< Joshua 7 >

1 Ma ụmụ Izrel ekwesighị ntụkwasị obi nʼihe gbasara ihe ndị ahụ e debere iche nye Onyenwe anyị. Nʼihi na Ekan nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera, onye si nʼebo Juda gara were ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị nke ukwuu megide ụmụ Izrel.
Amma Isra’ilawa ba su yi aminci game da kayan da aka hallaka ba; Akan ɗan Karmi, ɗan Zabdi, ɗan Zera, na kabilan Yahuda ya kwashi waɗansu abubuwa, saboda haka fushin Ubangiji ya sauka a kan Isra’ilawa.
2 Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.
Sai Yoshuwa ya aika mutane daga Yeriko zuwa Ai kusa da Bet-Awen gabas da Betel, ya ce musu, “Ku je ku leƙo ku ga yadda yankin yake.” Sai mutanen suka je suka leƙo asirin ƙasar Ai.
3 Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”
Da suka dawo wurin Yoshuwa suka ce, “Ba lalle dukan jama’a su je yaƙi da Ai ba, ka aika mutum dubu biyu ko dubu uku su je su ciwo ƙasar da yaƙi, ba sai ka dami mutane duka ba, gama mutanen wurin kaɗan ne.”
4 Nʼihi nke a, ihe dịka puku ndị agha atọ ka e zigara imeri obodo Ai. Ma ngwangwa, ndị agha obodo Ai meriri ndị agha ụmụ Izrel, chụọ ha ọsọ.
Saboda haka sai kimanin mutum duba uku suka haura; amma mutanen Ai suka fatattake su,
5 Ihe dịka iri mmadụ atọ na isii nʼetiti ndị agha Izrel ka e gburu nʼagha ahụ. Ndị Ai chụrụ ha ọsọ site nʼụzọ ama obodo ruo nʼebe a na-awa nkume, gbuo ha na mgbada ugwu ahụ. Nʼihi nke a, ndị agha Izrel dara mba, obi lọkwara ha mmiri.
suka kashe Isra’ilawa wajen mutum talatin da shida, suka fafari Isra’ilawa tun daga bakin ƙofar birnin har zuwa wurin da ake fasa duwatsu. Suka karkashe su a gangare. Wannan ya sa zuciyar Isra’ilawa ta narke suka zama kamar ruwa.
6 Mgbe ahụ, Joshua na ndị okenye Izrel sitere nʼobi mwute dọwaa uwe ha, daa nʼala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha wekwara ntụ wụkwasị onwe ha nʼisi igosi obi mwute ha.
Sai Yoshuwa ya yaga tufafinsa ya fāɗi rubda ciki a gaban akwatin alkawarin Ubangiji, yana can har yamma. Dattawan Isra’ila ma suka yi haka, suka zuba toka a kawunansu.
7 Mgbe ahụ kwa, Joshua sịrị, “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị! Nʼihi gịnị ka i ji mee ka ndị a gabiga osimiri Jọdan, inyefe anyị nʼaka ndị Amọrait, ime ka ha tigbuo anyị? Ọ gaara adị anyị mma nke ọma ma ọ bụrụ na anyị nọdụrụ nʼofe ọzọ nke Jọdan.
Yoshuwa kuma ya ce, “Ya Ubangiji Mai Iko Duka, me ya sa ka sa mutanen nan suka ƙetare Urdun don ka bari mu shiga hannun Amoriyawa su hallaka mu? Kila da mun haƙura mun zauna a ɗaya gefen Urdun da ya fi mana!
8 Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?
Ya Ubangiji me zan ce, yanzu da abokan gāban Isra’ilawa suka ci ƙarfinsu?
9 Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?”
Yanzu Kan’aniyawa da sauran jama’a za su ji, za su zo su kewaye mu su share sunanmu daga duniya. To, yanzu me za ka yi don girman sunanka?”
10 Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?
Ubangiji ya ce wa Yoshuwa, “Ka tashi! Me kake yi kwance rubda ciki?
11 Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye Onyenwe anyị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha.
Isra’ilawa sun yi zunubi, sun karya sharaɗin da na yi musu. Sun ɗauki waɗansu abubuwan da aka keɓe; sun yi sata, sun yi ƙarya, sun ɓoye su cikin kayansu.
12 Ọ bụ nʼihi nke a mere na ụmụ Izrel enwekwaghị ike iguzo nʼihu ndị iro ha. Ọ bụkwa nke a mere ha ji tụgharịa gbaa ọsọ, nʼihi na ha aghọọla ndị kwesiri ka e bibie. Ya mere, agaghị m anọnyere unu ọzọ, tutu ruo mgbe unu wezugara ma mebie site nʼetiti onwe unu, ihe ọbụla e debere iche maka mbibi.
Shi ne ya sa Isra’ilawa suka kāsa yin tsayayya da abokan gābansu; suka juya suka gudu domin za a hallaka su. Ba zan sāke kasancewa tare da ku ba sai in kun hallaka duk abin da aka keɓe don hallaka.
