< Joshua 19 >

1 Ndị nke abụọ sitere nʼife nza nweta oke ha bụ ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha ketara dị nʼime ala e kenyere ndị Juda.
Kèké kejì jáde fún ẹ̀yà Simeoni, ní agbo ilé, ní agbo ilé. Ìní wọn sì wà ní àárín ilẹ̀ Juda.
2 Ihe nketa ụmụ Simiọn bụ ndị a: Bịasheba (maọbụ Sheba), Molada,
Lára ìpín wọn ní: Beerṣeba (tàbí Ṣeba), Molada,
3 Haza Shual, Bala, Ezem,
Hasari-Ṣuali, Bala, Esemu,
4 Eltolad, Betul, Homa,
Eltoladi, Betuli, Horma,
5 Ziklag, Bet-Makabot, Haza Susa,
Siklagi, Beti-Markaboti, Hasari Susa,
6 Bet-Lebaot na Sharuhen, obodo iri na atọ na obodo nta ndị ọzọ gbara ha gburugburu.
Beti-Lebaoti àti Ṣarueli, ìlú wọn jẹ́ mẹ́tàlá àti ìletò wọn.
7 Na Ain, Rimọn, Eta na Ashan, obodo anọ na obodo nta ha,
Aini, Rimoni, Eteri àti Aṣani, ìlú wọn jẹ́ mẹ́rin àti ìletò wọn,
8 tinyekwara obodo nta ndị ọzọ niile gbara obodo ukwu ndị a gburugburu, ruo obodo Baalat-Bịa, ya bụ (obodo Rema dị na Negev). Nke a bụ ihe nketa ebo Simiọn dịka ikwu ha si dị.
àti gbogbo àwọn agbègbè ìlú wọ̀nyí títí dé Baalati-Beeri (Rama ní gúúsù). Èyí ni ilẹ̀ ìní ẹ̀yà àwọn ọmọ Simeoni, agbo ilé, ní agbo ilé.
9 E sitere nʼoke ụmụ Juda wepụta oke ụmụ Simiọn, nʼihi na ihe ụmụ Juda ketara dị ukwuu karịa ihe ha kwesiri iketa. Ọ bụ nke a mere ụmụ Simiọn ji nweta ihe nketa site nʼetiti ala ndị Juda.
A mú ogún ìní àwọn ọmọ Simeoni láti ìpín Juda, nítorí ìpín Juda pọ̀ ju èyí tí wọ́n nílò lọ. Báyìí ni àwọn ọmọ Simeoni gba ìní wọn ní àárín ilẹ̀ Juda.
10 Ebo nke atọ nwetara ihe nketa ha site nʼife nza bụ ebo Zebụlọn dịka ikwu ha si dị. Ala ha nwetara gbatịrị ruo Sarid.
Kèké kẹta jáde fún Sebuluni, ní agbo ilé ní agbo ilé ààlà ìní wọn sì lọ títí dé Saridi.
11 Site nʼebe ahụ, oke ala ahụ gbatịrị gaa nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ruo Marala na Dabeshet, rukwaa iyi dị nʼihu Jokneam.
Ó sì lọ sí ìwọ̀-oòrùn ní Marala, ó sì dé Dabbeṣeti, ó sì lọ títí dé odo ní ẹ̀bá Jokneamu.
12 O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia.
Ó sì yípadà sí ìlà-oòrùn láti Saridi sí ìhà ìlà-oòrùn dé ilẹ̀ Kisiloti-Tabori, ó sì lọ sí Daberati, ó sì gòkè lọ sí Jafia.
13 Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea.
Nígbà náà ní o lọ sí ìhà ìlà-oòrùn lọ sí Gati-Heferi àti Eti-Kaṣini, ó sì jáde ní Rimoni, ó sì yí sí ìhà Nea.
14 Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.
Ní ibẹ̀, ààlà sì yíká ní ìhà àríwá lọ sí Hnatoni ó sì pín ní àfonífojì Ifita-Eli.
15 Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem. Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
Lára wọn ni Katati, Nahalali, Ṣimroni, Idala àti Bẹtilẹhẹmu. Wọ́n sì jẹ́ ìlú méjìlá àti ìletò wọn.
16 Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.
Ìlú wọ̀nyí àti ìletò wọn jẹ́ ìní Sebuluni, ní agbo ilé agbo ilé.
17 Ebo nke anọ sitere nʼife nza nweta ihe nketa ha bụ ụmụ Isaka dịka ikwu ha si dị.
Kèké kẹrin jáde fún Isakari, agbo ilé ní agbo ilé.
18 Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Jezril, Kesulọt, Shunem,
Lára ilẹ̀ wọn ni èyí: Jesreeli, Kesuloti, Ṣunemu,
19 Hafaraim, na Shịọn, Anaharat,
Hafraimu, Ṣihoni, Anaharati,
20 Rabit, Kishiọn, Ebez na
Rabiti, Kiṣioni, Ebesi,
21 Remet, En-Ganim, En-Hada na Bet-Pazez.
Remeti, Eni-Gannimu, Eni-Hada àti Beti-Pasesi.
