< Joshua 21 >

1 Emesịa, ndị ndu ezinaụlọ Livayị bịakwutere Elieza, onye nchụaja, na Joshua, nwa Nun, na ndịisi ebo Izrel,
Now the family heads of the Levites approached Eleazar the priest, Joshua son of Nun, and the heads of the other tribes of Israel
2 na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.”
at Shiloh in the land of Canaan and said to them, “The LORD commanded through Moses that we be given cities in which to live, together with pasturelands for our livestock.”
3 Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
So by the command of the LORD, the Israelites gave the Levites these cities and their pasturelands out of their own inheritance:
4 Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.
The first lot came out for the Kohathite clans. The Levites who were descendants of Aaron the priest received thirteen cities by lot from the tribes of Judah, Simeon, and Benjamin.
5 Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase.
The remaining descendants of Kohath received ten cities by lot from the tribes of Ephraim, Dan, and the half-tribe of Manasseh.
6 Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ.
The descendants of Gershon received thirteen cities by lot from the tribes of Issachar, Asher, Naphtali, and the half-tribe of Manasseh in Bashan.
7 Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn.
And the descendants of Merari received twelve cities from the tribes of Reuben, Gad, and Zebulun.
8 Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.
So the Israelites allotted to the Levites these cities, together with their pasturelands, as the LORD had commanded through Moses.
9 Ha sitere nʼebo Juda na Simiọn, kepụta obodo ndị a akpọrọ aha
From the tribes of Judah and Simeon, they designated these cities by name
10 kenye ndị ikwu Kohat, ndị bụ ụmụ ụmụ Erọn, bụrụkwa ụmụ ụmụ Livayị. Ọ bụ ha ka e bụ ụzọ kenye ihe nketa site nʼife nza.
to the descendants of Aaron from the Kohathite clans of the Levites, because the first lot fell to them:
11 E kenyere ha obodo Kiriat Aaba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Obodo a dị nʼala ugwu ugwu Juda, ya na ala gbara ya gburugburu ka ọ bụrụ ebe ịta nri anụ ụlọ. (Aaba bụ nna nna ndị Anak.)
They gave them Kiriath-arba (that is, Hebron), with its surrounding pasturelands, in the hill country of Judah. (Arba was the father of Anak.)
12 Ma eburularị ụzọ nye Kaleb nwa Jefune obodo ukwu na obodo nta niile, na ala ubi niile dị nʼakụkụ ya ka ọ bụrụ ihe nketa ya.
But they had given the fields and villages around the city to Caleb son of Jephunneh as his possession.
13 Ya mere, ụmụ ụmụ Erọn, onye nchụaja, ka e kenyere obodo Hebrọn, nke bụkwa obodo mgbaba, kenyekwa ha obodo ndị a: Libna,
So to the descendants of Aaron the priest they gave these cities, together with their pasturelands: Hebron, a city of refuge for the manslayer, Libnah,
14 Jatịa, Eshtemoa,
Jattir, Eshtemoa,
15 Họlọn, Debịa,
Holon, Debir,
16 Ain, Juta na Bet-Shemesh. E nyekwara ha ala niile gbara obodo ndị a gburugburu ka ọ bụrụ ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Ya mere, ọ bụ obodo itoolu ka e si nʼala ebo Juda na Simiọn kenye ha.
Ain, Juttah, and Beth-shemesh—nine cities from these two tribes, together with their pasturelands.
17 Ebo Benjamin nyere ha obodo anọ ndị a, Gibiọn, Geba,
And from the tribe of Benjamin they gave them Gibeon, Geba,
18 Anatot, Almon na ala dị ya gburugburu ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri, bụ obodo anọ.
Anathoth, and Almon—four cities, together with their pasturelands.
19 Ya mere, obodo niile e nyere ndị nchụaja, ụmụ ụmụ Erọn dị iri na atọ, tinyere ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri.
In all, thirteen cities, together with their pasturelands, were given to the priests, the descendants of Aaron.
20 Ụmụ Kohat ndị fọdụrụ, ndị agbụrụ Livayị ka e kenyere obodo anọ ndị a site nʼaka ebo Ifrem.
The remaining Kohathite clans of the Levites were allotted these cities: From the tribe of Ephraim
21 E sitere nʼala ugwu ugwu Ifrem nye ha: Shekem, nke bụ obodo mgbaba na Gaza,
they were given Shechem in the hill country of Ephraim (a city of refuge for the manslayer), Gezer,
22 Kibzaim na Bet-Horon, tinyere ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
Kibzaim, and Beth-horon—four cities, together with their pasturelands.
23 Ha sitere nʼala ndị ebo Dan keta obodo anọ ndị a: Elteke na Gibeton,
From the tribe of Dan they were given Elteke, Gibbethon,
24 Aijalon na Gat Rimọn, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
Aijalon, and Gath-rimmon—four cities, together with their pasturelands.
