< Joshua 6 >
1 Ma e mechiri ọnụ ụzọ e si abata Jeriko nke ọma, nʼihi ụmụ Izrel. Ọ dịghị onye ọbụla na-apụ nʼezi, ọ dịghịkwa onye na-abata nʼime ya.
Wàyí o, a ti há Jeriko mọ́lé gágá nítorí àwọn ọmọ Israẹli, ẹnikẹ́ni kò jáde, ẹnikẹ́ni kò sì wọlé.
2 Ma Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Lee, enyefela m obodo a bụ Jeriko, ya na eze ya, na ndị dị ike ibu agha nọ nʼime ya, nʼaka gị.
Nígbà náà ni Olúwa wí fún Joṣua pé, “Wò ó, mo ti fi Jeriko lé ọ lọ́wọ́ pẹ̀lú ọba rẹ̀ àti àwọn jagunjagun rẹ̀.
3 Gị na ndị agha gị zọọnụ ije gburugburu obodo a. Unu ga-ejegharị gburugburu mgbidi obodo a otu ugbo nʼụbọchị. Unu ga-esi otu a jegharịa ụbọchị isii.
Ẹ wọ́de ogun yí ìlú náà ká lẹ́ẹ̀kan pẹ̀lú gbogbo àwọn jagunjagun. Ẹ ṣe èyí fún ọjọ́ mẹ́fà.
4 Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha.
Jẹ́ kí àwọn àlùfáà méje gbé fèrè ìwo àgbò ní iwájú àpótí ẹ̀rí. Ní ọjọ́ keje, ẹ wọ́de ogun yí ìlú náà ká ní ìgbà méje, pẹ̀lú àwọn àlùfáà tí ń fọn fèrè.
5 Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.”
Nígbà tí ẹ bá gbọ́ ohùn fèrè náà, kí àwọn ènìyàn hó yèè ní igbe ńlá, nígbà náà ni odi ìlú náà yóò sì wó lulẹ̀, àwọn ènìyàn yóò sì lọ sí òkè, olúkúlùkù yóò sì wọ inú rẹ̀ lọ tààrà.”
6 Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.”
Bẹ́ẹ̀ ni Joṣua ọmọ Nuni pe àwọn àlùfáà ó sì wí fún wọn pé, “Ẹ gbé àpótí ẹ̀rí Olúwa náà kí àwọn àlùfáà méje tí ó ru fèrè ìwo wà ní iwájú u rẹ̀.”
7 Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.”
Ó sì pàṣẹ fún àwọn ènìyàn náà pé, “Ẹ lọ, kí ẹ sì yí ìlú náà ká pẹ̀lú àwọn olùṣọ́ tí ó hámọ́ra kọjá ní iwájú àpótí ẹ̀rí Olúwa.”
8 Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu Onyenwe anyị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị sochiri ha azụ.
Nígbà tí Joṣua ti bá àwọn ènìyàn sọ̀rọ̀ tán, àwọn àlùfáà méje tí wọ́n gbé fèrè méje ní iwájú Olúwa kọjá sí iwájú, wọ́n sì fọn fèrè wọn, àpótí ẹ̀rí Olúwa sì tẹ̀lé wọn.
9 Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a.
Àwọn olùṣọ tí ó hámọ́ra sì lọ níwájú àwọn àlùfáà tí ń fọn fèrè, olùṣọ́ ẹ̀yìn sì tẹ̀lé àpótí ẹ̀rí náà. Ní gbogbo àsìkò yìí fèrè sì ń dún.
10 Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.”
Ṣùgbọ́n Joṣua tí pàṣẹ fún àwọn ènìyàn pé, “Ẹ kò gbọdọ̀ kígbe ogun, ẹ kò gbọdọ̀ gbé ohùn yín sókè, ẹ má ṣe sọ ọ̀rọ̀ kan títí ọjọ́ tí èmi yóò sọ fún un yín pé kí ẹ hó. Nígbà náà ni ẹ̀yin yóò sì hó!”
11 Ya mere, e buuru igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ jegharịa obodo ahụ gburugburu otu ugboro nʼụbọchị ahụ. Mgbe ha mesịrị nke a, onye ọbụla laghachiri nʼebe ụlọ ikwu ya dị rahụ ụra abalị.
Bẹ́ẹ̀ ni ó mú kí àpótí ẹ̀rí Olúwa yí ìlú náà ká, ó sì yí i ká lẹ́ẹ̀kan. Nígbà náà ni àwọn ènìyàn náà padà sí ibùdó, wọ́n sì gbé ibẹ̀ fún alẹ́ náà.
