< Joshua 23 >

1 Ma mgbe ọtụtụ oge gasịrị, site nʼoge Onyenwe anyị mere ka Izrel nwee ezumike nʼebe ndị iro gbara ha okirikiri nọ, Joshua aghọọla agadi, gbaa ọtụtụ afọ.
以後上主使以色列同四周敵人平安無事,這樣過弓很長的時間,若蘇厄已年老,上了年紀,
2 Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ.
便將全以色列人,他們的長老、首領、判官和官長召來,對他們說:「我已年老,上了年紀
3 Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile Onyenwe anyị Chineke unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu.
你們都親眼見了上主你們的天主,為了你們對有的民族所做的一切;因為是上你們的天主在替你們作戰。
4 Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ.
你們看,我己用抽籤方式,將由約旦河起,直到日落之處的大海之間,所消滅和所剩下的各民族的土地,按照你們各支派,都分了你們作產業。
5 Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu kwere unu nkwa.
上主你們的天主入將他們由你們面前趕走,使他們離開你們,叫你們承受他們的土地,一如上主你們的天主向你們所應許的。
6 “Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼAkwụkwọ Iwu Mosis. Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla.
因此,你們要更忠實謹守奉行梅瑟法律書上所記載的一切,不可偏左偏右,
7 Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha.
不可與你們中間的異族往來,不可提起你們的神名,不可指著他們起誓,不可事奉那些神袛,也不可在你們面前跪拜。
8 Kama raparanụ nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.
反之,你們應依照你們直到到今天所行的,依附上主你們的天主,
9 “Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu.
因為是上主從你們中間趕走了那些強大的異族,直到今天,沒有人能抵抗你們,
10 Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa.
你們一人能趕走千人,是因為上主你們的天主,照衪所應許的,親自為你們作戰。
11 Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya.
你們要盡心盡力,愛慕上主你們的天主。
12 “Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ,
如果你們背棄上主,依戀你們中間所剩餘的異族,同他們結婚,互相往來,
13 maranụ nke ọma, na Onyenwe anyị Chineke unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu.
你們就當知道,上主你們的天主必不從你們面前,趕走這個異族,你們必將成為你們的羅網和陷阱,打你們腰的鞭子,扎你們眼的芒刺,直到從上主你們的天主所賜給你們的這福地上,全被消滅。
14 “Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị.
看我今天就要走世人必走的路,你們要一心一意地承認,上主你們的天主應許所賜給你們的話,沒有一句落空。
15 Ma dịka ezi nkwa niile Onyenwe anyị Chineke unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka Onyenwe anyị ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu.
上主你們的天主對你們所應許的一切幸福,怎樣實行在你們身上,直到將你們從上主你們天主所賜與你們的這土地上消滅。
16 Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”
如果你們違犯上主你們的天主與你們訂立的盟約,去事奉敬其他的神,上主必向你們大發忿怒,使你們迅速從你們的福地上消滅。

< Joshua 23 >