22 Oke ala ha ruru na Taboa, Shahazuma na Bet-Shemesh, ma kwụsị nʼosimiri Jọdan. Obodo ndị a niile dị iri na isii, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
Ààlà náà sì dé Tabori, Ṣahasuma, àti Beti-Ṣemeṣi, ó sì pin ní Jordani. Wọ́n sì jẹ́ ìlú mẹ́rìndínlógún àti ìletò wọn.
23 Ya mere, obodo ukwu ndị a na obodo nta ha dị nʼala ahụ ebo Isaka nwetara dịka ihe nketa ha, dị ka ikwu ha si dị.
Ìlú wọ̀nyí àti ìletò wọn jẹ́ ìní ẹ̀yà Isakari, ní agbo ilé agbo ilé.
24 Ebo nke ise e kenyere ala site nʼife nza bụ ụmụ Asha dịka ikwu ha si dị.
Kèké karùn-ún jáde fún ẹ̀yà Aṣeri, ní agbo ilé agbo ilé.
25 Ala na obodo ha ketara bụ ndị a: Helkat, Hali, Beten, Akshaf,
Lára ilẹ̀ wọn ni èyí: Helikati, Hali, Beteni, Akṣafu,
26 Alamelek, Amad na Mishal. Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ gbatịrị ruo Kamel na Shihoa-Libnat.
Allameleki, Amadi, àti Miṣali. Ní ìhà ìwọ̀-oòrùn ààlà náà dé Karmeli àti Ṣihori-Libinati.
27 O sitere nʼebe ahụ tụgharịa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ gawa Bet-Dagọn, ma ruokwa Zebụlọn na Ndagwurugwu Ifta El, ma gbagoro ruokwa Bet-Emek na Neiel. O sikwa nʼebe ahụ gafee, ruo Kabul, nʼakụkụ aka ekpe.
Nígbà náà ni o yí sí ìhà ìlà-oòrùn Beti-Dagoni, dé Sebuluni àti àfonífojì Ifita-Eli, ó sì lọ sí àríwá sí Beti-Emeki àti Neieli, ó sì kọjá lọ sí Kabulu ní apá òsì.
28 Ọ gara ruo Ebrọn, Rehob, Hamọn na Kana, ruokwa ebe obodo Saịdọn gbasapụrụ.
Ó sì lọ sí Abdoni, Rehobu, Hammoni àti Kana títí dé Sidoni ńlá.
29 Oke ala ahụ mere dịka ọ na-alaghachi azụ bịaruo Rema, ruokwa obodo e wusiri ike bụ Taịa, tụgharịakwa gawa Hosa pụta nʼọnụ mmiri osimiri Mediterenịa nke dị nʼakụkụ Akzib
Ààlà náà sì tẹ̀ sí ìhà Rama, ó sì lọ sí ìlú olódi Tire, ó sì yà sí Hosa, ó sì jáde ní Òkun Ńlá ní ilẹ̀ Aksibu,
30 na Umma, Afek na Rehob. Ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri abụọ na abụọ tinyere obodo nta ha niile.
Uma, Afeki àti Rehobu. Wọ́n sì jẹ́ ìlú méjìlélógún àti ìletò wọn.
31 Obodo ndị a na obodo nta ha niile dị nʼala ahụ ebo Asha nwetara dịka ihe nketa, dịka ikwu ha si dị.
Àwọn ìlú wọ̀nyí àti ìletò wọn ní ìní ẹ̀yà Aṣeri, ní agbo ilé agbo ilé.
32 Ebo nke isii e nyere ihe nketa site nʼife nza bụ ebo Naftalị, dịka ikwu ha si dị.
Ìpín kẹfà jáde fún Naftali, agbo ilé ní agbo ilé,
33 Oke ala ha malitere na Helef ruo nʼosisi ukwu dị na Zaananim, Adami Nekeb na Jabneel, gafee ruo Lakum, kwụsị nʼosimiri Jọdan.
ààlà wọn lọ láti Helefi àti igi ńlá ní Saananimu nímù; kọjá lọ sí Adami Nekebu àti Jabneeli dé Lakkumu, ó sì pín ní Jordani.
34 Site nʼebe ahụ oke ala ha gara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo Aznot Tabo, site nʼebe ahụ ruo Hukọk, rute Zebụlọn na ndịda, na Asha nʼọdịda anyanwụ, ruokwa Juda nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.
Ààlà náà gba ìhà ìwọ̀-oòrùn lọ sí Asnoti-Tabori ó sì jáde ní Hukoki. Ó sì dé Sebuluni, ní ìhà gúúsù Aṣeri ní ìhà ìwọ̀-oòrùn àti Juda ní Jordani ní ìhà ìlà-oòrùn.