12 Joshua biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị nchụaja bulikwara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
Joṣua sì dìde ní kùtùkùtù òwúrọ̀ ọjọ́ kejì, àwọn àlùfáà sì gbé àpótí ẹ̀rí Olúwa.
13 Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka.
Àwọn àlùfáà méje tí ó gbé ìpè ìwo àgbò méje ń lọ níwájú àpótí ẹ̀rí Olúwa, wọ́n sì ń fọ́n àwọn ìpè: àwọn tí ó hámọ́ra ogun ń lọ níwájú u wọn; àwọn ọmọ tó wà lẹ́yìn sì ń tọ àpótí ẹ̀rí Olúwa lẹ́yìn, àwọn àlùfáà sì ń fọn ìpè bí wọ́n ti ń lọ.
14 Nʼụbọchị nke abụọ, ha gbara obodo ahụ gburugburu otu ugboro, laghachikwa nʼụlọ ikwu ha. Otu a ka ha mere ruo nʼụbọchị nke isii.
Ní ọjọ́ kejì, wọ́n yí ìlú náà ká lẹ́ẹ̀kan wọ́n sì padà sí ibùdó. Wọ́n sì ṣe èyí fún ọjọ́ mẹ́fà.
15 Ma nʼisi ụtụtụ ụbọchị nke asaa, ha bilitere mgbe chi na-abọbeghị, gbaa obodo ahụ gburugburu ugboro asaa dịka ha na-eme. Ma ọ dị iche nʼụbọchị ahụ, bụ naanị na ha gbara obodo ahụ gburugburu ugboro asaa.
Ní ọjọ́ keje, wọ́n dìde ní kùtùkùtù òwúrọ̀ ní àfẹ̀mọ́júmọ́, wọ́n sì wọ́de ogun yí ìlú náà ká ní ìgbà méje, gẹ́gẹ́ bí i ti ìṣáájú, ní ọjọ́ keje nìkan ṣoṣo ni wọ́n wọ́de ogun yí ìlú náà ká nígbà méje.
16 O ruo, nʼoge njegharị nke ugboro asaa ahụ, mgbe ndị nchụaja asaa ndị a fụsiri opi ike asaa ndị ahụ ike karịa, ka Joshua gwara ndị Izrel sị ha, “Tienụ mkpu! Nʼihi na Onyenwe anyị enyela unu obodo a!
Ní ìgbà keje, nígbà tí àwọn àlùfáà fọn fèrè, Joṣua pàṣẹ fún àwọn ènìyàn pé, “Ẹ hó! Nítorí pé Olúwa ti fún un yín ní ìlú náà.
17 Gbuonụ ihe niile na-eku ume ndụ, nʼihi na obodo a na ihe niile dị nʼime ha bụ ihe e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ma ọ bụ naanị Rehab, nwanyị akwụna ahụ ka unu ga-ahapụ ndụ, ya na ndị ọbụla nọ nʼụlọ ya. Nʼihi na o zoro ndị anyị zigara inyochapụta obodo ahụ.
Ìlú náà àti gbogbo ohun tí ó wà níbẹ̀ ni yóò jẹ́ ìyàsọ́tọ̀ fún Olúwa. Rahabu tí ó jẹ́ panṣágà nìkan àti gbogbo àwọn tí ó wà pẹ̀lú u rẹ̀ ni a ó dá sí; nítorí tí ó pa àwọn ayọ́lẹ̀wò tí á rán mọ́.
18 Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile.
Ẹ pa ara yín mọ́ kúrò nínú ohun ìyàsọ́tọ̀ fún ìparun, kí ẹ̀yin kí ó má ba à ṣojú kòkòrò nípa mímú nínú àwọn ohun ìyàsọ́tọ̀. Bí kò ṣe bẹ́ẹ̀ ẹ ó sọ ibùdó Israẹli di ìparun. Kí ẹ sì mú wàhálà wá sórí i rẹ̀.
19 Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye Onyenwe anyị. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ Onyenwe anyị.”
Gbogbo fàdákà àti wúrà àti ohun èlò idẹ àti irin jẹ́ mímọ́ fún Olúwa, wọ́n yóò wá sínú ìṣúra Olúwa.”
20 Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.
