< Joshua 24 >

1 Joshua kpọkọtara ebo Izrel niile na Shekem. Ọ kpọrọ ndị okenye Izrel na ndịisi ha na ndị ikpe ha na ndị nlekọta ha. Ha niile bịara chee onwe ha nʼihu Chineke.
And Joshua gathered all the tribes of Israel to Shechem, and called for the elders of Israel, and for their heads, and for their judges, and for their officers; and they presented themselves before God.
2 Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe.
And Joshua said unto all the people: 'Thus saith the LORD, the God of Israel: Your fathers dwelt of old time beyond the River, even Terah, the father of Abraham, and the father of Nahor; and they served other gods.
3 Ma mụ onwe m kpọpụtara nna nna unu Ebraham site nʼala ahụ dị nʼofe osimiri dubata ya nʼala Kenan, nye ya ọtụtụ ụmụ ụmụ, site na nwa ya bụ Aịzik.
And I took your father Abraham from beyond the River, and led him throughout all the land of Canaan, and multiplied his seed, and gave him Isaac.
4 Ụmụ m nyere Aịzik bụ Jekọb na Ịsọ. Ịsọ ka m nyere ala ugwu ugwu Sia, ka o nweta ma Jekọb na ezinaụlọ ya gara nʼala Ijipt.
And I gave unto Isaac Jacob and Esau; and I gave unto Esau mount Seir, to possess it; and Jacob and his children went down into Egypt.
5 “‘Emesịa, ezigara m Mosis na Erọn, ma wetara ndị Ijipt ihe otiti ọjọọ niile dị iche iche site nʼihe m mere nʼebe ahụ. Nʼikpeazụ, akpọpụtara m ndị m site nʼala Ijipt.
And I sent Moses and Aaron, and I plagued Egypt, according to that which I did in the midst thereof; and afterward I brought you out.
6 Ma mgbe unu rutere nʼOsimiri Uhie, ndị agha Ijipt gbapụtara chịrị ụgbọ agha ha na ndị agha na-agba ịnyịnya ha chụwa unu ọsọ.
And I brought your fathers out of Egypt; and ye came unto the sea; and the Egyptians pursued after your fathers with chariots and with horsemen unto the Red Sea.
7 Mgbe ndị Izrel hụrụ ha, ha tiri mkpu kpọkuo Onyenwe anyị. O tinyere oke ọchịchịrị nʼetiti unu na ndị Ijipt. O mere ka oke osimiri kpuchie ha, mee ka ha mikpuo nʼosimiri ahụ. Unu niile hụkwara ihe m mere ndị Ijipt. Emesịa, unu bikwara nʼọzara ọtụtụ afọ.
And when they cried out unto the LORD, He put darkness between you and the Egyptians, and brought the sea upon them, and covered them; and your eyes saw what I did in Egypt; and ye dwelt in the wilderness many days.
8 “‘Ma emesịa, emere m ka unu bata nʼime ala ndị Amọrait, ndị bi nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ha lụsoro unu ọgụ, ma eweere m ha nyefee unu nʼaka. E bibiri m ha nʼihu unu, ma unu nwetara ala ha.
And I brought you into the land of the Amorites, that dwelt beyond the Jordan; and they fought with you; and I gave them into your hand, and ye possessed their land; and I destroyed them from before you.
9 Mgbe Balak nwa Zipoa, eze Moab, jikeere ibuso Izrel agha, o zigaara Belam, nwa Beoa ozi ka ọ bịa bụọ unu ọnụ.
Then Balak the son of Zippor, king of Moab, arose and fought against Israel; and he sent and called Balaam the son of Beor to curse you.
10 Ma egeghị m Belam ntị. Kama emere m ya ka ọ gọzie unu. Anapụtara m unu site nʼaka ya.
But I would not hearken unto Balaam; therefore he even blessed you; so I delivered you out of his hand.
11 “‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka.
And ye went over the Jordan, and came unto Jericho; and the men of Jericho fought against you, the Amorite, and the Perizzite, and the Canaanite, and the Hittite, and the Girgashite, the Hivite, and the Jebusite; and I delivered them into your hand.
