< Joshua 2 >

1 Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.
Sai Yoshuwa ɗan Nun ya aika’yan leƙen asiri guda biyu a ɓoye daga Shittim ya ce, “Ku je ku duba, ku ga yadda wurin yake, musamman Yeriko.” Sai suka je suka shiga gidan wata karuwa mai suna Rahab, suka sauka a can.
2 Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.”
Aka gaya wa sarkin Yeriko cewa, “Ji fa, waɗansu Isra’ilawa sun shigo nan da dare don su leƙi asirin ƙasar.”
3 Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”
Saboda haka sai sarki ya aika wannan saƙo zuwa ga Rahab, “Ki fito da mutanen da suka zo suka sauka a gidanki, gama sun zo su leƙi asirin ƙasar ne gaba ɗaya.”
4 Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.
Amma matar ta ɓoye mutanen nan biyu. Ta ce, “I, mutanen sun zo wurina, amma ban san daga ina suka zo ba,
5 Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”
da yamma kuwa, kafin a rufe ƙofar gari sai mutanen suka tafi. Ban san hanyar da suka bi ba, ku yi sauri ku bi su. Mai yiwuwa ku same su.”
6 (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
(Amma ta kai su saman rufin ɗaki ta ɓoye su a ƙarƙashin karan rama da ta baza a rufin ɗaki.)
7 Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.
Sai mutanen garin suka kama hanyar Urdun don su nemi’yan leƙen asirin, daga fitar su sai aka rufe ƙofar garin.
8 Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha,
Kafin’yan leƙen asirin su kwanta, sai ta tafi wurinsu a bisa rufin ɗakin
9 gwa ha sị, “Ama m na Onyenwe anyị enyela unu ala a, marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu,
ta ce musu, “Na sani Ubangiji ya riga ya ba ku ƙasan nan, tsoronku kuma ya kama mu har zukatan mazaunan ƙasar duka sun narke saboda ku.
10 nʼihi na anyị anụla otu Onyenwe anyị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ.
Mun ji yadda Ubangiji ya busar da ruwan Jan Teku domin ku lokacin da kuka fito daga ƙasar Masar, da kuma abin da kuka yi wa Sihon da Og, sarakunan nan biyu na Amoriyawa gabas da Urdun, waɗanda kuka hallaka su sarai.
11 Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa.
Da muka ji labarin, duk sai zuciyar kowa ta narke, kowa ya karaya saboda ku, gama Ubangiji Allahnku shi ne Allah na sama da ƙasa.
12 “Ugbu a, ebe ọ bụ na m emeelara unu ebere, jirinụ Onyenwe anyị ṅụọrọ m iyi na unu ga-emere ezinaụlọ m ebere. Gosinụ m ihe ịrịbama nʼeziokwu,
Yanzu ina roƙonku ku rantse mini da Ubangiji cewa za ku yi wa iyalina alheri kamar yadda na yi muku alheri. Ku ba ni ƙwaƙƙwarar shaida cewa
13 na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.”
za ku ceci rayukan mahaifina da mahaifiyata, da’yan’uwana maza da mata, da duk waɗanda suke nasu, za ku cece mu daga mutuwa.”
14 Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe Onyenwe anyị ga-enye anyị ala a.”
Mutanen suka tabbatar mata suka ce, “Ranmu a bakin ranki! In ba ki faɗa wa kowa abin da ya kawo mu ba, za mu yi miki alheri da aminci lokacin da Ubangiji ya ba mu ƙasar.”
15 Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.
Sai ta zura igiya ta taga suka bi, domin gidan da take yana haɗe da katangar birnin.
16 Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.”
Ta ce musu, “Ku tafi cikin tuddan ƙasar don kada mutanen sarki su same ku. Ku ɓuya a can na kwana uku, har sai masu nemanku su komo, sa’an nan ku kama hanyarku.”
17 Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị,
Mutanen suka ce mata, “Rantsuwar da kika sa muka yi, ba za tă yi amfani ba
18 ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile.
sai in kin ɗaura jan ƙyalle a tagar da kika zura mu, kuma sai in kin kawo mahaifinki da mahaifiyarki, da’yan’uwanki, da dukan iyalinki cikin gidanki.
19 Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ.
In wani ya fita kan hanya, alhakin jininsa yă kasance a kansa; ba ruwanmu. Amma in aka taɓa wani da yake cikin gidanki tare da ke, alhakin jininsa yana kanmu.
20 Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.”
In kika tone mana asiri, za mu karya alkawarin da kika sa muka yi.”
21 Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.
Ta ce, “Na yarda! Bari yă zama yadda kuka ce.” Sai ta sallame su suka tafi. Ta kuwa ɗaura jan ƙyalle a tagar.
22 Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha.
Sai suka tafi, suka shiga cikin tuddai, suka yi zamansu a can kwana uku har masu nemansu suka koma, gama masu nemansu suka yi ta nema ko’ina a hanyar, amma ba su sami kowa ba.
23 Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.
Sa’an nan mutanen nan biyu,’yan leƙen asiri suka sauka daga tuddai suka haye kogi zuwa wurin Yoshuwa ɗan Nun, suka gaya masa duk abin da ya faru da su.
24 Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”
Suka ce wa Yoshuwa, “Ba shakka Ubangiji ya ba mu ƙasan nan duka, tana hannunmu, mutane can duk sun narke da tsoro saboda mu.”

< Joshua 2 >