< Joshua 20 >

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị ya,
Nígbà náà ni Olúwa sọ fún Joṣua pé,
2 “Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha họpụtara onwe unu obodo mgbaba dịka m gwara unu site nʼaka Mosis.
“Sọ fún àwọn ọmọ Israẹli pé kí wọn yan àwọn ìlú ààbò, gẹ́gẹ́ bí mo ti pàṣẹ fún ọ láti ẹnu Mose,
3 Ka obodo ndị a bụrụ ebe onye gburu mmadụ nʼọghọm na-amaghị ama ga-agbaga nʼihi izere ndụ ya site nʼaka onye ahụ ga-achọ ịbọrọ ọbọ ọchụ.
kí ẹni tí ó bá ṣèèṣì pa ènìyàn tàbí tí ó bá pa ènìyàn láìmọ̀-ọ́n-mọ̀ lè sálọ sí ibẹ̀, fún ààbò lọ́wọ́ olùgbẹ̀san ẹ̀jẹ̀ ẹni tí ó pa.
4 Mgbe onye gburu mmadụ ahụ na-amaghị ama gbabara nʼime otu obodo ndị a, ọ ga-eguzo nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ gwa ndị okenye obodo ahụ ihe niile mere. Ndị okenye ahụ ga-akpọbata ya nʼime obodo ahụ, nye ya ebe ọ ga-ebi nʼetiti ha.
Nígbà tí ó bá sálọ sí ọ̀kan nínú àwọn ìlú wọ̀nyí, yóò sì dúró ní ẹnu-ọ̀nà àtiwọ ibodè ìlú, kí ó sì ṣe àlàyé ara rẹ̀ ní iwájú àwọn àgbàgbà ìlú náà. Nígbà náà ni wọn yóò gbà á sí ìlú wọn, wọn yóò sì fun ní ibùgbé láàrín wọn.
5 Ọ bụrụkwa na onye ikwu onye ahụ nwụrụ anwụ abịa ịbọrọ ọbọ ọchụ ahụ, ndị okenye obodo ahụ agaghị ekwe ka e gbuo onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama, nʼihi na onye ahụ akpachaghị anya mee ihe o mere.
Bí olùgbẹ̀san ẹ̀jẹ̀ bá ń lépa rẹ̀, wọn kò gbọdọ̀ fi àwọn ọ̀daràn náà lé wọn lọ́wọ́, nítorí tí ó pa aládùúgbò rẹ̀ láìmọ̀, tí kò sì kórìíra rẹ̀ tẹ́lẹ̀ rí.
6 Onye ahụ gburu mmadụ na-amaghị ama ga-anọgide nʼobodo ahụ ruo mgbe ọ ga-akwụrụ nʼihu nzukọ maka ikpe ruokwa mgbe onyeisi nchụaja nọ nʼoge ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, o nwere ike laghachi nʼụlọ nke aka ya na nʼobodo ya bụ ebe o si gbapụ ọsọ.”
Òun ó sì máa gbé inú ìlú náà, títí yóò fi jẹ́jọ́ níwájú ìjọ ènìyàn àti títí ikú olórí àlùfáà tí ó ń ṣiṣẹ́ ìsìn nígbà náà. Nígbà náà ó lè padà sí ilé rẹ̀ ní ìlú tí ó ti sá wá.”
7 Obodo ndị ha kewapụtara iche dịka obodo mgbaba bụ, Kedesh, nke dị nʼime Galili, nʼala ugwu ugwu ndị Naftalị; na Shekem, nke dị nʼala ugwu ugwu Ifrem na Kiriat Aba, nke a na-akpọkwa Hebrọn. Ọ dị nʼala ugwu ugwu Juda.
Bẹ́ẹ̀ ni wọ́n yan Kedeṣi ní Galili ní ìlú òkè Naftali, Ṣekemu ní ìlú òkè Efraimu, àti Kiriati-Arba (tí í ṣe, Hebroni) ní ìlú òkè Juda.
8 Ha kewapụtara obodo atọ ọzọ nʼihi otu ihe ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan nʼofe Jeriko. Obodo atọ ndị a bụ, Beza, nke dị nʼọzara, nʼala larịị ahụ e nyere ebo Ruben, na Ramọt; nke dị nʼime Gilead bụ ala ebo Gad; na Golan, nʼime Bashan, nke e si nʼala ebo Manase wepụta.
Ní ìhà ìlà-oòrùn Jordani ti Jeriko, wọ́n ya Beseri ní aginjù ní pẹ̀tẹ́lẹ̀ ní ẹ̀yà Reubeni, Ramoti ní Gileadi ní ẹ̀yà Gadi, àti Golani ní Baṣani ní ẹ̀yà Manase.
9 Obodo mgbaba ndị a a họpụtara bụ maka ndị ọbịa bi nʼetiti ụmụ Izrel, na maka ụmụ Izrel. Ọ bụ ebe onye ọbụla gburu mmadụ na-amaghị ama ga-agbaga. Onye na-abọrọ ọbọ ọchụ agaghị egbukwa onye ahụ tupu e kpee ya ikpe nʼọgbakọ ndị Izrel.
Ẹnikẹ́ni nínú àwọn ọmọ Israẹli tàbí àlejò tí ń gbé ní àárín wọn tí ó ṣèèṣì pa ẹnìkan lè sálọ sí àwọn ìlú tí a yà sọ́tọ̀ wọ̀nyí, kí olùgbẹ̀san ẹ̀jẹ̀ má sì ṣe pa á kí ó to di àkókò tí yóò jẹ́jọ́ níwájú ìjọ ènìyàn.

< Joshua 20 >