Nígbà tí àwọn àlùfáà fọn ìpè, àwọn ènìyàn náà sì hó. Ó sì ṣe, bí àwọn ènìyàn ti gbọ́ ìró ìpè, tí àwọn ènìyàn sì hó ìhó ńlá, odi ìlú náà wó lulẹ̀ bẹẹrẹ; bẹ́ẹ̀ ni olúkúlùkù ya wọ inú ìlú náà lọ tààrà, wọ́n sì kó ìlú náà.
21 Ha debere obodo a iche nye Onyenwe anyị site nʼiji mma agha ha gbuchapụ ihe niile dị ndụ nʼobodo ahụ, ma nwoke, ma nwanyị, ma nwantakịrị, ma okenye, ma ehi, ma atụrụ, ma ịnyịnya ibu, ihe niile dị nʼime ya.
Wọ́n ya ìlú náà sọ́tọ̀ fún Olúwa àti fún ìparun, wọ́n sì fi idà run gbogbo ohun alààyè ní ìlú náà—ọkùnrin àti obìnrin, ọ́mọdé, àti àgbà, màlúù, àgùntàn àti kẹ́tẹ́kẹ́tẹ́.
22 Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.”
Joṣua sì sọ fún àwọn ọkùnrin méjì tí wọ́n ti wá ṣe ayọ́lẹ̀wò ilẹ̀ náà pé, “Ẹ lọ sí ilé panṣágà nì, kí ẹ sì mu jáde àti gbogbo ohun tí í ṣe tirẹ̀ gẹ́gẹ́ bí ẹ tí búra fún un.”
23 Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel.
Bẹ́ẹ̀ ní àwọn ọ̀dọ́mọkùnrin tí ó lọ ṣe ayọ́lẹ̀wò wọlé lọ, wọ́n sì mú Rahabu jáde, baba rẹ̀, ìyá rẹ̀, àwọn arákùnrin rẹ̀ àti ohun gbogbo tí ó ní. Wọ́n sì mú gbogbo ìdílé rẹ̀ jáde, wọ́n sì fi wọ́n sí ibìkan ní ìta ibùdó àwọn ará Israẹli.
24 Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ Onyenwe anyị.
Nígbà náà ni wọ́n sun gbogbo ìlú náà àti gbogbo ohun tí ó wà nínú u rẹ̀, ṣùgbọ́n wọ́n fi fàdákà, wúrà ohun èlò idẹ àti irin sínú ìṣúra ilé Olúwa.
25 Joshua mere ka Rehab, nwanyị akwụna ahụ, na ndị ezinaụlọ ya niile dịrị ndụ. Nʼihi na Rehab zoro ndị ikom abụọ Joshua zigara, mee ka ha dị ndụ, bụ ndị gara inyochapụta obodo Jeriko. Ya mere, o binyere ndị Izrel ruo taa.
Ṣùgbọ́n Joṣua dá Rahabu panṣágà pẹ̀lú gbogbo ìdílé e rẹ̀ àti gbogbo ẹni tí í ṣe tirẹ̀ sí nítorí pé, ó pa àwọn ọkùnrin tí Joṣua rán gẹ́gẹ́ bí ayọ́lẹ̀wò sí Jeriko mọ́. Ó sì ń gbé láàrín ará Israẹli títí di òní yìí.
26 Mgbe ahụ, Joshua gbara obodo Jeriko iyi sị, “Ọbụbụ ọnụ ka a na-abụ nwoke ọbụla nʼihu Onyenwe anyị nke ga-ebili wuokwa obodo Jeriko ọzọ. “Ndụ ọkpara ya ka ọ ga-eji tọọ ntọala ya niile, ndụ nwa ya nke nta, ka ọ ga-eji guzobe ọnụ ụzọ ama ya niile ọtọ.”
Ní àkókò náà Joṣua sì búra pé, “Ègún ni fún ẹni náà níwájú Olúwa tí yóò dìde, tí yóò sì tún ìlú Jeriko kọ́: “Pẹ̀lú ikú àkọ́bí ọmọ rẹ̀ ni yóò fi pilẹ̀ rẹ̀; ikú àbíkẹ́yìn rẹ̀ ní yóò fi gbé ìlẹ̀kùn bodè rẹ̀ ró.”
27 Ya mere, Onyenwe anyị nọnyeere Joshua. Akụkọ a kọrọ banyere ya gbasara nke ukwuu nʼala ahụ niile.
Bẹ́ẹ̀ ni Olúwa wà pẹ̀lú Joṣua; òkìkí rẹ̀ sì kàn ká gbogbo ilẹ̀ náà.