13 “Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’
“Tashi, ka je ka tsarkake mutane. Ka ce musu su tsarkake kansu, su yi shiri domin gobe; gama ga abin da Ubangiji, Allah na Isra’ila ya ce, a cikinku akwai abubuwan da aka keɓe, ya Isra’ilawa. Ba za ku iya yin tsayayya da abokan gābanku ba sai in kun rabu da abubuwan nan da aka haramta.
14 “‘Nʼụtụtụ echi, unu ga-apụta nʼebo nʼebo. Ebo ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta nʼikwu nʼikwu, ikwu ọbụla Onyenwe anyị họpụtara ga-apụta bịa nʼezinaụlọ nʼezinaụlọ, ụlọ ọbụla nke Onyenwe anyị họọrọ, ndị ikom ya ga-apụta nʼotu nʼotu.
“‘Da safe ku zo kabila-kabila. Kabilar da Ubangiji ya ware, za tă zo gaba gida-gida; gidan da Ubangiji ya ware, za su zo gaba iyali-iyali. Iyalin kuma da Ubangiji ya ware, za su zo gaba mutum bayan mutum.
15 Ma onye ọbụla e jidere ji ihe ndị ahụ e doro nsọ ka a ga-akpọ ọkụ, ya onwe ya, na ihe niile ọ nwere, nʼihi o mebiela iwu ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, meekwa ihe jọgburu onwe ya na njọ nʼIzrel.’”
Mutumin da aka same shi da haramtattun abubuwan kuwa za a ƙone shi, duk da mallakarsa domin ya karya sharaɗin da Ubangiji ya yi muku, ya yi abin kunya a Isra’ila!’”
16 Nʼihi nke a, Joshua biliri nʼisi ụtụtụ. O mere ka ebo niile dị nʼIzrel bịaruo nso nʼebo nʼebo, ebo Juda ka a họọrọ.
Kashegari da sassafe Yoshuwa ya sa Isra’ilawa suka fito kabila-kabila, aka ware kabilar Yahuda.
17 Mgbe ahụ, e mere ka ikwu niile dị nʼebo Juda bịaruo nso, ikwu Zera ka ahọpụtara. Mgbe e mere ka ikwu Zera pụta nʼezinaụlọ ha niile nʼotu nʼotu, ezinaụlọ Zimri bụ nke ahọpụtara.
Gidan Yahuda suka zo gaba, sai aka ware gidan Zera, aka sa suka fito iyali-iyali, sai aka ware Zabdi.
18 Joshua mere ka ndị ikom niile dị nʼezinaụlọ Zimri pụta nʼotu nʼotu, ma e jidere Ekan, nwa Kami, nwa Zimri, nwa Zera onye ebo Juda.
Yoshuwa kuwa ya sa iyalin Zabdi suka fito mutum-mutum, sai kuwa aka ware Akan ɗan Karmi, ɗan Zimri, ɗan Zera na kabilar Yahuda.
19 Mgbe ahụ, Joshua sịrị Ekan, “Nwa m, nye Onyenwe anyị, Chineke Izrel otuto, nyekwa ya nsọpụrụ. Gwa m ihe i mere. Ezonarịkwala m ihe ọjọọ i mere.”
Sai Yoshuwa ya ce wa Akan, “Ɗana, sai ka ba Ubangiji, Allah na Isra’ila ɗaukaka, ka yi masa yabo. Ka gaya mini abin da ka yi; kada ka ɓoye mini.”
20 Mgbe ahụ, Ekan zara Joshua sị ya, “Ọ bụ eziokwu! Emehiela m megide Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Lee ihe m mere.
Akan kuwa ya amsa ya ce, “Gaskiya ne! Na yi wa Ubangiji, Allah na Isra’ila zunubi. Ga abin da na yi.
21 Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.”
A cikin ganimar, na ga doguwar riga mai kyau irin ta Babilon, da shekel ɗari biyu na azurfa, da kuma sandan zinariya mai nauyin shekel hamsin, sai raina ya so su, na kuwa kwashe su. Na tona rami a cikin ƙasa a tentina; na ɓoye.”
22 Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ.
Sai Yoshuwa ya aiki’yan aika suka tafi da gudu zuwa tenti ɗin, haka kuwa suka same su a ɓoye a tentinsa, da azurfa a ƙarƙashi.
23 Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.
Suka kwashe kayan daga tenti ɗin suka kawo wa Yoshuwa da sauran Isra’ilawa, suka baza su a gaban Ubangiji.
24 Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.
Sai Yoshuwa da dukan Isra’ilawa suka ɗauki Akan ɗan Zera, da azurfar, doguwar rigar, sandan zinariya,’ya’yansa maza da mata, shanunsa, jakuna da tumaki, tentinsa da duk abin da yake da shi, suka kai su Kwarin Akor.
25 Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.
Yoshuwa ya ce, “Me ya sa ka jawo mana wahala haka? Ubangiji zai kawo maka wahala kai ma a yau.” Sai dukan Isra’ilawa suka jajjefe shi, bayan da suka gama jifarsa sai suka ƙone sauran.
26 Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.
Suka tara manyan duwatsu a kan Akan, tarin duwatsun na nan a can har wa yau. Sa’an nan Ubangiji ya huce daga fushinsa mai zafi. Saboda haka ake kiran wurin Kwarin Akor.

< Joshua 7 >