And Joshua burned Ai, and made it an everlasting heap of desolation to this day.
29 Ma Joshua kwụbara eze ndị Ai nʼelu osisi site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Mgbe anyanwụ dara, Joshua nyere iwu ka e wedata ozu eze Ai site nʼosisi ahụ, tụsa ya nʼihu ọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, ha tụkọtara ọtụtụ nkume nʼelu ya. Nkume ahụ ha tụkọtara dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
And the king of Ai he hanged on a tree until the evening; and at the going down of the sun Joshua commanded, and they took his carcase down from the tree, and threw it down at the entrance of the gate of the city, and raised upon it a great heap of stones, [which remains] to this day.
30 Mgbe ahụ, Joshua wuuru Onyenwe anyị, Chineke Izrel ebe ịchụ aja nʼelu ugwu Ebal,
Then Joshua built an altar to Jehovah the God of Israel, in mount Ebal,
31 dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ndị Izrel nʼiwu. O wuru ya dịka ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis si dị, ebe ịchụ aja a na-ejighị nkume a wara awa wuo, nkume a na-ejighị ngwa ọrụ igwe waa. Nʼelu ebe ịchụ aja a ka ha chụụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ na aja udo.
as Moses the servant of Jehovah had commanded the children of Israel, as it is written in the book of the law of Moses, an altar of whole stones, over which iron had not been lifted up. And they offered up burnt-offerings on it to Jehovah, and sacrificed peace-offerings.
32 Ma mgbe ndị Izrel nọ na-ele anya, Joshua depụtara iwu ndị ahụ Mosis nyere ha nʼelu nkume.
And he wrote there on the stones a copy of the law of Moses, which he had written before the children of Israel.
33 Izrel niile, ha na ndị okenye ha, na ndị ọchịagha ha, na ndị ikpe ha, guzo nʼakụkụ abụọ nke igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na ncherita ihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị ndị na-ebu ya. Ma ndị ọbịa bi nʼetiti ha, ma ndị amụrụ nʼala ahụ nọ nʼebe ahụ. Ọkara nʼime ha gara guzo nʼakụkụ ugwu Gerizim, ọkara ndị ọzọ guzoro nʼakụkụ ugwu Ebal, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere nʼiwu na mbụ, na ha ga-agọzi ndị Izrel.
And all Israel, and their elders, and their officers and judges, stood on this side and on that side of the ark before the priests the Levites, who bore the ark of the covenant of Jehovah, as well the stranger as the home-born [Israelite]; half of them toward mount Gerizim, and the other half of them toward mount Ebal; as Moses the servant of Jehovah had commanded, that they should bless the people of Israel, in the beginning.
34 Emesịa, Joshua gụpụtara na ntị ha, okwu niile nke iwu ahụ, ya na ngọzị na ọbụbụ ọnụ so ya, dịka ihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu si dị.
And afterwards he read all the words of the law, the blessing and the curse, according to all that is written in the book of the law.
35 Iwu niile Mosis nyere ha ka Joshua gụpụtara na ntị ndị Izrel niile. Ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa niile bi nʼetiti ụmụ Izrel so nọkọọ nʼoge a ndị Izrel niile zukọrọ.
There was not a word of all that Moses had commanded which Joshua read not before the whole congregation of Israel, and the women, and the children, and the strangers that lived among them.

< Joshua 8 >