< Joshua 4 >
1 Mgbe mba ahụ niile gafesịrị osimiri Jọdan, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
Watu wote walipokwisha kuvuka Yordani, Yahweh akamwambia Yoshua,
2 “Site nʼetiti ndị ụmụ Izrel họpụta ndị ikom iri na abụọ, otu onye site nʼebo ọbụla,
“Chagueni wenyewe watu waume kumi na wawili, mmoja katika kila kabila.
3 ka onye ọbụla nʼime ha site nʼebe ahụ ndị nchụaja guzoro nʼetiti osimiri Jọdan buputa otu nkume, otu nkume, gwa ha ka ha debe nkume ndị a ha buputara nʼebe unu ga-anọ ọnọdụ abalị taa.”
Wape agizo hilo: 'Chukueni mawe kumi na mbili kutoka katikati ya Yordani mahali wanaposimama makuhani katika nchi kavu, na wayalete na kuyaweka chini katika sehemu ambapo mtalala usiku wa leo.
4 Ya mere, Joshua kpọrọ ndị ikom iri na abụọ ndị ahụ, ndị ọ họpụtara, site nʼetiti ndị Izrel, otu onye site nʼebo ọbụla,
Kisha Yoshua akawaita wanaume kumi na wawili ambao aliwachagua kutoka katika makabila ya Israeli, mmoja kutoka kila kabila.
5 Ọ gwara ha sị, “Sitenụ nʼetiti osimiri Jọdan, ebe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu guzoro, buputa nkume. Onye ọbụla nʼime unu ga-ebuputa otu nkume, tụkwasị nʼubu ya, dịka ọnụọgụgụ ebo Izrel niile si dị,
Yoshua akawaambia, “Nendeni mbele za sanduku la Yahweh Mungu wenu katikati ya Yordani. Kila mmoja wenu achukue jiwe moja mabegani mwake, kulingana na hesabu ya makabila ya watu wa Israeli.
6 ka ha bụrụ ihe ịrịbama nʼetiti unu. Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị bụ isi ogidi nkume a dị nʼebe a?’
Hii itakuwa ni ishara miongoni mwenu kwa ajili yenu wakati watoto wenu watakapowauliza katika siku zijazo, 'Nini maana ya mawe haya kwenu?'
7 Unu ga-asịkwa ha, ‘Ọ bụ ihe na-echetara anyị otu osimiri Jọdan si kwụsị ịsọ, mgbe ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị zọnyere ụkwụ ha nʼosimiri ahụ.’ Nkume a ga-abụkwara ụmụ Izrel niile ihe ncheta ruo mgbe ebighị ebi.”
Ndipo mtakapowaambia, 'Maji ya Yordani yalitengwa mbele ya sanduku la Yahweh. Lililpopitishwa katika Yordani, maji ya Yordani yalisimamishwa. Hivyo, mawe haya yatakuwa kumbukumbu kwa watu wa Israeli milele.'”
8 Ụmụ Izrel mere dịka Joshua gwara ha. Ha buputara nkume iri na abụọ site nʼetiti osimiri Jọdan, dịka Onyenwe anyị si nye Joshua nʼiwu sị na otu onye, nʼebo Izrel ọbụla, ga-ebuputa otu nkume. Ha buuru nkume iri na abụọ ndị ahụ gaa nʼebe ha nọrọ ọnọdụ abalị, debe ha nʼebe ahụ.
Watu waisraeli walifanya kama Yoshua alivyowaagiza, na walichukua mawe kumi na mbili kutoka katikati ya Yordani, kama Yahweh alivyomwambia Yoshua, walipangwa sawa sawa na hesabu ya makabila ya watu wa Israeli. Waliyachukua mawe mpaka mahali walipolala na wakayaweka chini huko.
9 Joshua nʼonwe ya kwa ji nkume iri na abụọ ahụ nke si nʼetiti osimiri Jọdan wuo ogidi ịrịbama, nʼebe ahụ ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ guzoro. Ha dịkwa nʼebe ahụ ruo taa.
Kisha Yoshua akayapanga mawe kumi na mbili katikati ya Yordani, katika sehemu ambapo ilisimama miguu ya makuhani waliolichukua sanduku la agano. Na kumbukumbu hiyo ipo hadi leo.
10 Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan.