35 Obodo niile e wusiri ike e kenyere ha bụ ndị a: Zidim, Zea, Hamat, Rakat, Kineret,
Àwọn ìlú olódi sì Siddimu, Seri, Hamati, Rakàti, Kinnereti,
36 Adama, Rema, Hazọ,
Adama, Rama Hasori,
37 Kedesh, Edrei, En-Hazoa,
Kedeṣi, Edrei, Eni-Aṣọri,
38 Iron, Migdal El, Horem, Bet-Anat na Bet-Shemesh. Ya mere, ọnụọgụgụ obodo ndị a niile bụ iri na itoolu, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu.
Ironi, Migdali-Eli, Horemu, Beti-Anati àti Beti-Ṣemeṣi. Wọ́n sì jẹ́ ìlú mọ́kàndínlógún àti ìletò wọn.
39 Obodo ndị a na obodo nta ha niile ka ebo Naftalị dịka ikwu ha si dị, nwetara dịka ihe nketa ha.
Àwọn ìlú wọ̀nyí àti ìletò wọn ní ìní ẹ̀yà Naftali, ní agbo ilé sí agbo ilé.
40 Site nʼife nza ebo Dan, bụ ebo nke asaa nwetara ihe nketa dịka ikwu ha si dị.
Ìbò kéje jáde fún ẹ̀yà Dani, ní agbo ilé ní agbo ilé.
41 Oke ala ihe nketa ha bụ ndị a: Zora, Eshtaol, Ia-Shemesh,
Ilẹ̀ ìní wọn nìwọ̀nyí: Sora, Eṣtaoli, Iri-Ṣemesi,
42 Shaalabin, Aijalon, Itla,
Ṣaalabini, Aijaloni, Itila,
43 Elọn, Timna, Ekrọn,
Eloni, Timna, Ekroni,
44 Elteke, Gibeton, Baalat,
Elteke, Gibetoni, Baalati,
45 Jehud, Bene-Berak, Gat Rimọn,
Jehudu, Bene-Beraki, Gati-Rimoni,
46 Me-Jakọn na Rakọn, obodo dị nʼoke ala, na ncherita ihu Jopa.
Me Jakoni àti Rakkoni, pẹ̀lú ilẹ̀ tí ó kọjú sí Joppa.
47 Mgbe oke ala ụmụ Dan ketara sitere nʼaka ha pụọ. Ha gara buso obodo Leshem agha merie ha, were mma agha tigbuo ndị niile bi nʼime ya, bichie ya. Ha kpọrọ obodo ahụ Dan, nke bụ aha nna nna ha ochie.
(Ṣùgbọ́n àwọn ará Dani ní ìṣòro láti gba ilẹ̀ ìní wọn, bẹ́ẹ̀ ni wọ́n gòkè lọ, wọ́n sì kọlu Leṣemu, wọ́n sì gbà á, wọ́n sì fi idà kọlù ú, wọ́n sì ń gbé ibẹ̀. Wọ́n sì ń gbé ní Leṣemu, wọ́n sì pe orúkọ rẹ̀ ní Dani orúkọ baba ńlá wọn).
48 Obodo ndị a na obodo nta ha bụ ihe nketa ebo Dan nwetara dịka ikwu ha si dị.
Àwọn ìlú wọ́n yí àti ìletò wọn ní ìní ẹ̀yà Dani, ní agbo ilé agbo ilé.
49 Mgbe e kechara ala ahụ niile, nye ebo ọbụla ala dịka ọnụọgụgụ ha niile si dị, ụmụ Izrel nyere Joshua, nwa Nun ihe nketa ha nʼetiti ha.
Nígbà tí wọ́n ti parí pínpín ilẹ̀ náà ní ìpín ti olúkúlùkù, àwọn ará Israẹli fún Joṣua ọmọ Nuni ní ìní ní àárín wọn,
50 Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na Joshua nwere ike iwere ala ọbụla ọ chọrọ. Ya mere, ha nyere Joshua obodo Timnat Sera nke dị nʼugwu Ifrem. Joshua wugharịrị obodo ahụ biri nʼime ya.
bí Olúwa ti pàṣẹ, wọ́n fún un ni ìlú tí ó béèrè fún, Timnati Serah ní ìlú òkè Efraimu. Ó sì kọ́ ìlú náà, ó sì ń gbé ibẹ̀.
51 Ndị a bụ oke ala nke Elieza onye nchụaja, Joshua nwa Nun na ndịisi ụlọ ebo ụmụ Izrel, kere na Shaịlo site nʼife nza nʼihu Onyenwe anyị, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ha si otu a kebie ala ahụ.
Wọ̀nyí ni àwọn ilẹ̀ tí Eleasari àlùfáà, Joṣua ọmọ Nuni àti àwọn olórí ẹ̀yà agbo ilé Israẹli fi ìbò pín ní Ṣilo ní iwájú Olúwa ní ẹnu-ọ̀nà àgọ́ ìpàdé. Báyìí ni wọ́n parí pínpín ilẹ̀ náà.

< Joshua 19 >