< Joshua 3 >

1 Nʼisi ụtụtụ, Joshua na ụmụ Izrel niile hapụrụ Shitim bịaruo nʼakụkụ osimiri Jọdan, maa ụlọ ikwu nʼebe ahụ. Nʼebe a ka ha nọ chere tutu ruo mgbe ha ga-agafe.
И уста Исус ујутру рано, и кретоше се од Ситима и дођоше до Јордана он и сви синови Израиљеви, и ноћише онде а не пређоше.
2 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ndịisi ụmụ Izrel gabigara jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ahụ,
А после три дана прођоше управитељи кроз логор,
3 nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.
И заповедише народу говорећи: Кад видите ковчег завета Господа Бога свог и свештенике Левите где га носе, пођите и ви с места свог и идите за њим.
4 Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”
Али нека буде даљине између вас и њега до две хиљаде лаката; ближе до њега не примичите се, да бисте познали пут којим ћете ићи, јер још никада нисте ишли тим путем.
5 Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”
И Исус рече народу: Освештајте се, јер ће сутра учинити Господ чудеса међу вама.
6 Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.
Потом рече Исус свештеницима говорећи: Узмите ковчег заветни и идите пред народом. И узеше ковчег заветни и пођоше пред народом.
7 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.
А Господ рече Исусу: Данас те почињем узвишавати пред свим Израиљем да познају да ћу и с тобом бити као што сам био с Мојсијем.
8 Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’”
Зато ти заповеди свештеницима који носе ковчег заветни, и реци: Кад дођете на крај воде Јордана, станите у Јордану.
9 Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu.
И рече Исус синовима Израиљевим: Приступите овамо, и чујте речи Господа Бога свог.
10 Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu.
По том рече Исус: По овом ћете познати да је Бог живи посред вас, и да ће заиста одагнати испред вас Хананеје и Хетеје и Јевеје и Ферезеје и Гергесеје и Јевусеје:
11 Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile ga-agabiga nʼihu unu banye nʼime Jọdan.
Ево, ковчег завета Господа свој земљи поћи ће пред вама преко Јордана.
12 Ugbu a sitenụ nʼebo Izrel niile họpụta ndị ikom iri na abụọ, site nʼebo ọbụla otu onye.
Зато сада изаберите дванаест људи из племена Израиљевих, по једног човека из сваког племена.
13 Ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Onyenwe ụwa niile zọnyere ụkwụ na Jọdan, mmiri Jọdan nke si nʼebe elu ya na-arịdata ga-akwụsị ịsọ, guzoro dịka mgbidi.”
И чим свештеници, носећи ковчег завета Господа Господа свој земљи, стану ногама својим у води јорданској, вода ће се у Јордану растворити, те ће вода која тече одозго стати у гомилу.
14 Ya mere, mgbe ndị Izrel sitere nʼụlọ ikwu ha bilie njem ịgabiga osimiri Jọdan, ndị nchụaja bụ igbe ọgbụgba ndụ buuru ha ụzọ na-aga ha nʼihu.
И кад се подиже народ из шатора својих да пређе преко Јордана, и свештеници понесоше ковчег заветни пред народом,
15 Nʼoge owuwe ihe ubi ọbụla, osimiri Jọdan na-etoju etoju, sọjukwaa akụkụ ya niile. Ma ngwangwa ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ a bịaruru nso zọnye ụkwụ ha nʼọnụ mmiri Jọdan,
И кад они што су носили ковчег дођоше до Јордана, и свештеници носећи ковчег оквасише ноге своје на крају воде (јер је Јордан пун преко брегова својих за све време жетве),
16 mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko.
Заустави се вода што је текла одозго, и стаде у једну гомилу врло надалеко, код града Адама, који је крај Заретана; а што је текло доле у море крај поља, море слано, отече сасвим; и народ прелажаше према Јерихону.
17 Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.
А свештеници који су носили ковчег завета Господњег стајаху на сувом усред Јордана без страха, а сав Израиљ иђаше по сувом, докле сав народ не пређе преко Јордана.

< Joshua 3 >