12 E zigara m ebu nʼihu unu nke chụpụrụ ha nʼihu unu, bụ eze abụọ ndị Amọrait. Ọ bụghị mma agha na ụta unu ka unu ji mee nke a.
And I sent the hornet before you, which drove them out from before you, even the two kings of the Amorites; not with thy sword, nor with thy bow.
13 Ya mere enyere m unu ala ahụ, nke unu na-adọgbughị onwe unu nʼihi ya, nyekwa unu ọtụtụ obodo nke unu na-ewughị, bụ ala ndị a unu bi nʼime ya ugbu a. Enyere m unu ubi vaịnị na ubi oliv nke unu na-akụghị, nke unu na-eri mkpụrụ ha.’
And I gave you a land whereon thou hadst not laboured, and cities which ye built not, and ye dwell therein; of vineyards and olive-yards which ye planted not do ye eat.
14 “Ya mere ugbu a, tụọnụ egwu Onyenwe anyị, feekwanụ ya ofufe nʼụzọ ikwesi ntụkwasị obi na nʼeziokwu. Wezuganụ chi ndị ahụ niile nna nna unu ha fere ofufe nʼofe osimiri Yufretis ahụ, na nʼIjipt. Feenụ naanị Onyenwe anyị ofufe.
Now therefore fear the LORD, and serve Him in sincerity and in truth; and put away the gods which your fathers served beyond the River, and in Egypt; and serve ye the LORD.
15 Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.”
And if it seem evil unto you to serve the LORD, choose you this day whom ye will serve; whether the gods which your fathers served that were beyond the River, or the gods of the Amorites, in whose land ye dwell; but as for me and my house, we will serve the LORD.'
16 Ndị Izrel niile zara sị ya, “O nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ Onyenwe anyị fee chi ndị ọzọ!
And the people answered and said: 'Far be it from us that we should forsake the LORD, to serve other gods;
17 Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke anyị, ya onwe ya si nʼala Ijipt, ebe anyị bụ ndị ohu, kpọpụta anyị na nna anyị ha. Ọ rụrụ ọrụ ịrịbama ndị ahụ niile dị oke egwu nʼihu anyị. O chebere anyị nʼije anyị niile nʼetiti mba ndị ahụ niile anyị si nʼala ha gafee.
for the LORD our God, He it is that brought us and our fathers up out of the land of Egypt, from the house of bondage, and that did those great signs in our sight, and preserved us in all the way wherein we went, and among all the peoples through the midst of whom we passed;
18 Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”
and the LORD drove out from before us all the peoples, even the Amorites that dwelt in the land; therefore we also will serve the LORD; for He is our God.'
19 Joshua zaghachiri ndị Izrel sị, “Unu apụghị ife Onyenwe anyị ofufe; nʼihi na ọ bụ Chineke dị nsọ, bụrụkwa Chineke ekworo. Ọ gaghị agbaghara unu nnupu isi unu na mmehie unu niile.
And Joshua said unto the people: 'Ye cannot serve the LORD; for He is a holy God; He is a jealous God; He will not forgive your transgression nor your sins.
20 Ọ bụrụ na unu agbakụta Onyenwe anyị azụ, fee chi ala ọzọ ofufe, ọ ga-echigharị laa unu nʼiyi, nʼagbanyeghị na ọ nọnyerela unu ụbọchị ndị a niile.”
If ye forsake the LORD, and serve strange gods, then He will turn and do you evil, and consume you, after that He hath done you good.'
21 Ma ndị Izrel sịrị Joshua, “Mba, kama Onyenwe anyị ka anyị ga-efe ofufe.”
And the people said unto Joshua: 'Nay; but we will serve the LORD.'
22 Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Unu bụ ndị ama megide onwe unu na unu ahọrọla ife Onyenwe anyị ofufe.” Ha zara sị, “E, anyị bụ ndị akaebe.”