Makuhani waliolichukua sanduku walisimama katikati ya Yordani mpaka pale kila kitu ambacho Yahweh alimwamuru Yoshua kuwaambia watu kilipokamilika, sawa sawa na yote ambayo Musa alimwagiza Yoshua. Watu walifanya haraka na wakavuka.
11 Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.
Wakati watu wote walipokwisha kuvuka, sanduku la Yahweh pamoja na makuhani walivuka mbele za watu.
12 Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.
Kabila la Rubeni, kabila la Gadi, na nusu ya kabila la Manase walipita kama jeshi mbele ya watu wa Israeli, kama ambavyo Musa alivyowaambia.
13 Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ, ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.
Yapata watu watu elfu arobaini walioandaliwa kwa vita walipita mbele za Yahweh, kwa ajili ya vita katika uwanda wa Yeriko.
14 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.
Katika siku hiyo Yahweh alimfanya Yoshua kuwa mkuu katika macho ya watu wote wa Israeli. Walimheshimu - kama walivyomheshimu Musa - siku zake zote.
15 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị,
Kisha Yahweh akamwambia Yoshua,
16 “Nye ndị nchụaja, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ iwu ka ha si nʼosimiri Jọdan pụta.”
“Waamuru makuhani wanaolibeba sanduku la ushuhuda watoke katika Yordani.”
17 Ya mere Joshua nyere ndị nchụaja iwu sị ha, “Sitenụ nʼosimiri Jọdan pụta.”
Hivyo Yoshua akawaamuru makuhani, '' pandeni mtoke Yordani.”
18 Mgbe ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ si nʼosimiri Jọdan rịpụta, dịka ọbụ ụkwụ ha na-emetụ nʼala akọrọ, mmiri osimiri ahụ sọghachiri nʼọnọdụ ya ruchie akụkụ ya niile, ka ọ dị na mbụ.
Wakati makuhani wenye kulibeba sanduku la agano la Yahweh walitoka katikati ya Yordani, na nyayo za miguu yao ilikuwa imeinuliwa katika nchi kavu, kisha maji ya Yordani yalirudi katika sehemu zake na kujaa hadi katika kingo zake kama ilivyokuwa siku nne zilizopita.
19 Ihe ịrịbama a mere nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke mbụ. Nʼụbọchị ahụ ka ndị Izrel niile gafere osimiri Jọdan, gaa maa ụlọ ikwu ha na Gilgal, ebe dị nʼọwụwa anyanwụ obodo Jeriko.
Katika siku ya kumi ya mwezi wa kwanza, watu walikwea kutoka Yordani. Wakakaa huko Gilgali, mashariki mwa Yeriko.
20 Nkume iri na abụọ ahụ ha si nʼosimiri Jọdan buputa, ka Joshua guzobere na Gilgal.
Mawe kumi na mawili ambayo yalichukuliwa katika Yordani, Yoshuua aliyasimamisha hapo Gilgali.
21 Ọ sịrị ndị Izrel, “Nʼoge dị nʼihu, mgbe ụmụ unu ga-ajụ ndị bụ nna ha ajụjụ sị, ‘Gịnị ka nkume ndị a pụtara, Gịnịkwa ka ha na-egosi?’
Aliwaambia watu wa Israeli, “wakati watoto wenu watakapowauliza baba zao katika wakai ujao, 'Mawe haya ni ya nini?'
22 Gwa ha, ‘Izrel gafere osimiri Jọdan nʼala akọrọ.’
Waambieni watoto wenu, 'Hapa ndipo Waisraeli walivuka Yordani katika nchi kavu.
23 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu mere ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu unu tutu ruo mgbe unu gafesịrị nʼofe nke ọzọ. Onyenwe anyị Chineke unu mere osimiri Jọdan ihe o mere osimiri Uhie mgbe o mere ka osimiri Uhie takpọọ nʼihu anyị, tutu ruo mgbe anyị gafesịrị nʼofe ya nke ọzọ.
Yahweh Mungu wenu aliyakausha maji ya Yordani, mpaka hapo Yahweh Mungu wako aliyoyafanya katika bahari ya mianzi, ambayo aliikausha kwa ajili yetu ili tupite juu yakes,
24 O mere ihe ndị a niile ka ndị niile bi nʼelu ụwa mata na aka Onyenwe anyị dị ike. O mekwara ya ka unu onwe unu tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke unu, mgbe niile.”
ili kwamba watu wote wa nchi wajue kwamba mkono wa Yahweh ni nguvu, na kwamba mtamweshimu Yahweh Mungu wenu milele.''