25 Ọkara ebo Manase nyere ha obodo abụọ, Teanak, Gat Rimọn na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ha.
And from the half-tribe of Manasseh they were given Taanach and Gath-rimmon—two cities, together with their pasturelands.
26 Ya mere, obodo niile na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ e nyere ndị fọdụrụ nʼikwu Kohat dị iri.
In all, ten cities, together with their pasturelands, were given to the rest of the Kohathite clans.
27 Ụmụ Geshọn, ndị agbụrụ Livayị, ketara obodo abụọ ndị a, ya na ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Ọkara ebo Manase nyere: Golan, nʼime Bashan, nke bụ obodo mgbaba, na Be Eshtera.
This is what the Levite clans of the Gershonites were given: From the half-tribe of Manasseh they were given Golan in Bashan, a city of refuge for the manslayer, and Beeshterah—two cities, together with their pasturelands.
28 Ebo Isaka nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Kishiọn, Daberat,
From the tribe of Issachar they were given Kishion, Daberath,
29 Jamut na En-Ganim, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
Jarmuth, and En-gannim—four cities, together with their pasturelands.
30 Ebo Asha nyekwara ha obodo anọ. Ha bụ, Mishal, Abdon,
From the tribe of Asher they were given Mishal, Abdon,
31 Helkat na Rehob, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, obodo anọ.
Helkath, and Rehob—four cities, together with their pasturelands.
32 Ebo Naftalị nyere ha obodo atọ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. Obodo ndị a bụ, Kedesh, nʼime Galili, nke bụkwa obodo mgbaba, Hamot Doa na Katan.
And from the tribe of Naphtali they were given Kedesh in Galilee (a city of refuge for the manslayer), Hammoth-dor, and Kartan—three cities, together with their pasturelands.
33 Obodo iri na atọ, na ebe ịta ahịhịa nke anụ ụlọ ka e nyere ikwu Geshọn.
In all, thirteen cities, together with their pasturelands, were given to the Gershonite clans.
34 Ndị ikwu Merari, bụ ụmụ ụmụ Livayị fọdụrụ nwetara site nʼaka: Ebo Zebụlọn, Jokneam, Kata,
This is what the Merarite clan (the rest of the Levites) were given: From the tribe of Zebulun they were given Jokneam, Kartah,
35 Dimna na Nahalal, obodo anọ tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
Dimnah, and Nahalal—four cities, together with their pasturelands.
36 Ebo Ruben nyere ha obodo anọ: Beza, Jahaz,
From the tribe of Reuben they were given Bezer, Jahaz,
37 Kedemot, Mefaat na ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ kpaa nri.
Kedemoth, and Mephaath—four cities, together with their pasturelands.
38 Ebo Gad nyere ha obodo anọ. Obodo ndị a bụ, Ramọt, nʼime Gilead nke bụ obodo mgbaba, Mahanaim,
And from the tribe of Gad they were given Ramoth in Gilead, a city of refuge for the manslayer, Mahanaim,
39 Heshbọn na Jeza, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, bụ obodo anọ.
Heshbon, and Jazer—four cities in all, together with their pasturelands.
40 Ọnụọgụgụ obodo niile e kenyere agbụrụ Merari bụ obodo iri na abụọ, ha bụ ndị fọdụrụ na ndị Livayị.
In all, twelve cities were allotted to the clans of Merari, the remaining Levite clans.
41 Ọnụọgụgụ obodo niile na ebe ịta nri nke anụ ụlọ e sitere nʼala ụmụ Izrel nye ndị Livayị dị iri anọ na asatọ.
For the Levites, then, there were forty-eight cities in all, together with their pasturelands, within the territory of the Israelites.
42 Obodo ọbụla nwere ala gbara ya gburugburu ebe anụ ụlọ ga-anọ kpaa nri.
Each of these cities had its own surrounding pasturelands; this was true for all the cities.
43 Ya mere, Onyenwe anyị nyere ụmụ Izrel ala ahụ ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha. Ha nwetara ya, biri nʼime ya.
Thus the LORD gave Israel all the land He had sworn to give their fathers, and they took possession of it and settled in it.
44 Onyenwe anyị nyere ha izuike nʼakụkụ niile, dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye ndị nna nna ha. Ọ dịkwaghị otu nʼime ndị iro ha ọbụla guzogidere ha, nʼihi na Onyenwe anyị nyefere ndị iro ha niile nʼaka ha.
And the LORD gave them rest on every side, just as He had sworn to their fathers. None of their enemies could stand against them, for the LORD delivered all their enemies into their hand.
45 O nweghị otu nʼime nkwa ọma niile Onyenwe anyị kwere Izrel nke na-emezughị. O mezuru nkwa niile o kwere ha.
Not one of all the LORD’s good promises to the house of Israel had failed; everything was fulfilled.

< Joshua 21 >