And Joshua said unto the people: 'Ye are witnesses against yourselves that ye have chosen you the LORD, to serve Him. — And they said: 'We are witnesses.' —
23 Joshua sịrị, “Ugbu a, wezuganụ chi ndị mba ọzọ niile dị nʼetiti unu. Werekwanụ obi unu nye maka irubere Onyenwe anyị Chineke Izrel isi.”
Now therefore put away the strange gods which are among you, and incline your heart unto the LORD, the God of Israel.'
24 Ndị ahụ sịrị Joshua, “Anyị ga-efe Onyenwe anyị Chineke anyị ofufe. Anyị ga-egekwa ntị nʼolu ya, mee ihe o nyere nʼiwu.”
And the people said unto Joshua: 'The LORD our God will we serve, and unto His voice will we hearken.'
25 Ya mere, Joshua na ndị Izrel gbara ndụ nʼụbọchị ahụ na Shekem. O nyere ha iwu na ụkpụrụ ha ga-edebe.
So Joshua made a covenant with the people that day, and set them a statute and an ordinance in Shechem.
26 Joshua dere iwu ndị a ụmụ Izrel kwere na ha ga-eme nʼAkwụkwọ Iwu Chineke. Emesịa, o bupụtara otu nkume buru ibu guzo ya nʼokpuru osisi ukwu ook dị nʼakụkụ ebe nsọ Onyenwe anyị.
And Joshua wrote these words in the book of the law of God; and he took a great stone, and set it up there under the oak that was by the sanctuary of the LORD.
27 Joshua sịrị ndị ahụ niile, “Lee, nkume a ga-abụ ihe ama megide anyị. Nʼihi na ọ nụla okwu niile nke Onyenwe anyị gwara anyị. Ọ ga-abụkwa ihe ama megide unu, ma ọ bụrụ na unu mee ihe mmekpu megide Chineke unu.”
And Joshua said unto all the people: 'Behold, this stone shall be a witness against us; for it hath heard all the words of the LORD which He spoke unto us; it shall be therefore a witness against you, lest ye deny your God.'
28 Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.
So Joshua sent the people away, every man unto his inheritance.
29 Ọ dịghị anya, mgbe ihe ndị a gasịrị, Joshua nwa Nun, odibo Onyenwe anyị nwụrụ, mgbe ọ gbara narị afọ na iri.
And it came to pass after these things, that Joshua the son of Nun, the servant of the LORD, died, being a hundred and ten years old.
30 E liri ya nʼoke ala nke ihe nketa ya, na Timnat Sera, nʼime ala ugwu ugwu Ifrem, nʼakụkụ ugwu dị nʼala Gaash.
And they buried him in the border of his inheritance in Timnath-serah, which is in the hill-country of Ephraim, on the north of the mountain of Gaash.
31 Ndị Izrel fere Onyenwe anyị ofufe ụbọchị niile nke ndụ Joshua, na nke ndụ ndị okenye ahụ, bụ ndị gara nʼihu bie ndụ mgbe ọ nwụsịrị, ndị maakwara ihe niile nke Onyenwe anyị rụụrụ ndị Izrel.
And Israel served the LORD all the days of Joshua, and all the days of the elders that outlived Joshua, and had known all the work of the LORD, that He had wrought for Israel.
32 Ọkpụkpụ Josef ndị Izrel chịtara mgbe ha si nʼala Ijipt pụta, ka ha liri na Shekem, nʼime ala ahụ Jekọb zụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha nʼaka ụmụ Hamọ nna Shekem. Ala a ghọrọ nʼihe nketa ụmụ Josef.
And the bones of Joseph, which the children of Israel brought up out of Egypt, buried they in Shechem, in the parcel of ground which Jacob bought of the sons of Hamor the father of Shechem for a hundred pieces of money; and they became the inheritance of the children of Joseph.
33 Elieza nwa Erọn, nwụkwara. E liri ya nʼala ugwu ugwu ndị Ifrem, na Gibea, obodo e nyere nwa ya bụ Finehaz.
And Eleazar the son of Aaron died; and they buried him in the Hill of Phinehas his son, which was given him in mount Ephraim.

< Joshua 24 >