< Joshua 2 >

1 Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.
And Joshua son of Nun sendeth from Shittim, two men, spies, silently, saying, 'Go, see the land — and Jericho;' and they go and come into the house of a woman, a harlot, and her name [is] Rahab, and they lie down there.
2 Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.”
And it is told to the king of Jericho, saying, 'Lo, men have come in hither to-night, from the sons of Israel, to search the land.
3 Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”
And the king of Jericho sendeth unto Rahab, saying, 'Bring out the men who are coming in unto thee, who have come into thy house, for to search the whole of the land they have come in.
4 Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa.
And the woman taketh the two men, and hideth them, and saith thus: 'The men came in unto me, and I have not known whence they [are];
5 Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.”
and it cometh to pass — the gate is to [be] shut — in the dark, and the men have gone out; I have not known whither the men have gone; pursue ye, hasten after them, for ye overtake them;'
6 (Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.)
and she hath caused them to go up on the roof, and hideth them with the flax wood, which is arranged for her on the roof.
7 Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.
And the men have pursued after them the way of the Jordan, by the fords, and the gate they have shut afterwards, when the pursuers have gone out after them.
8 Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha,
And — before they lie down — she hath gone up unto them on the roof,
9 gwa ha sị, “Ama m na Onyenwe anyị enyela unu ala a, marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu,
and she saith unto the men, 'I have known that Jehovah hath given to you the land, and that your terror hath fallen upon us, and that all the inhabitants of the land have melted at your presence.
10 nʼihi na anyị anụla otu Onyenwe anyị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ.
'For we have heard how Jehovah dried up the waters of the Red Sea at your presence, in your going out of Egypt, and that which ye have done to the two kings of the Amorite who [are] beyond the Jordan; to Sihon and to Og whom ye devoted.
11 Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa.
And we hear, and melt doth our heart, and there hath not stood any more spirit in [any] man, from your presence, for Jehovah your God, He [is] God in the heavens above, and on the earth beneath.
12 “Ugbu a, ebe ọ bụ na m emeelara unu ebere, jirinụ Onyenwe anyị ṅụọrọ m iyi na unu ga-emere ezinaụlọ m ebere. Gosinụ m ihe ịrịbama nʼeziokwu,
'And now, swear ye, I pray you, to me by Jehovah — because I have done with you kindness — that ye have done, even ye, kindness with the house of my father, and have given to me a true token,
13 na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.”
and have kept alive my father, and my mother, and my brothers, and my sisters, and all that they have, and have delivered our souls from death.'
14 Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe Onyenwe anyị ga-enye anyị ala a.”
And the men say to her, 'Our soul for yours — to die; if ye declare not this our matter, then it hath been, in Jehovah's giving to us this land, that we have done with thee kindness and truth.'
15 Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ.
And she causeth them to go down by a rope through the window, for her house [is] in the side of the wall, and in the wall she [is] dwelling;
16 Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.”
and she saith to them, 'To the mountain go, lest the pursuers come upon you; and ye have been hidden there three days till the turning back of the pursuers, and afterwards ye go on your way.'
17 Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị,
And the men say unto her, 'We are acquitted of this thine oath which thou hast caused us to swear:
18 ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile.
lo, we are coming into the land, this line of scarlet thread thou dost bind to the window by which thou hast caused us to go down, and thy father, and thy mother, and thy brethren, and all the house of thy father thou dost gather unto thee, to the house;
19 Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ.
and it hath been, any one who goeth out from the doors of thy house without, his blood [is] on his head, and we are innocent; and any one who is with thee in the house, his blood [is] on our head, if a hand is on him;
20 Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.”
and if thou declare this our matter, then we have been acquitted from thine oath which thou hast caused us to swear.'
21 Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.” O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.
And she saith, 'According unto your words, so it [is];' and she sendeth them away, and they go; and she bindeth the scarlet line to the window.
22 Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha.
And they go, and come in to the mountain, and abide there three days until the pursuers have turned back; and the pursuers seek in all the way, and have not found.
23 Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha.
And the two men turn back, and come down from the hill, and pass over, and come in unto Joshua son of Nun, and recount to him all that hath come upon them;
24 Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”
and they say unto Joshua, 'Surely Jehovah hath given into our hand all the land; and also, all the inhabitants of the land have melted at our presence.'

< Joshua 2 >